FW de Klerk: Aka chịburu South Africa, anwụọla dịka ọ gbachara afọ 85

FW de Klerk

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, De Klerk bụ onyeisiala South Africa malite n'ọnwa Septemba 1989 na Mee 1994
Mgbe e biputara ya

FW de Klerk, FW de Klerk, aka chịburu Saụt Afrịka na onyeọcha ikpeazụ chịrị mba ahụ anwụọla n'ụtụtụ Tọzde dịka ọ gbachara afọ 85.

De Klerk, onye so na ndị nyefere mba ahụ n'ọchịchị onyekwuoucheya na-arịabụ ọrịa kansa.

Ozi si FW de Klerk Foundation ụbọchị Tọzde kwuru: "FW de Klerk bụbu Onyeisiala nwụrụ n'udo n'ụlọ ya dị na Fresnaye (Cape Town) n'ụzọ ụtụtụ a ka ya na kansa 'mesothelioma' gbachara mgba."

"Ọ hapụrụ nwnye ya bụ Elita, ụmụ ya bụ Jan na Susan na ụmụụmụ."

Ụlọọrụ ọrụ ebere o hibere maburu ọkwa na a chọpụtara na de Klerk na-arịa kansa metụtara akpaume n'ọnwa Juun afọ 2021.

Ihe ndị kwesịrị ịma maka de Klerk

FW de Klerk

Ebe foto si, Getty Images

  • A mụrụ de Klerk n'ọnwa Maachị afọ 1936 na Johannesburg.
  • Ọ chịrị Saụt Afrịka malite na Septemba afọ 1989 rue mee afọ 1994.
  • N'afọ 1990, ọ mara ọkwa na ya ga-atọhapụ Nelson Mandela, nke mepere ụzọ maka ntuliaka nke ọtụtụ pati sonyere n'afọ 1994
  • de Klerk na Mandela nwetara nzere 'Nobel Peace Prize' maka ọchịchị isi n'aka ndị ọcha banye n'ọchịchị onyekwuouche ya mana ụfọdụ na-agbagha ọrụ ọrụ na mgbanwe ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: