Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ: Okezie Ikpeazu ekeleela Amaju Pinnick
Isiokwu ndị dị mkpa na mgbede a

Ụmụ afọ Igbo ruru asatọ so na ndị e bulitere n'ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ 'Senior Advocates of Nigeria (SAN).'
Ha bụ George Igbokwe, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, Abuchi Madu,Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo.
Ndị na-azụ ahịa enwela mmeri taa.

Ebe foto si, AFP
Ụlọịkpe n'Abuja amanyela iwu ka-ewugharịa ọdọ ahịa ndị gọọmentị obodo ahụ kwaturu n'ụlọahịa Karmo n'Abuja.
Ndị ihe a metụtara kpụpụrụ ngalaba na-ahụ maka Abuja nakwa minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa kemgbe 2011 maka nkwatu a mere n'afọ 2006.
#Ekitidecides

Ebe foto si, BBC Yoruba
Dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Ekiti steeti echi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụfọdụ ngalaba gọọmentị dị ịcheiche agbachiela n'oge.
Ọge ọchịchị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Ayodele Fayose ga-ebi echi mgbe a họpụtara onye ga-anọchị anya ya.
N'akụkọ ofesi,

Ebe foto si, BBC Tamil
Ndị uweojii na mba India anwụchiela otu onye nkuzi kwara nwataakwụkwọ ya aka o we siri n'elu ụlọ dapụ nwụọ.
N Longeshwari bụ aha nwata ahụ na-atụ egwu isi n'elu ụlọ ahụ wutuo mgbe ha na-eme ọzụzụ nchekwa tupu onye nkuzi ahụ kwaa ya aka.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enyela Amaju Pinnick ekele pụrụịche maka ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka osote onyeisi CAF
Cheta na achụrụ Amaju Pinnick n'ọrụ dịka onyeisi ngalaba egwuregwu bọọlụ nke Naịjirịa n'ụbọchị ole na ole gara aga.
Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo?
Gụọ ya ebe a:

Gee nkeji nke mgbede a:






























