Onye Nkuzi Mahadum UNN Dọkinta Odum tụbara nwata akwụkwọ ya ime na amaja ya enwetala ntaramaahụhụ

Mahadum UNN

Ebe foto si, AFP

Mgbe e biputara ya

Mahadum University of Naịjirịa enyela Dọkịnta Chigozie Jude Odum nke ngalaba Archeology na Tourism tụbara nwata akwụkwọ ya ime enwetala ntaramahụhụ "Suspension".

Dike akwụkwọ mmachi onye Registrar UNN binyere aka siri kwuo, nwata akwụkwọ Chinyere Onah wetara nkpesa na Dọkinta Odum mesoro ya omume akwamiko ma na-emekwa ya ihe iyi egwu nke ukwuu.

Aha onyonyo, Nwata akwụkwọ na-asụ asụsu ọtụtụ

Ụlọ akwụkwọ ahụ gwazịrị dọkinta Chigozie Jude Odum ka ọ gagodi zuo ike n'ụlọ ya ganye na ha emechaa nyocha ya bụ ihe, ma gwakwa Bursar ya bụ mahadum ka ọ kwụba ya ụgwọ ọnwa ọkara nwa mgbe.

Dịka onye ọka ikpe Fabian Ugwuama na-ekwuchitere nwaada Chinyere Onah siri gwa BBC, Dokinta Odum tụbara nwada Chinyere ime site n'akaike na mmegbu ma si ya ga wepu afọ ime ahụ.

Ngwa ngwa nwatakiri ahụ mụrụ nwa, Odum chọrọ iji akaike were napụ ya nwa ya.

Okaikpe Ugwuama kwuru na Odum ji iyi egwu na achụgharị nwata nwaanyị ahụ n'ụlọ akwụkwọ ma mekwaa ka nne na nna nwaada ahụ nọrọ n'egwu.

Dịka ụlọ akwụkwọ UNN siri depụta na leta nkwụsịgodi ọrụ enyere Dokinta Odum, ha achọghị ihụ ya n'ụlọ akwụkwọ ganye na ha achọpụta na ebubo niile eboro ya ọ bụ eziokwu.

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ dọkịta Chigozie Odum kpụrụ n'ala makana ọ zabeghị ekwenti ya nke o ji aza ozi ederede ezigara n'ekwenti ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: