You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chief of Army Staff: Ọchụchụ ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa abịaghịzi n'oge - Eliot Uko
Ụkọchukwu Eliot Ugochukwu Uko bụ onye chọpụtara ndị Igbo Youth Movement nakwa odeakwụkwọ 'Eastern Consultative Association' ekwuola na ọtụtụ ihe emebiala tupu ahọpụta ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ na Naịjirịa.
O kwuru na o kweteghị na ndị isi ọrụ nchekwa a ahọpụtara ọhụrụ a ga-agbanwe ihe mebigoro gbasara nchekwa Naịjirịa.
O kwuru na usoro nhazi ọchịchị, ịma mmadụ, amaghị ọrụ ndị ọchịchị nakwa ọchịchị nchigbu butere ọtụtụ nsogbu dị na nchekwa Naịjirịa.
O kwuru na emeghị nhọpụta n'oge emeela ka otu ndị omekome karịa na Naịjirịa.
Uko kwuru na okwu esoghị 'Federal Character' wee mee nhọpụta abụghị ihe ọhụrụ.
N'okwu ya, ndị na-achị Naịjirịa a na-achị gwa anyị na onweghị onye tozuru n'ala Igbo ị nọ n'isi oche ọrụ nchekwa Naịjirịa.
Gbasara okwu na ọ bụ Leo Irabor kwesiri ịnọ n'isi ọkwa n'ime ndị ọrụ nchekwa a ahọpụtara ọhụrụ a, Uko kwuru na ọ bụghịkwa ihe ọhụrụ.
Gọvanọ Nyesom Wike
Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike adọọla ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ aka na ntị ka ha gbanahụ iji ịma mmadụ so ihe gbasara nchekwa Naịjiria.
O kwuru sị na ọ dị mma na onyeisiala emechaala gee oku ndị mmadụ kpọrọ ka e weta ndị ọhụrụ, ma kwuo ka ha gbaa mbọ ghara ị na-agba egwu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akụ.
Aisha Yesufu
Aisha Yesufu bụ otu ndị isi ngaghariwe 'End Sars' kwuru si na ọ ka na-agbagoju ya anya etu onye achụbụrụ n'ọrụ maka amaghị ọrụ ga-esi bụrụ onyeisi ndị ọrụ nchekwa ugbua.