You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cameron Boyce: Ọnwụ ya agbawala ụwa obi
Ezinaụlọ Cameron Boyce ekwuputela na nwa ha nwoke bụ ntorobịa na-eme ihe nkiri ama ama n'ụlọrụ Disney anwụọla.
Ọnụ na-ekwuchitere ezinụlọ ahụ kwuru na Boyce nwụrụ n'ụra ya ka akwụkwụ dọchara ya.
Boyce malitere ime ihe nkiri ya n'ejije akpọrọ 'Mirrors' mana eji ihe nkiri ọ na-eme na Disney wee mara ya.
Ọ bụ n'abali isii nke ọnwa Julai ka ekwuputere maka ọnwụ ya ma na-arụtụ aka na ọrịa na-arịabụ ya tupu ọnwuọ.
Lee photo o tinyere na soshal midia n'abali fotere ụbọchị ọnwụrụ.
Ihe ndị ọzọ ikwesiri ịma maka Cameron Boyce
- Ọ malitere mewe ihe nkiri n'afọ itoolu
- Ọ meela ihe nkiri gụnyere 'Mirrors', 'Grown Ups', 'Jessie' (nke Disney hibere), Descendants (ebe ọ kpara agwa ka Carlos de Vil)
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya n'elu soshal midia
@sushiking28 kwuru na ọnwụ Boyce gbawara obi ya.
@gabriiellann kwuru na o cheta ka Boyce si makụọ nne ya ụbọchị ụkanne, ọnwụ ya na-agbawa ya obi.
@minyugenn kwuru na onweghị onye ga-adị ka nwanne ya nwoke a bụ Cameron Boyce nwụrụlanụ.
@VictoryxoxFan kwuru bụ nnukwu onye ama ama n'ejije nke a mere ka obi gbawa ya.