You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria Independence Day Ipob Sit at home: Ọwụwaanyanwụ tọgbọrọ chakoo ka e wepụrụ ọkọlọtọ Naịjirịa
Isi obodo niile n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa tọgbọrọ chakoo n'ụtụtụ Fraịde bu ụbọchị nke mbụ n'ọnwa Ọktoba 2021 dịka ndị mmadụ rubere isi n'ihe otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru sị ka ha nọdụ n'ụlọ.
Ọnọdụ a na-eme dịka mba Naịjirịa na-eme emume ncheta ụbọchị nwereonwe ha bụ nke mere n'afọ 1960.
N'agbanyeghi na ụbọchị a bụ ụbọchị Naịjirịa na-etinyekarị atụmatụ Bekee kpọrọ "Public Holiday", ebe niile dị chakoo n'ọnọdụ ọdịghị adịbu.
Ihe gosiri na ndị nabatara atumatụ Ipob a bụ na ndị na-apụta bụ zuo ahịa ha maọbụ gaa mkpa ha nọ n'ụlọ.
N'atụmatụ "public holiday" ndị ọrụ gọọmentị anaghị aga ọrụ, ụlọ akụ anaghị emepe, akwụkwọ anaghi agụ nakwa ọtụtụ ụlọ ọrụ Bekee anaghi agbape, mana ahịa na-azụ, ụgbọala na-agbazikww ike.
Oke Ụjọ
Ọtụtụ ndị mmadu gwara BBC Igbo okwu kwuru na ọjọ ji ha makana mwakpo na ogbugbu mmadụ buzi ihe e ji mmara ọwụwa anyanwụ.
Nke mere na ndị mmadụ kpebiri ige ntị oge ọbụla Ipob kwuru okwu.
O nwekwara ndi sị na onweghi ihe ha hụrụ ha ga-eji sị na onwere ihe ha ga-eji nwee aṅụrị na Naịjirịa.
Mana, okwu ndị a na-atụ ụjọ abụghị ihe aga akpachapụ makana akụkọ ya juru ebe niile.
Dịka ụnyaahụ, ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ gburu ndị mmadụ na mwakpo abuo ha mere n'Ajali nakwa ụzọ si Nnewi gawa Nnobi.
Akụkọ BBC Igbo nụru kwuru na otu onye nwụrụ na mwakpo ahụ.
N'ụbọchi Tuzde, ndị omekome wakporo ma gụọ Dkt Chike Akunyili, onye ọkwa ụgbọala ya, onye uweojii na-eso ya nakwa ihe ruur mmadụ anọ ọzọ na mpaghara Nkpor dị n'Anambara Steeti.
Lee Ihe BBC Igbo hụrụ n'ụfọdụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ:
Awka
Owerri
Umuahia
Abakaliki