'Ntuliaka ka e ji ahọpụta ndị isioche LGA, ọnweghị otu ọzọ' - Onye ọkaiwu

Umuahia n'Abia
Mgbe e biputara ya

Okezie Ikpeazụ, Gọvanọ Abịa steeti, ezigala aha ndị ọ họpụtara maka ịlekọta okpuruọchịchị obodo anya n'ụlọomeiwu steeti ahụ.

Nke a pụtara na Abia steeti enweghị ndị isioche ọkpụrụọchịchị obodo nke ndị steeti ahụ ji ntuliaka họpụta.

Ikpeazu chụrụ ndịisioche nke mbu tupu ọ họrọ ndị nke ọhụrụ a.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo kwuru na Abia steeti enweghi ego ha ji ahazi ntuliaka okpuru ọchịchị.

Ememanka kwuru sị: "N'ezie, ị so usoro ntuliaka họpụta ndị isioche okpụrụọchịchị dị mkpa, mana ọ bụghị ihe mbụ chere anyị n'ihu ugbua".

Keke
Nkọwa foto, Umuahia

Agwa a abụghị naanị n'Abia steeti ka ọ tọrọ.

Imo steeti n'onwe ha nwere nke ha kpọrọ "Interim Committee" bụ nke nwere onyeisioche na-elekota ha.

Ọnụ na-ekwuru gọvanọ Imo kwuru na gọmenti Imo steeti ehibela kọmiti ga-ahazị ntuliaka maka ndị ọzọ ga-abanye n'ọchịchị mgbe adịghị anya.

Owerri
Nkọwa foto, Owerri

N'Anambra steeti, ha nwekwara nke ha kpọrọ "Caretaker Committee" bụ nke ha na-emegharị ọnwa atọ ọbụla.

Ọnye ọchịchị ọbụla na-eme nke ọma nwere ike ịrụrụ gawa, mana a ga-ewepụ onye ọbụla na anaghị eme nke ọma.

Ndị Enugwu steeti nwere ndị "Caretakers" kemgbe afọ abụọ ugbua.

Ihe akpụrakpụ otiigba dị n'Enugwu steeti
Nkọwa foto, Enugwu

Mana ha kwuburu na ha kwesiri ịme ntuliaka maka ndị isioche okpuruọchịchị na Disemba a, mana nke ahụ agataghịzị.

Ndị mmadụ nwere olileanya na ha ga-eme ya bụ ntulika n'afọ ọzọ.

Abakaliki
Nkọwa foto, Abakaliki

Naanị Ebonyi steeti nwere ndị isioche okpuruọchịchị ahọpụtara site na ntuliaka.

Ọchịchị ndị a ahọpụtara kemgbe 2017 ga-ebi na 2020 bụ mgbe ha ga-eme ntuliaka ọzọ.

Mana iwu ọhụrụ e hibere na steeti ahụ kwuru na ọ bụ naani afọ abụọ ka ndị isioche okpuruọchịchị obodo ga na anọzị bido n'afọ ọzọ.

Ihe iwu kwuru

Malachy Ugwummadu

Ebe foto si, Malachy Ugwumadu

Nkọwa foto, Malachy Ugwummadu onye ọkaiwu

Onye okaiwu aha ya bụ Malachy Ugwummadụ gwara BBC Igbo na gọvanọ ọbụla na-esoghị usoro iwu kwuru eme nhọpụta na-ada iwu Naịjirịa.

Ugwummadụ bụ onye sị na iwu a dị na sekshon 7 sọb seksho 1 nke akwụkwọ iwu Naịjirịa.

Ọ sị na ọ bụ amaghị ihe ndị mmadụ mere ha jị gba nkịtị ka ụdị ihe ahụ na-eme.

Ọ kwetakwara na gọọmenti etiti na-akwụnye ụgwọ na akpa ndị okpuruọchịchị na ahopụtaghị nke ọma na-adakwa ya bụ iwu n'otu aka ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee Ugwuta, obodo ọma nọ n'akụkụ mmiri