Ụmụakwụkwọ UNN: Iji BVN edeba aha bụ ụzọ imekpa anyị ahụ

University of Nigeria Nsukka

Ebe foto si, University of Nigeria /Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọakwụkwọ mahadum Naịjirịa dị na Nsuka bụ University of Nigeria Nsukka(UNN) agwaala ụmụakwụkwọ ha ka ha weta akara a kpọrọ 'Bank Verification Number'(BVN) na bekee maka idebanye aha n'agụmakwụkwọ afọ ọhụrụ.

Mana ụmụakwụkwọ ha na-akatọọ atụmatụ sị na ọ bụ ụzọ imeka ha na ndị mụrụ ha taa ahụ.

UNN depụtara iwu ọhụrụ a n'ozi ha wepụtara n'akara websaịt mahadum ahụ bụ www.unn.edu.ng.

Ihu websaịt UNN

Ebe foto si, www.unn.edu.ng

Ozi ahụ gara n'ihu dọọ ụmụakwụkwọ aka na ntị ka ha gbaa mbọ gaa n'ụlọakụ ha dị iche iche weta akara 'Bank Verification Number' (BVN) n'ulo bekee.

A maghị ma ozi a ọ bụ maka ndị na-abata ụlọakwụkwọ ahụ ọhụrụ ka ọ bụ maka ụmụakwụkwọ ochie.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-achọghị ka-akpọ aha ha gwara BBC Igbo na nke a bụ ụzọ ọzọ a chọrọ iji taa ụmụakwụkwọ na ndị nne na nna ahụhụ.

Otu n'ime ha kwuru na ya amaghị ihe gbasara BVN na ndebanye aha ụmụakwụkwọ.

Ọ sịrị: "Ha echeghị ụche maka ụfọdụ ndị ọ bụ nne na nna ha na- eji aka ha akwụnyere ụgwọ akwụkwọ. Kedụkwanụ ihe ụmụakwụkwọ na-enweghi ego n'ụlọakụ ga-eme?"

Onye ọzọ kwụrụ sị : "Nke a bụ ụzọ ọzọ ha ji achọ imekpa ụmụakwụkwọ ahụ. "

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Okwu Omeaku, ọ zara ekwentị ya mana ọ saghị ajụjụ ajụrụ ya.

E zigakwara ya ozi n'ekwentị, mana ọ zighachibeghi ozi ahụ rue mgbe akụkọ a pụtara.

Ụfọdụ na-atụ uche dịka ohi site na intanet na teknụzụ na-arị ibe ya elu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mahadum na Naịjirịa bụ NUC n'aha ịchafụ, ha sị na ha amaghị maka iwu ahụ.

Ha kwuru na mahadum ọbụla nwere ịkike ikpebi ụfọdụ ihe ha ga-eme n'ụlọakwụkwọ ha.

Ha gara n'ihu kwuo na akara BVN bụ ihe dịrị onye nwe ọbaego na ụlọakụ ọ mepere ya bụ ọbaego.

Ha kwukwara na ọ bụ UNN ka ọ dịrị ịkọwaa ihe mere ha ji nwee mkpebi ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ