Ndị uweojii sị na ha egbuola ndị ESN ma napụ ha egbe n'Imo Steeti

Mgbe e biputara ya

N'ozi si ndị uweojii aka, ha kwuru na ha gburu ọtụtụ ndị ndị otu Easter Security Network (ESN) na mpaghara Izombie, Atta nakwa Ideato Nọt dị n'Imo Steeti.

Ọ bụ ngalaba uweojii pụrụiche dịka nke a kpọrọ "IRT Squad" nke Abba Kyari bu onyeisi ha nakwa ndị ọzọ gara ije a.

Dịka ha siri kwuo, "onye Ipob/ESN ha nwụchiri" kpọrọ ha gaa ọdọ ndị otu ya dị na ebe atọ a n'Imo Steeti n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun.

Ha dere na ha nwetere ụgbọala ezuru n'ohi, ngwa agha, nsị egbe, ọgwụ, ọkọrọtọ ESN/Ipob, mgbọ egbe, igbo nakwa ọgwụ ike tramadol na ndị ọzọ ebe ahụ.

Maazị Kyari na ndị IRT ọzọ nọ n'Omo Steeti kemgbe amalitere igbu ndị uweojii na ndị agha n'ọwụwa anyanwụ.

Ogbugbu mmadụ akwụsịtụla dịka ndi uweojii na ndị agha nwuchiri ma gbuo ụfọdụ ndị a na-eche n'aka dị na mkpa mkpa ndị a.

Ụfọdụ ndị e jidere kwenyere na ọ bụ ha na-akpa ike ma kwukwa na ha bu ndị Ipob/ESN, mana ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful gọrọ ụkwụ na aka n'aka otu ahụ adịghị na ya.

Emma Powerful kwukwara na ọ bụ ndị aka ha dị ọcha ka ndị uweojii na-egbu were akpọ ha ndị ESN.

Ndị uweojii n'onwe ha si na nke ahụ bu okwu ekwesighgi iji mee ihe ọbụla.

Ka ọkwụ ugbua, Ọwụwa Anyanwu adaala juu.

Mana, dịka ha kwuru na ha gburu ndị ESN, n'ime foto BBC hụrụ, onyeghị nke gosiri mmadụ abụghị ndị otu IRT ahụ ebe ha nọ ọrụ. O nweghị ihe yiri ozu ọbụla so foto ndị ahụ.