APC Abia Presidential rally: A ga m emekwu karịa - Buhari

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwusie la ike njikere ọchịchị ya dị ịrụnyegasị ọtụtụ ihe ndị e ji enyere ndụ aka nye ụmụ Naijiria ma ọ bụrụ na o nweta mmeri n'azọm ọkwa onyeisiala a ga-eme n'ọnwa Febụwarị, 2019.

Buharị kwuru nke a mgbe ọ gara njem achụmnta vootu n'Aba,Abịa steeti nakwa Owere n' Imo steeti ụbọchị Tuuzde.

O kwuru n'ọchịchị ya agbalịala ịrụ ụzọ, okporo ụgbọ oloko, ọgụ megide nrụrụaka, ezi nchekwa, nakwa ndozigharị okwu akụnaụba nke Naijiria n'ime afọ ndị ọ nọọla n'ọchịchị.

Ọ gwaziri ndị mmadụ ka ha tụnyere otu pati APC vootu na ntụliaka na-abịa iji nwetakwuo uru nke ọchịchị ọhakarasi.

NJC enyela Onnoghen,Tanko abali asaa ịsa akwụkwọ e dere megide ha

Otu na-ahụ maka ndị ọkaiwu Niajiria nke a kpọrọ National Judicial Council na bekee enyela ọkaipe ukwu Naịjirịa ụlọikpe bụ Walter Onnoghen na onye onyeisiala Buhari tinyere ka ọ nọchie ya bụ Tanko Muhammad abali asau ka ha saa ebubo e boro ha.

Otu NJC nwere mkpebi ahụ ka ha mechara nzukọ ntụmadị ha nwere ụbọchị Tuuzde n'Abuja.

Na nzukọ ahụ nke Onnoghen na Muhammad gụpụfrrụ onwe, NJC lebara anya n'akwụkwọ mkpesa anọ e detara ha;

1. Mkpesa e dere megide Walter Onnoghen nke Zikhrillahi Ibrahim nke 'Resource Centre for Human Rights & Civil Education' detara

2. Mkpesa megide Jọstis Ibrahim Tanko Muhammad, nke 'Centre for Justice and Peace Initiative' detara

3. Mkpesa megide Jọstis Ibrahim Tanko Muhammad, nke ọkaiwu Olisa Agbakoba

4. Mkpesa megide Danladi Yakubu Umar, bụ onyeisioche ụloikpe, Code of Conduct Tribunal nke otu 'Centre for Justice and Peace Initiative' detara

Ka ha nyochachara mkpesa ndị ahụ, otu NJC zigara ikpe Danladi Yakubu Umar ga ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka okwu gbasara ikpe nke a kpọrọ 'Federal Judicial Service Commission (FJSC)' bụ ndị ọ dịrị.

Ha zigakwara Onnoghen na Muhammad mkpesa nke ha ka ha were nye ọsịsa dịka usoro ikpe ha siri dị.

Cheta izụụka gara aga, e kpeburu Onnoghen n 'ụloikpe pụrụ iche a kpọrọ Code of Conduct Tribunal (CCT) maka ebubo ịzo akụnaụba ya, ebe gọọmenti etiti chụturu ya n'ike ma duo Tanko Muhammad iyi ọrụ dịka onye ọkaikpe ukwu Naijiria.

Nrụrụaka ka na-arị elu na Naijiria

Ngụkọ ụlọọrụ mbaụwa megidere nrụrụaka a kpọrọ 'Transparency International' mere gosiri na Naijiria kwụ n'ọnọdụ otu narị iri anọ na anọ n'ime mba otu narị na iri asatọ ebe nrụrụaka na-arị elu.

Afenifere adọnyerela Buhari na osote ya ukwu maka ntuliaka 2019

Ou jikọro ndị Yoruba niile a kpọrọ, Afenifere, ekwuola na ọ bụ Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osibanjo nke APC ka ha ga-akwado na ntuilaka 2019.

Ha kwuru nke a n' ọgbakọ ukwu ha mere n'Ibadan n'ụbọchị Tuuzde ebe ha kwuru na ọ bụ n'ihi na atụmatụ nke APC wepụtara so nzọukwu Obafemi Awolowo.

Ihe anyị ejighị zụọ onye egwu ọbụla- Mauricio Pochettino

N'egwuregwu,

Onye ndu otu bọọlụ Tottenham bụ Mauricio Pochettino ekwuola na ihe mere ha ejighị zụọ onye bọọlu ọbụla n'oge a abụghị n'ihi na ha enweghị ike ya kama ha ahụghị ụdị onye egwu ha chọrọ.