Ọzọdimgba ọ na-eche foto nwoke a nche ka ọ bụ gịnị?

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ka dị mkpa na mgbede a

Lekwa ọzọdimgba ka ha chere foto onye na-achị ha nche

E serela ọzọdimgba abụọ foto ka ha kwụrụ ọtọ ka mmadụ ebe ndị nche ha na-ese foto esereonwe 'selfie'.

Ha na ndị nche ha ndị zọpụtara ha n'aka ndị zuru ha mgbe ha ka dị ntakịrị.

E setere ya n'ụlọ edobere ọzọdimgba ndị nne na nna ha nwụrụ na Virunga National Park, DR Congo, ebe a ka ụmụanụmanụ na-ahụ ndị ọchị ha ka nne na nna mụrụ ha.

Osote onye ndu ha gwara onye onye nta akụkọ BBC Igbo na ọzọdịmgba ndịa na-eṅomi agwa mmadụ ndị gbara ha gburugburu na-elekọta ha kemgbe ha hụrụ ha.

Innocent Mburanumwe, osote onye ndu ha na Virunga, gwara BBC na e gburu nne na nna ọzọdimgba ndị a na Julaị n'afọ 2007.

"Tinubu chọrọ ịbụ ekwucha ọgwụ na Naịjirịa"

Onye kwuru nke a bu onyeisi ndị ulo omeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara.

Dogara kwuru ihe a na ntinye ọnụ ya n'ebubo Tinubu boro ndị omeiwu na ha na-agbakwunye ego na bọọjetị.

Buharị na-abata obodo Legọs

Ndị LASTMA bụ ndị na-ahụ maka nhazi njem ụgbọala n'obodo Legọs enyela ndị na-agba n'okporo ụzọ ndụmọdụ ka ha ghara ịgba n'ụfọdụ ụzọ n'ime Legọs maka ọbịbịa onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ụzọ ndị ihe a metutara bụ Mobolaji Bank-Anthony Way, Kodesoh Road; Obafemi Awolowo Way; Kudirat Abiola Way na Ikorodu Road.

Ụzọ ndị ọzọ bụ Oworonshoki-Apapa Expressway, International Airport bụ nke gawara Local Airport site Mobolaji Bank-Anthony Way lachite Obafemi Awolowo Way.

Ụzọ ndị a ga-emechi site na elekere itoolu nke ụtụtụ ruo elekere atọ nke ehihie.

Na Benue

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha gbochiri agha n'etiti obodo Ikyora na Shitile n'ọnụ ụtụtụ taa.

Ndị agha dere n'akara Twitter ha na mgbochi a sitere na ozi ha nwetere na achọro iwakpo obodo Katsina Ala.

Saudi Arabia egbuola ndị 'ọyị egwu'

Mba Saudi Arabia egbuola mmadụ iri ato na asaa ha si aka ha dị na ogwu ara ọbara

Ogbugbu a mere n'obodo Mecca, Medina nakwa Eastern Province

Taa bụ oge eji echeta akwụkwọ Bekee kpọrọ "World Book Day".

Emume 'World Book Day'

Akwụkwọ amaka, kawa ahụ ka ịgụ akwụkwọ taa bụ oge eji echeta akwụkwọ bụ nke Bekee kpọrọ "World Book Day".

Gụọ nkeji a ebe a:

Lee ihe nkiri anyị nke taa: