National Social Housing Programme: Etu ị ga-esi soro rite n'ụlọ 300,000 gọọmentị Naịjirịa na-akwado ịrụ

Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala atụmatụ iji rụọ ụlọ ruru 300,000 na steeti niile gụnyere isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.
N'atụmatụ ahụ, ha kwuru na ọ bụ ndị anaghị erite nnukwu ego n'ụgwọ ọnwa ka ọ ga-akacha rue aka.
Ha kwukwara na a na-atụ anya na ọ ga-enye ihe karịrị otu nde ụmụ Naịjirịa ọrụ mgbe amalitere ịrụ ya bụ ụlọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọ ndị ahụ a na-akwado ịrụ dị n'ụzọ atọ dịka ha si kwuo:
- Nke nwere imeụlọ abụọ - nde naịra abụọ
- Nke nwere imeụlọ atọ - nde naịra abụọ na puku narị asaa na iri ise
- Nke nwere imeụlọ anọ - nde naịra iri atọ na puku narị ise.
Lee ihe ndị ị ga-eme iji sonye na ndị ga-erite ụlọ
- Bụrụ onye ala Naịjirịa
- Bụrụ onye ntorobịa gafere afọ iri na asatọ
- Nwee akwụkwọ 'National Identity Card'
- Denye aha gị na websaịt ha dị ebe a ma kwuo ụdịrị ụlọ ịchọrọ.
- Nwee ọrụ ebe ị na-erite ụgwọ ọnwa
Ọ bụru na ịmeechaa ihe ndị a, ma ahọpụta gị, ị ga-enwe ịke ịkwụ ụgwọ ụlọ ị chọrọ nwayọ nwayọ.
Ajụjụ ndị ọzọ ị nwere banyere atụmatụ a bụ nke gọọmentị zara n'ebe a .

























