You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọgbaaghara eriela ndụ mmadụ atọ na Saụt Afrịka
Akụkọ ndị dị mkpa
Mmadụ atọ anwụọla na mba Saụt Afrịka taa dịka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe na Soweto maka ndị mbịara mbịara na-ere ngwa ahịa adịgboroja.
Ndị uweojii Saut Afrịka kwuru na ha anwụchiela mmadụ iri abụọ n'asaa ma na-eme nyocha ị chọta ihe malitere okwu a.
Akụkọ ọzọ na-ekwu na ọgbaghara bidoro mgbe onye na-azụ ahịa si mba Somalia gbagburu otu nwata nwoke chọrọ i zụ ya ohi.
Cheta na ude Saut Afrịka dere na mba Afịrka niile dịka ọgbaaghra yiri nke a mere n'afọ 2008.
Na Naịjirịa,
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ekwupụtala na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala na 2019.
O kwupụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ya na ndị ntorobia chọrọ ịzọ ọchịchị nwere taa bụ Tọọsde.
Ọzọ,
Ọgbakọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị ịcheịche bụ PACT n'ịchafụ ahọpụtala Fela Durotoye dịka onye ga-anọchịte anya ha n'ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019.
Ha kwuputara aha ya taa dịka ha mechara ntụliaka imeụlọ. Fela ekelela mmadụ niile jịkọrọ aka họpụta ya.
N'egwuregwu,
Onye na-echere Naịjirịa bọolụ bụ Francis Uzoho ekuputala ka obi di ya dịka o bidoro ọrụ ọhụrụ ya n'otu egwuregwu Elche na Spain.
Cheta na ọ cheburụ Deportvio La Coruna bọolụ tupu Elche anata ya na mbimbi.
Gee nkeji nke mgbede a
Akukọ ndị ga-amasị gị: