Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ: Enugwu steeti amapụtala 400m iji rụọ ụzọ

Mgbe e biputara ya

Akụkọ ndị dị mkpa

Gọọmentị Enugu steeti amapụtala ihe karịrị naịra nde narị anọ iji hibe ngalaba dị icheiche na steeti ahụ

Ọrụ ndị a ga-amalite gụnyere ụzọ itoolu ọhụrụ n'ime steeti ahụ iji mee njem mfe ma kwụsịkwa ahịrị ụgbọala.

A na-anụ kepu kepu na taa bụ ụbọchị Atiku Abubakar bụ bu osote onyeisiala ga-ekwuputa na ọ ga-azọ ọkwa ọchịchị site n'otu PDP

Dịka o deputara n'akwụkwọ ozi, o okwuru na ihe oji pụta ịzọ ya bụ ọkwa bụ oku ụmụ Naịjirịa na-akpọ maka ị hazi akụnaụba obodo ma wepụtakwa ọrụ dị icheiche.

Osote onyeisial enyela iwu ka-eme mkpocha gwongworo n'ụzọ Oshodi-Apapa n'ime abalị atọ.

O kwuru nke a mgbe ọ bịara na Legọs hụ ọnọdụ ụzọ ahụ mere mkpọchi site n'ahiri ụgbọala. Ụfọdụ mmadụ tọrọ atọ n'ahiri ahụ kemgbe ehihie Fraide.

Ihe na-eme N'Afrịka,

Ndị uweojii n'obodo Galilee n'ọdịda anyanwụ Ethiopia anwụchiela otu onye amụma kwuru na ọ ga-esi n'ọnwụ kpolite otu nwoke nwuru anwụ ebe ahụ.

Getayaukal Ayele zigara ezinaụlọ onye ahụ ozi Lazarus nwụrụ na akwụkwọ nso tupu ha-ekwe ya gbalia ị kpọlite nwoke ahụ nwụrụ kemgbe abali anọ.

N'egwuregwu,

Naịjirịa, Igipt, Moroko, Tunisia na Senegal ga-enwe nzụkọ taa na ala Morocco iji chọpụta ihe mere eji gbapụ ha n'agba nke mbụ n'asọmpị ikombaụwa.

Ọ bụ ndị ọrụ ngalaba bọọlụ mba ndị a na ndị nkuzi otu egwuregwu ha ga-anọ na nzụkọ a.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: