You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu Arrest: Ụmụaka Igbo na-ewe iwe, ị gaghị eji egbe na ịtụ ha nga mechie ọnụ ha - Elliot Ukoh
Elliot Ukoh, onye bidoro 'Igbo Youth Movement' ekwuola na ịgbọja ndị Igbo site na ịnwụchi Nnamdi Kanu agaghị eme ka ha kwụsị iti mkpu nnwereonwe.
Ukoh, onye bụ odeakwụkwọ 'Eastern Consultative Assembly' kwuru nke oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ụbọchi Wenezde sịrị na nnwuchi gọọmentị etiti nwụchiri Nnamdi Kanu agaghị akwụsị ndị ọzọ na-achọ ihe ọ na-achọ.
Maka nwuchi Nnamdi Kanu
Elliot Ukoh kwuru sị, " Nnwuchi anwụchiri Nnamdi Kanu ga-eme ka ọ na-ewu ewu".
Ukoh kwuru na gọọmentị Naijiria achọghị ime ndị ntorobia Igbo iwe na-ewe ihe e mere ndị ọzọ.
"Gọọmentị Naijirịa na ndị omekome na-akpa nkata. Ha na ndị Niger-Delta na-enwe mkparịta ụka. Gịnị kpatara na ha na ndị ntoroọbịa Igbo agaghị enwe mkparịta ụka?"
Ukoh kọwara na kemgbe ka o bidoro ime ọgbakọ ndị ntoroọbịa Igbo were sị, "Kemgbe afọ 80's, ndị ntoroọbịa na-ekwu otu ihe: Na ike Naijirịa agwụla ha".
Ihe o kwuru maka 'Restructuring'?
Ọkpọrọ oku ka e nwee nhazigharị obodo na mmpaghara na mpaghara.
Ụkọh kọwara na 'Restructuring' ga-eme ka onye ọbụla hara nha.
Ukoh kwukwara sị, "Ị gaghị anọ n'Abuja mee iwu zịpụ ya ma tụo anya na ọ ga-amasị ndị nwere omenala dị icheiche. Mpaghara niile kwesịrị ị nọro onwe ha".
Kedụ maka nzụko ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ na ihe gbasara ebe ndị ọchi ehi ga na-aga?
Ukoh kwuru na ọbụghị naanị ndị gọvanọ ọdịda anynwụ ikwu na ha kwenyere na otu Naijirịa, kama na ọ bụ ihe ndi a ka ha kwesịrị ime :
Maka ọdịmma Naijirịa
1) Ka e bido atụmatụ 'Restructuring' Ọ na-ebute mmepe obodo
2) Ha na ndị ntoroọbịa nwee mkparịta ụka - Ma gị na ndị ntoroọbịa enweghị mkparịta ụka ị na-agwa ha na ha agaghị iru. Mkparịta ụka ga-eme ka obi dajuo ha.
3) Kpọpụ ndị Fulani na-achị ehi agagharị - Enweghị onye ọchị ehi ọbụla akpọpụlara ụlọikpe.
Dịka gọọmentị na-ekele ndị nchekwa maka nwuchi Nnamdi Kanu na mwakpo Sunday Igboho, kedụ ihe ịchere?
Elliot Ukoh zara sị, " Ọ na-ekele onwe ya n'ihi na ọ bụ ya nyere iwu ka e mee ihe emere"
O kwuru sị," Gwara m Buhari na nsogbu Naijirịa bụ etu esiri hazie ya anya n'isi okwu na-akpata nsogbu, ọ bụghị ihe ọzọ gbara nsogbu ahụ gburugburu".
Kedụ ihe i chere maka Ohaneze?
O kwuru na ya achọghị itinye ọnụ maka ihe gbasara Ohaneze.
O kwuru sị, "ndị Igbo chọrọ otu nchịkọta mana Ohaneze abubeghị ihe ndị igbo na-atụ anya ya, ha ma kwa".
Ọ gara n'ihu kwuo sị, "Ihe mere achọghị m itinye ọnụ bụ na ha nwere otu anọ n'ime Ohaneze, ha anọkọghị ọnụ".
Kedụ ndụmọdụ ị ga-enye ndị Ipob?
Ukoh kwuru sị, "Ebe m kwụ bụ na umuaka Igbo na-ewe iwe, ị gaghị eji egbe na ịtụ ha nga mechie ọnụ ha. Gịni na ha nwee mkparịta ụka".
E kwesịrị ịwepụta iwu ọchịchi obodo ọzo nke gbadoro ụkwụ na 'Referendum'.
O kwuru sị, " Kama ụjọ ha bụ na emee 'Restructuring' ike niile ha nwere dịka ha na-achịkọta ndị agha, uweojii na ihe ndị ọzọ agaghị adịzịkwa".
Lee ya n'uju ebe a -