You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị uweojii anwụchiela nwoke ji $20m abụghị ezi ego
Akụkọ mbụ
Ndị uweojii na mba Kenya anwụchiela mmadụ isii n'ime ụlọakụ Barclays maka ego abụghị ezigbo ya.
Onyeisi ndị na-eme nyocha kwuru nke a site n'akara Twitter ma kwuo na ọ bụ n'ime ụlọakụ ahụ ka achọtara ego adigboroja ahụ.
Ụgwọ opekatampe
Ndị Anambra steeti ga na-enwe onwe ha n'ọṅụ ugbua gbasara ụgwọ opekatampe ọhụrụ.
Ha gwara BBC Igbo na ha ga-abụ ndị mbụ ga-akwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ bụ puku naịra iri atọ.
Gịnị na-eme na Bauchi?
Akụkọ na-ekwu na Inec ekpegharịala iwu otu ụlọikpe n'Abuja nyere iji kwụsị ngụkọ vootu a na-eme na Bauchi steeti.
Ngụkọ a na-agụkọ bụ nke ntuliaka ọkwa gọvanọ nke e mere na satode abụo gara aga.
Na mba ofesi,
Ndị obodo Acipayam na mba Turkey ga-achị obi ha n'aka ugbua n'ihi ala ọma jiji mere n'obodo ahụ.
Mmadụ atọ merụrụ ahụ n'ihe a ebe ụfọdụ ụlọ obibi dara ada.
Amabeghi ma o nwere onye nwụrụ ebe ahụ.
N'egwuregwu!
Otu "Super Eagles" nke Naijirịa ebidola ọzụzụ ha ta n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi nke dị n'Asaba
ebe otu obere nke akpọrọ "Dream Team" na mba Libya na-achịpụ ya iji zọta ọnọdụ n'asọmpị iko mba Afịrịka.
Mana ndị Libya mechara merie ndị "Dream Team".
Akụko BBC Igbo na nkeji
Atiku sị na ya meriri Buhari
Atiku Abubakar nke PDP ekwuola na nchọpụta ya mere na ikwe kọmpụta ndị Inec gosiri na ya ji ihe karịrị otu puku vootu merie Muhammadu Buharị na ndọrọndọrọ onyeisiala e mere n'ọnwa Febuwarị.
Nke a dị n'akwụkwọ Atiku gbara Inec, APC na Muhammadu Buhari bụ n'ụlọikpe ndọrọndọrọ ọchịchị nke ndị isiala dị n'Abuja.
Obino na-eche echiche ịmachi ahịa mbughari
Gọvanọ Willie Obialo ekwela nkwa na gọmenti ya ga-akwu ụgwọ ụlọọgwu ndị meruru ahụ na ihe mberede okporo ụzọ n'Umuchu bụ ebe trailer ọzọ dabara n'ụlọ ahịa ndị mmadụ ma meruo ọtụtụ ndị ahịa mbugharị ahụ.
Obialọ kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta ndị ya bụ ọdachị dagidere bụ ebe ọ nọ rutu aka ịmachi ahịa mbugharị na steeti ahụ.
Ihe mberede a mere n'otu ụbọchị nke mere Ọnịcha mere bụ ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Maachị afọ 2019.
Iji ọgwụ agbagbu ahịa n'ubi
Ngwa elenụ anya o, Ụlọikpe na San Fransico, US, achọpụtala na ụmụ ọgwu a eji egbụ ahịhịa n'ụgbọ so ebute ọrịa Kansa ebe otu ndị na-arụpụta ya bụ ọgwụ, bụ Bayer na-agọ ụkwụ na aka.
Ndị ọrụubi, ọma akwa asahụ mara onwe ya o.
N'egwuruegwu
Ụmụ Naịjirịa asọmmpị na-adị mma arịọla otu Super Eagles ka ha tinye uchu na asọmmpị ha na ndị Seychelles, agbanyeghị na ha agaferela na otu ha dị ka ndị ga-eso zọọ iko mba Africa na bịanụ.
Ndị niile atụrụ anya ga-eso gbaa sọọ ya bụ mpị ezuola na ọgbọ egwuruegwu dị n'Asaba.