You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra Governorship Election countdown: Ndị mmadụ sị Anambra apụ n'ihi egwu ọgbaaghara ntuliaka
Ọka bụ isi obodo Anambara steeti na-ekwo n'abalị abụọ nke ọnwa Novemba ihintuliaka onye ga-abụ Gọvanọ adịla nso.
Ndị Anambara ga-ebinye aka n'akwụkwọ onye ga-achị ha n'ụbọchị Satọde abalị isii nke ọnwa Novemba afọ 2021.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ọdụ ụgbọala njem dị iche iche n'Ọka were hụ na ọtụtụ mmadụ sị Anambara na-apụ apụ n'ihi egwu ọgbaghara nwere ike ịdapụta ụbọchị ntuliaka ahụ.
Na Uni Zik Junction , otu nwoke na-eme njem aha ya bụ Geofrey Ugah kwuru na ya na-eme njem ahụ makana ha achọghị ị nọ n'Anambra site na 4th Nov ruo izu ụka n'abịa abịa.
Out onye ntorobịa anyị kwudoro ebe a na adọrọ ego bụ ATM kwuru na ya bịara iwere ego ugbua makana egwu dị na ngwa ngwa elekshiọn na atinye ụkwụ, ego nwere ike ịkọ ụkọ na Bankị.
Ntuliaka onye ga-achị Anambra ga afịọ ụbọchị satọde na-abịanụ.
Cheta na otu na-azọ nwere onwe bụ IPOB ekwuola ka onye ọbụla ghara ịpụta ezị site na 5th rue 10th nke ọnwa November.
Mana gọmenti ekwuola na ya bụ ntuliaka ga-adịrịrị ụbọch Satọdee.
Unizik ga-emechi malite 4-9 ọnwa Novemba
Ka nke a na-eme, Mahadum Nnamdi Azikiwe University dị n'Ọka, Ekwuola na ha agaghị enwe agụmagwụkwọ malite n'abalị anọ rue abalị Itoolu nke nke ọnwa Novemba.
Nke a pụtara n'ihe n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwurmahadum ahụ bụ Chika Gladys Ene ahụ binyere aka ma werpụta ụbọchị Tuzde, abalị abụọ nke ọnwa Novemba.
Mana ozi ahụ ekwughị ihe kpartara mechi nkuzi ahụ ha gbara ọkwa ya.