Kemi Olunloyo: Nnamdi Kanu na Sunday Igboho na-achọ ikposa Naijiria nwere akwụkwọ mba ọzọ

Mgbe e biputara ya

Kemi Olunloyo adụọla ndị ntoroọbia ọdụ ka ha hapụ isozi onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na Sunday Adeyemo a ma dịka Sunday Igboho bụ onye ndu otu Yoruba Nation.

Na mkparịtaụka Olunloyo mere BBC Yoruba na nsonso a, o kwuru na na mmadụ abụọ a na-eti mkpu nwereonwe mpaghara nke ha, nwere akwụkwọ njirimara mba ọzọ.

Na ọ bụrụ na ha kposaa Naịjirịa, ha nwere ohere ịgbaga ofesi nke ọtụtụ ndị na-eso ha enweghị ike ya.

Ọ sịrị, "Ihe anyị nụrụ bụ na Ichie Adeyemo nwere akwụkwọ njirimara nwafọ mba Jamini, Nnamdi Kanu nwere akwụkwọ njirimara nwafọ Briten. Ndị nwere akwụkwọ njirimara mba ọzọ bụ ndị chọrọ ikposa ala a."

Ọ gara n'ihu kwuo na ya ekwenyeghị na nkewa Naijiria, na ọ kaa mma ka Naijiria dịrị n'otu.

O kwuru na e wepụ Ọdịda Anyanwu, na Naijiria agaghị enwe isi dịka ndị gbaliburu ya dịka Awolowo na Akintola emelighi ya.

"Akwadoghị m 'Yoruba Nation' mana akwadoro m ihe Ichie Sunday Adeyemo (Sunday Igboho) na-eme ịlụrụ ndị obodo ya ọgụ.

"Akwadoghị nkewa Naijiria n'ụzọ ọbụla, ihe m kwenyere na ya bụ 'One Nigeria'."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: