National Social Housing Programme: Etu ị ga-esi soro rite n'ụlọ 300,000 gọọmentị Naịjirịa na-akwado ịrụ

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala atụmatụ iji rụọ ụlọ ruru 300,000 na steeti niile gụnyere isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

N'atụmatụ ahụ, ha kwuru na ọ bụ ndị anaghị erite nnukwu ego n'ụgwọ ọnwa ka ọ ga-akacha rue aka.

Ha kwukwara na a na-atụ anya na ọ ga-enye ihe karịrị otu nde ụmụ Naịjirịa ọrụ mgbe amalitere ịrụ ya bụ ụlọ.

Ụlọ ndị ahụ a na-akwado ịrụ dị n'ụzọ atọ dịka ha si kwuo:

  • Nke nwere imeụlọ abụọ - nde naịra abụọ
  • Nke nwere imeụlọ atọ - nde naịra abụọ na puku narị asaa na iri ise
  • Nke nwere imeụlọ anọ - nde naịra iri atọ na puku narị ise.

Lee ihe ndị ị ga-eme iji sonye na ndị ga-erite ụlọ

  • Bụrụ onye ala Naịjirịa
  • Bụrụ onye ntorobịa gafere afọ iri na asatọ
  • Nwee akwụkwọ 'National Identity Card'
  • Denye aha gị na websaịt ha dị ebe a ma kwuo ụdịrị ụlọ ịchọrọ.
  • Nwee ọrụ ebe ị na-erite ụgwọ ọnwa

Ọ bụru na ịmeechaa ihe ndị a, ma ahọpụta gị, ị ga-enwe ịke ịkwụ ụgwọ ụlọ ị chọrọ nwayọ nwayọ.

Ajụjụ ndị ọzọ ị nwere banyere atụmatụ a bụ nke gọọmentị zara n'ebe a .