You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Agha megide ndị oyiegwu ga-aga n'iru
Akụkọ dị mkpa: Okwu Buhari n'ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ebe taa bụ ncheta ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya, onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa na ọ gaghị ezu ike ma ọ bụrụ na agha ndị oyiegwu abịaghị na njedebe.
O jika ohere ahụ kele ndị agha Naịjirịa maka mbọ niile ha na-agba n'iluso ndị oyiegwu ọgụ.
Mpaghara ọwụwa anyanwụ,
Nzụkọ ndị otu AREWA agwaala Gọvanọ ndị steeti dị n'ọwụwa-anyanwụ ha hụ na ndị otu Ipob emeghị 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' ha chọrọ ime echi bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee.
Ndị ACF kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị gọvanọ a dọọ ndị Ipob aka na ntị maka na ihe a adịghị mma maka ndịnotu Naịjirịa.
N'akụkọ mba ofesi,
Roman Abramovich nwe otu egwuregwu bọọlụ Chelsea etozuola ị bụ nwaafọ mba Israel.
Abramovich ga-abụ ọgaranya kachasị na Israel ebe ndị mba Britain ekwebeghị ị mepụtara ya akwụkwọ njem ọhụrụ.
N'egwurewgu,
Liverpool ekwuola na onye ọgba bọọlụ Fabio Taharez eji Fabinho mara ejirila nde pounds iri atọ n'itoolu denye aha n'otu egwuregwu bọọlụ ha.
Fabinho bụ bu onye ọgba bọọlụ otu Monaco fc nke mba Monaco.
Gee nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe nkiri nke taa:
Akụkọ ga-amasị gị