Fidelis Nweze: Ọ bụghị eziokwu na Fidelis Nweze ebiliela n’ọnwụ - Gọọmentị Ebonyi Steetị

Mgbe e biputara ya

Gọọmentị Ebonyi ekwusiela ike na Fidelis Nweze bụ kọmishiona Ebonyi steeti a sị 'bilitere n'ọnwụ' ka dọ n'ozu.

Igwe mmadụ tụbụrụ na-enwe ọṅụ sị na Fidelis Nweze bụ Kọmishiona Ebonyi steeti nwụrụ 'bilitere n'ọnwụ'.

Fidelis Nweze bụ Kọmishọna na-ahụ maka ihe mmepe obodo n'Ebonyi Steeti bụ onye e kwuru nwụrụ n'abalị Satọde n'ihe mberede okporoụzọ n'abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 2021.

Mana anya ahụbeghị ya bụ nwa amadi bụ onye e kwuru e bụgara ụlọọgwụ 'Turkish Hospital' dị n'Abuja ka o nwechara ihe mberede n'ụbọchị Satọde (19/6/2021)bụ ebe a sị ọ nọrọ nwụọ.

Ọṅụ na egwu ọnụ juru ndị obodo Ebonyi steeti n'ọnụ n'etiti ụbọchị Tọzde dịka akụkọ gbara na nwa ha bụ Fidelis Nweze, e kwuru nwụrụ anwụ 'bilitere n'ọnwụ' abalị abụọ a sịchara na ọ lara mụọ.

Igwe mmadụ tụrụ na-enwe ọnụ na kọmishọna Ebonyi steeti nwụrụ 'bilitere n'ọnwụ'

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọ ya dị n'okpuru ọchịchị Ezza-South n'ehihie Tọzde kwuru na ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ na-agba egwu ọṅụ, ebe ụfọdụ na-efe ego iji gosi obi ụtọ ha.

Gọọmentị Ebonyi e kwukwala na ya bụ akụkọ mbilite n'ọnwụ Nweze bụ akụkọ ụgha.

Ọnụ na-ekwuru gọvanọ Umahi bụ Francis Nwaze sị," Onye a nwụrụ bụ otu n'ime ndị kọmishọna anyị kacha mma. Gọọmenti ewepụtala ozi gbasaara ọnwụ ya."

N'iji gosi mwute n'ọnwụ ya, Gọvanọ Ụmahi, onye mara ọkwa ọnwụ ya n'ụbọchị Tuzde, abalị 22 nke ọnwa Juun, tinyere ụbọchị ezumike na Ebonyi Steetị ka o bụrụ ụbọchị Wenezde Juun 23, 2021 iji kwanyere ya ugwu.

N'ozi mgbasaozi nke Umahi wepụtara , ọ sịrị na "Ọ bụ ihe nkụja nke rara ahụ ikweta ịma ọkwa ọnwụ na kọmịshọna anyị na-ahụ maka ihe mwulite obodo bụ Inginia Kings Fidelis Nweze ọ nwụrụ."

N'abalị Wenezde, gọvanọ David Umahi gaara n'ụlọ nwa amadi ahụ iti ezinaụlọ ya aka n'obi.

Ọ gara n'ihu kwe nkwa inye ụmụ Nweze ohere agụmakwụkwọ nsite na Praịmairị rue mahadum.