Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Buhari ekwela ndị Naija Delta nkwa pụrụ iche

Mgbe e biputara ya

Buhari ekwela ndị Niger Delta nkwa pụrụiche

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela ndị mpaghara Naịja Delta nkwa ileba anya n'iwu sị na a ga-akwụ ha pacentị iri na atọ n'ime ego nrite ndị Naịjirịa.

Buhari kwere nkwa a taa mgbe ndịisi ọdịnala obodo Isoko kpọtụrụ ya n'Aso Rock dị n'Abụja.

Rochas etinyela ego dị nde naịra iri abụọ n'isi ndị gburu onye APC

Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo steeti etinyela ego dị nde naịra iri abụọ n'isi ndị gburu onyeisi oche pati APC nke Ideato bụ Sunny Ejiagwu.

A gbagburu Ejiagwu n'abalí Tọọsde, abalị anọ ahọpụtarachara ya dịka onyeisi oche APC n'okpuru ọchịchị ideatọ.

Na mba ofesi:

Ụlọikpe mba Spen atụọla otu nwaanyị mkpọrọ afọ ise maka izopu nwa ya nwoke dị afọ abụọ ka nna ya ghara ịhụ ya.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mba Spen na otu ụmụnwaanyị akatọọla mkpebi ahụ ụlọikpe a.

N'egwuregwu:

Onye na-echere Naịjirịa nakwa Wolverhampton Wanderers bọọlụ bụ Carl Ikeme agbala arụkwaghím n'egwuregwu bọọlụ maka nsogbu ahụike ya.

Nke a ebutela ọtụtụ ozi ekele si n'aka ndị otu Super Eagles nakwa ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya.

Gee nkeji anyị nke abalị a

Lee ihe nkiri anyị;