You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
EFCC anwụchiela ndị Swiss Golden maka igwu ndị mmadụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:
Swiss Golden eruola njedebe
EFCC anatala ihe ruru naira nde narị abụọ na iri n'isii bụ ego ndị Swiss Golden ghọgbutere n'aka ụmụ mmadụ
Ha nwụchikwara ndị Naịjiria abụọ na otu onye Rọshịa na Lagos ma buru ha ga ba Kano maka nyocha zuru oke.
Dọkịta adigboroja na Legos
Ndị uweoji nwuchiri otu nwoke bụ dọkịta adịboroja na-edenye ndị mmadụ ọgwụ na Legos.
Nwoke ahụ bụ onye Borno steeti agụchaghị ụlọakwụkwọ Primarị. Ndị uweojii sị na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe.
N'egwuregwu,
Ndi nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Commonwealth emere na mba Australia, ga-alọghachite Naịjirịa n'ụtụtụ echi.
Ha ji ihe nrịta dị icheiche ruru iri abụọ na anọ alọta.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Facebook a ga-aga ụlọịkpe ọzọ?
Otu onye ọkaikpe n'obodo California ekpebiela ka Facebook ga-aga ụlọikpe maka ịjị teknụzụ a kpọrọ 'Facial Recognition' achọkọta akụkọ gbasara ndị mmadụ n'agwaghị ha
Facebook ekwuola na ha jụrụ nke a jụ ma na-ekwu n'onweghị iwu ha dara.
Nkeji ụtụtụ a:
Gere akụkọ nke ụtụtụ a:
Ihe nkịrị nke taa
Ihe onyonyo a gosiri ebe onye ọkpaọchị , Josh2funny, na-akọwa akaọrụ ya