Danladi Umar vs Biafran Boys: NBA sị na ha ga-enyocha ihe mere okwu dapụtara

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Otu jịkọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ 'Nigerian Bar Association' ekwuola na ha ga-enyocha agwa nke onyeisioche 'Code of Conduct Tribunal' ("CCT") bụ Danladi Yakubu Umar kpasaara otu onye nche n'Abụja na nsonso a.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na nsonnso a gosiri Umar ka ọ na-eti onye nche na-arụ ọrụ n'ọdọahịa Banex Plaza dị n'Abuja.

Dịka ndị mmadụ na-akatọ ihe mere, Umar gbanyere mmanụ n'ọkụ na-enu enwu dịka ọ kpọrọ ndị nọ ebe ihe ahụ mere bụ dị gosiri iwe ya etu o siri eti nwaamadi ahụ ihe "Biafran Boys" site n'ọnụ na-ekwuru ya, bụ Ibraheem Al-Hassan.

N'itinye ọnụ n'okwu ahụ, sịrị na ha "na-agbarụ ihu na ike ọkpọ aka nke onye n'ọkwa ọha bụ onye a na-atụ anya ịkpa agwa kwesịrị kpara."

N'ozi mgbasaozi ha wepụtara ụbọchị Tọzde nke Odeakwụkwọ Mgbasaozi ha bụ Rapulu Nduka binyere aka,NBA sị, "Dịka onye otu ndị ọkaiwu, iwu ezi agwa kwesịrị ekwesị a na-atụ anya n'aka ndị ọkaiwu soro jide Danladi Yakubu Umar."

" NBA site na kọmịtị ọ dịrị ga-enyocha ihe butere ihe mere iji hụ na e mere ihe kwesịrị iji gboo ọgụ na nsogbu ahụ."

Ọga m gwara m tinye "Biafran Boys" n'ozi mgbasaozi m zipụrụ - Ọnụ na-ekwuru Onyeisioche CCT

Ibraheem Al-Hassan, ọnụ na-ekwuru onyeisioche ngalaba na-ahụ maka agwa ndị nọ n'ọkwa na Naijiria bụ 'Code of Conduct Tribunal' bụ Jọstịs Danladi Umar ekwuola na ọ bụ ọga ya gwara ya ka o tinye "Biafra Boys" n'ozi mgbagbasaozi o degaara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Maachị 30, afọ 2021.

Al-Hassan gwara ụlọakụkọ, International Centre for Investigative Reporting(ICIR) na, "Ọga m nyere m iwu tinye "Biafran Boys' in ozi mgbasaozi ahụ" n'ihi na ndị wakporo ya bụkacha ndị Igbo.

Nwa amadi ahụ kwuru n'ezie na ọ bụ ya dere ozi mgbasaozi ahụ nke ndehie jupụtara kọwara na ọ bụ n'ihi ụdị ịcha ọkụ nọ ya n'isis iwepụta ahụ na-egbughị oge.

"Ozi mgbasaozi ahụ dajọrọ. Anyị chọburu, iwepụta ozi kwuo na na anyị ekwekwaghị ihe anyị kwuru n'ihi na ndehie karịrị akarị. Mana ọ bụ ihe e ziri m ka m mere."

N'aka nke ọzọ, onye nche ahụ a kpọrọ "Sargwak" kwuru na ihe butere okwu bụ na Umar kwụsịrị ụgbọala ya ebe ọ na-egbochi ndị ọzọ n'abata n'ogige ahịa ahụ.

Ọ gwara ụlọakụkọ Premuim Times sị "Ka gwachara ya nebe ọdọwara ụgbọala ya adịghị mma, ọ pụtara maa m ụra,ọkwọụgbọala ya makwara m ụra, ha dọkara mu akwa ma zọkwa m ụkwụ ugboro ugboro."

Gịnị na-esere onyeisi 'Code of Conduct Tribunal' na ndị "Biafran Boys"?

N'ụbọchị Tọzde, onyeisioche ngalaba na-ahụ maka agwa ndị nọ n'ọkwa na Naijiria bụ 'Code of Conduct Tribunal' bụ Jọstịs Danladi Umar kooro okwu na soshal midia dịka aha ya na-ewu maka ịkpọ ụfọdụ ndị ahịa nọ n'Abuja "Biafran Boys".

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ agwa Danladi Umar kpasara onye nche o tiri ihe dịka ọ na-arụ ọrụ dịrị ya n'ogige Banex Plaza dị n'Abuja na nsonso a.

N'ime ihe onyonyo ahụ nke fegharịrị na soshal midia ebe Umar tiri onye nche ahụ ihe ma gbakwa ya ụkwụ, ebe ndị mmadụ nọ ebe ahụ na-eji ya.

Mana n'iji gọọrọ onwe ya, Umar site n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Ibraheem Alhassan binyere aka, kwuru na ọ bụ maka na onye nche ahụ kparịrị ya mere ya jị kpaa ya bụ agwa.

O kwuru na nwa amadi ahụ jụrụ inye ya ohere ịdọsa ụgbọala ya n'ọdọụgbọala dị n'ogige Banex Plaza, na-agbanyeghị na ya bụ onye na-azụkarị ahịa n'ebe ahụ.

Ọ gara n'ihu boo ebubo na, "ndị agboro gụnyere ndị 'Biafran Boys' na-atụ ụgbọala ya iche" ma bookwa ha ebubo ịgbali ịkpochi ọnụama ogige azụmahịa ahụ nakwa imerụya ahụ.

Cheta na akụkọ pụtara n'abalị 30 nke ọnwa Maachị afọ 2021 kwuru na Umar tiri otu onye nche ihe maka ịgba isi akwara na ya bụ Umar gbasoro usoro nhazi ịdọsa ụgbọala n'ogige Banex.

Mana ndị mmadụ gbakọrọ ebe ahụ were iwe dịka o siri ọnwụ na-akụ onye nche ahụ ihe na-agbanyeghị na a na-arịọ ya biko ma bido tụwa ya ganye mgbe ndị uweojii bịara gboo ọgụ.

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka Okwu Danladi Umar

Ọtụtụ ụmụ Naijiria ejirila ogbo na ncha saa Danladi Umar (na ọnụ na-ekwuru ya bụ Ibraheem Alhassan) ahụ maka agwa ọ kpara nakwa maka ịkpọ ndị ụfọdụ "Biafran boys".

Anyị niile bụ ndị Biafra- Akụnna

Chuks Akụnna kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị 'quota system' na ndị dịka Danladi Umar na ọnụ na-ekwuru ya agaghị anọ n'ọkwa ha.

O kwuru na ụdị ihe a akaghị ime ma sị,. " ma chere o, anyị niile bụ ndị Biafra."

Oooh oooh ya oooo! Nigeria- Oby Ezekwesili

Onye bụbu Minista agụmakwụkwọ na Naijiria bụ Oby Ezekwesili kwuru na ya bụ okwu si n'ọnụ Umar dapụtara riri ya ọnụ.

O kwesịrị ka a chụọ Umar n'ọrụ- Aisha Yesufu

Aisha Yesufu kwuru na "a ka na-ekwu na o tiri onye na-arụ ọrụ dịịrị ya, ọ nwekwa ọnụ ịkpọ ụmụ Naijiria."Biafran Boys".

Yesufu gara n'ihu sị, "e kwesiri ime ya ka o tinye akwụkwọ arụkwagghịmụ maọbụ a chụọ ya n'ọrụ."

Mathew Ogwuche chekwara otu echiche ahụ.

O kwesiri ka a nwụchie Umar- Adeyanju

Onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ Deji Adeyanju kwuru na o kwesiri ka anwụchie Danladi Umar ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ịkpagbu ndị na-azụ ahịa n'Abuja.

"NBA, lebanyenụ anya n'okwu Umar"

@Chukwudivisaac kwuru na dịka ọ bụ onye ọkaiwu na ọ kwesịrị ka otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naijiria bụ "Nigeria Bar Association tinye ọnụ n'okwu ahụ.

Akpamoke ebe onye si egbuola anyị -Yusuf

Onye ọzọ kpọrọ onwe ya FS Yusuf tụrụ arịrị na akpamoke agbụrụ egbuola Naijiria.

Danladi Umar kpọrọ ndị Igbo aha ọjọọ iji kpuchie ihe o mere- Ademola Olarewaju

Nwa amadi aha ya bụ Ademola Olarewaju kwuru na ihe ọ hụrụ na ihe onyonyo ahụ bụ mkpagbu ndị amala n'aka onye nwere ọkwa ọchịchị, ebe ịkpọ ndị nọ ebe ihe mere 'Biafran Boys" bụ ụzọ Umar ji chọọ imesasị ndị mmadụ anya n'ihe ọjọọ o mere.