Burna Boy Bet Awards 2021 : Lee ihe ise e nwereike iji kpọọ ya 'Odogwu'

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Burna Boy nke ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu, abụrụkwala aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na Naịjirịa n'ụtụtụ Mọnde a.

Nke a na-abịa dịka o so na ndị ritere nturu ugo BET Awards nke afọ 2021.

Burna Boy eritela nturuugo a ugboro atọ n'ime afọ atọ 2019, 2020, 2021, iji gosi n'eziokwu na ọ bụ Odogwu n'ezie.

Emume 'BET Awards' nke afọ 2021 bụ emume nturugo mbụ nke ndị mmadụ gbakọtara ọnụ na ya kamgbe ọrịa covid19 bidoro na ngwụcha afọ 2019.

Burna Boy tuuru ugo na ngalaba nke a kpọrọ 'Best International Act'.

Ndị ọzọ so were zọọ nturuugo a gụnyere: Aya Nakamura (France), Diamond Platnumz (Tanzania), Emicida (Brazil), Headie One (Uk), Wizkid (Nigeria), Young T & Bugsey (Uk), Youssoupha (France).

Lee ihe ndị ọzọ mere Burna Boy ji bụrụ Odogwu n'egwu dịka o si akpọ onwe ya:

1) O ritela nturuugo na mba ofesi

Burna Boy bụ otiegwu Naịjirịa mbụ ritere nturugo Grammy n'ihi egwu naanị ya tiri.

Wizkid nwetakwara ntuurugo a, mana ọ bụ maka egwu ya na Beyonce tikọrọ ọnụ.

N'afọ 2019, 2020, na 2021, Burna Boy nwetara nturuugo "Onye mba ofesi kacha agụ egwu" nke ndị BET.

O ritekwara "Onye si Afrịka kacha agụ egwu" nke ndị MTV Europe Music Awards (EMAs) n'afọ 2019.

N'afọ 2020, o so na ndị sonyere ndị BET mee emume ụbọchị nturuugo ha.

Oge a họpụtara ya na ndị nwereike irite nturuugo Grammy maka "ọbaegwu kacha mma n'ụwa" n'ihi ọbaegwu ya ọ kpọrọ "African Giant", ndị mmadụ kwadoro ya, mana o ruteghizi ya aka.

2) Otiegwu aha ya na-ada nnukwu ụda na mbaụwa bụ Sean "Diddy" Combs, so sikọlata ọbaegwu ọhụrụ ya.

N'agbanyeghi na ọrịa coronavirus keturu onye ọbụla na mpaghara mbaụwa niile, Burna Boy na Diddy ji ihe nkiri e ji akpa nkata wee tikọta isi ọnụ, buputa egwu a na-agbaka ndị mmadụ isi ugbua.

N'okwu o depụtara, Diddy jara Burna Boy mma, sị na ọ bụ otu "odogwu" ya na rụkọrọ ọrụ.

3) Ya na ndị aha ha na-ada ụda etikọọla egwu

Ọ bụ eziokwu na egwu a na-akpọ "Afrobeats" bụzị ebe a nọzị ugbua, nke a mere ka ọtụtụ ndị mba ofesi na-etinye uche n'egwu ya.

Burna Boy akpọtala ndị si mba dị iche iche ka ha tinye ọnụ n'egwu ya.

Ndị gụnyere Chris Martins nke otu egwu Coldplay, Naughty by Nature, Sauti Sol, Youssou N'Dour nakwa Stormzy, esorola ya tie egwu ya.

Ya onwe ya etinyekwalanụ ọnụ n'egwu ndị gụnyere Beyonce, Sam Smith, Lily Allen, Fall Out Boy, Major Lazer, Mahalia Burkmar, DJ Snake, Ed Sheeran, Pop Smoke nakwa J Hus.

4) Ọ na-eme ka Afrobeat gazuo ụwa niile

A hụ Burna Boy a hụ Afrobeat, n'ihi na ka ọ dị ugbua, ọ dịzị ka ọ bụ ya kacha buru egwu a n'isi.

Ọ na-akpọ ụdịrị egwu nke ya "Afro-fusion", nke gụkọrọ Afrobeat, "dancehall riddim", reggae nakwa egwu a na-akpọ "R&B".

Ọ bụ ya kachakwa eme ka ụmụ ọgbara ọhụrụ nwee mmasị maka egwu Fela Anikulapo-Kuti bụ onye egwu anaghị ata ntị ya ata mgbe ọ dị ndụ.

Ọ na-eme nke a site n'ịgụgharị maọbụ weretu n'egwu Fela ji sikọlata egwu nke ya, mee ka ọ na-atọwa ndị ọgbara ọhụrụ ntị.

Burna Boy na-esosi nzọụkwụ Fela n'ike, ọ bụghị naanị egwu ya ka ọ na-emetụ aka, ọ na-etinyekwa ọnụ n'ịkatọ gọọmentị Naịjiria ma ha zọghie ụkwụ.

5) Ọ dị ka ihe ndị Igbo na-amasị ya

Ị chetara mgbe o tiputara egwu ọ kpọrọ "Odogwu"?

Ọ bụghịkwa ebe ahụ ka ọ kwụsịrị, n'ọbaegwu "Twice as tTll" a, ọ gụkwara egwu ọ kpọrọ Onyeka.

O tiri egwu ahụ ọ gụrụ maka nwaanyị bụ ọ dị n'obi, ka ọ na-adatu ka "Highlife".

N'egwu ahụ o kwuru "ọsọndị owendi" ma kwuokwa na nwaanyị ahụ na-abịa dịka Onyeka Onwenu bụkwa otiegwu Igbo ji eme ọnụ.

Burna Boy na onwe ya kọwara ihe ya na ihe gara tupu o wepụta ọbaegwu ọhụrụ a.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: