You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E nyela onyeisi NCAC bụ Olusegun Runsewe oche na nga
Okaikpe nke ụlọikpe ukwu na Abuja bụ Jude Okeke enyela iwu ka e tinye Olusegun Runsewe, onyeisi ngalaba na ahụ maka nka na omenala bụ National Council for Arts and Culture (NCAC) na Bekee na mkpọrọ.
Nke a mere dịka ndị ụloọrụ Ummakalif Limited gbara ya akwụkwọ maka ịnupụ isi na iwu ụloikpe nyere na mbụ.
Ihe butere ya bụ mmeche e mechiri "Art Village' n' Abuja.
Ụlọọrụ Ummakalif kwuru na mmechi obodo ahu abụghị ihe dị na akwụkwo nkwekọrịta ọrụ ha na ngalaba ahụ nwere.
Ọ bụ na ụbọchi nke iri abụọ na otu nke 2019 ka ndị ụlọọrụ Ummakalif gbara Runsewe akwụkwọ ma sị ka ụlo ikpe kpọchie ya maka ịnụpu isi na iwu ụloikpe nyere na ụbọchi iri na ise nke ọnwa Disemba 2017 ka a hapụ imetu ihe ọbụla aka na ya ogbe nka.
Ulọọrụ Ummakalif gbakwara Minista Abuja, ngalaba 'Federal Capital Development Authority na Minista na-ahụ maka Omenala na njem nlegharị anya.
Iwu ọhurụ apụtala maka mgbasaozi
Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed enyela iwu ọhụrụ na ụlọ mgbasaozi niile dị na Naịjirịa ga-enweriri akụkọ si Naịjirịa na pasentị iri asaa.
Iwu ọhụrụ ahụ machikwara ụlọọrụ mgbasaozi iji egwu ọbụla eme ihe n'akwụghị ndị nwe ya ụgwọ.
Ashley Young agbajọọla Manchester United
Ashley Young agbajọọla ndọtị Manchester United chọrọ ịdọtị ikike ọrụ ya n'aka ha dịka otu Intermilan na-achụsị ya ike.
Young gbara afọ iri atọ na anọ bụ onye ndu otu Manchester United ga-esonye Inter Milan ma oge ya bịa na njedebe n'ọnwa ole na ole na-abịa.
Azọpụtala ụmụaka iri abụọ nọ 'Orphanage' uweojii sị enweghi akwụkwọ na Kaduna na Kano
Ndị uweojii na Naịjirịa azọpụtala ụmụaka iri abụọ na asaa na ebe eji ha n'ụzọ ezighiezi na steeti Kanu na Kaduna
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ Abdullahi Haruna gwara BBC na gọọmentị enyeghi ndị nwe ụlọ ndị enweghi nne na nna a ikike ịrụ ọru.
Ụmụaka ndị a dị afọ atọ ruo iri na abụọ.
Maazị Haruna sị: "Nwoke a nọ na arụ ọrụ a ọtụtụ afọ na-ejighi ikike gọọmentị. Nke a migidere iwu."
"Anyị zọpụtala ụmụaka iri an itoolu na ụlọ nchekwa Du Merci dị na Kano na asato na ogige ha di na Kaduna nke wetere ya ụmụaka 27."
NUC egburiela agụmakwụkwọ 'Mass Communication'
Ngalaba na-ahụ maka mahadum bụ Nigerian Universities Commision egburiela atumatu ịgụ maka mgbasaozi Bekee kpọrọ Mass Communication ụzọ asaa.
NUC si na nke a bụ ime ka atụmatụ ahụ kwụrụ chịm n'ụwa ọhụrụ a nọ na ya.
N'ofesi,
Obi Ezewannyị Briten agbarụọla ihu maka atụmatụ Nwaeze Harry na nwunye ya Meghan nwere.
N'ozi ha wepụtara, ọnụ ndị na-ekwuruu Ezenwanyị Eliza sị na Harrry na Meghan agwaghị ha na ha chọrọ ịpụ n'ọgbọ
N'egwuregwu
Ọgba bọọlụ Kelechi Iheanacho na-ewu na Twitter.
Nke a nụ maka kpọcha kpọcha goolu o nyere iji nyere otu Leicester iji gbaa nhatanta n'asọmpị ha na Aston Villa ụnyaahụ
Ngalaba aka na-achí imo steeti bụ Emeka Ihodeioha hibere iji nyocha ikuku kuru n'ụlọ ọrụ akpọrọ "Imo State Oil Producing Area Development Commission" (ISOPADEC) eboola Sineto Rochas Okorocha ebubo nrụrụaka.
Romanus Ezeogu bụ onyeisi ngalaba ahụ sị aka Okorocha dị na ijiri naịra isi na ọma a na-achọ achọ.
Nyocha ngalaba a bụ site ọnwa Mee 2011 ruo Mee 2019.
Ihe ha tinyere anya bu nrụrụaka metụtara ijeri naira isii n'ọma.
Ha sị na Okorocha wepuru ego ISOPADEC n'ụzọ n'ezighiezi.
Ndị oyi egwu egbuola ọtụtu ndị agha na Borno
Mbada ọgụ dara n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị oyi egwu n'obodo Monguno dị na Borno steeti ataala isi ndị agha ruru iri abuo na ndị nkiti atọ.
Dịka ụlọntaakukọ Reuters and AFP jiri kwuo anya hụru ya bụ ọgụ sị na ndị omekome a ji ụgbọala ndị agha nwete ohere ịbanye n'ime Monguno ma malite ịkwa mgbọ.
N'ofesi,
Nwa eze Harrry na Nwunye ya bụ Meghan ekwuola na ha aghaịzị esonyesịa n'emume ndị be Ezenwaanyị Briten na-eme.
Harry na Meghan sị na ha ga-agba mbọ etu ha ga-eji kpatawa akụnaụba nke ha.
N'Egwuregwu,
Ọgba bọọlụ Wilfred Ndidi nwereike wụsa ọwa nwamgbenta iji nweta ohere iji nyaa mmerụ ahụ onwetere dịka Leicester na akwado asọmpị
A na-ele anya na ọ ga alaghachite n'ọnwa Febụwarị.
Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a