You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
FW de Klerk: Aka chịburu South Africa, anwụọla dịka ọ gbachara afọ 85
Mgbe e biputara ya
FW de Klerk, FW de Klerk, aka chịburu Saụt Afrịka na onyeọcha ikpeazụ chịrị mba ahụ anwụọla n'ụtụtụ Tọzde dịka ọ gbachara afọ 85.
De Klerk, onye so na ndị nyefere mba ahụ n'ọchịchị onyekwuoucheya na-arịabụ ọrịa kansa.
Ozi si FW de Klerk Foundation ụbọchị Tọzde kwuru: "FW de Klerk bụbu Onyeisiala nwụrụ n'udo n'ụlọ ya dị na Fresnaye (Cape Town) n'ụzọ ụtụtụ a ka ya na kansa 'mesothelioma' gbachara mgba."
"Ọ hapụrụ nwnye ya bụ Elita, ụmụ ya bụ Jan na Susan na ụmụụmụ."
Ụlọọrụ ọrụ ebere o hibere maburu ọkwa na a chọpụtara na de Klerk na-arịa kansa metụtara akpaume n'ọnwa Juun afọ 2021.
Ihe ndị kwesịrị ịma maka de Klerk
- A mụrụ de Klerk n'ọnwa Maachị afọ 1936 na Johannesburg.
- Ọ chịrị Saụt Afrịka malite na Septemba afọ 1989 rue mee afọ 1994.
- N'afọ 1990, ọ mara ọkwa na ya ga-atọhapụ Nelson Mandela, nke mepere ụzọ maka ntuliaka nke ọtụtụ pati sonyere n'afọ 1994
- de Klerk na Mandela nwetara nzere 'Nobel Peace Prize' maka ọchịchị isi n'aka ndị ọcha banye n'ọchịchị onyekwuouche ya mana ụfọdụ na-agbagha ọrụ ọrụ na mgbanwe ahụ.