You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'abalị a: Gọọmentị na-enyocha Cambridge Analytical
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a
Gọọmentị na-enyocha Cambridge Analytical
Gọọmenti etiti ekwuola na ha a mụpụtala otu kọmịtị ga-achọpụta ebụbọ eboro ụlọọrụ Cambridge Analytical maka izuputa akwụkwọ gosi ọnọdụ ahụ ike Mohammadụ Buhari omegidere iwu.
Ha kwuru na ezuputara akwụkwọ a oge gọọmentị Naịjirịa na-akwado ị me ntụlịaka nke 2015.
Ha kwukwara na ha ga-ewepu Cambridge Analytical ụlọ ikpe ma o bụrụ n'omume a megidere iwu.
SERAP adọọla gọọmenti aka n'ntị
Otu kpọrọ onwe ha Socio-Economics Rights and Accountability SERAP ekwuola na gọọmentị nke Mohammadu Buhari kwesiri ị kagbuo echiche na-ekwu na sọọsọ mmadụ ise bụ ndị zuru ego Naịjirịa.
SERAP kwuru na ọbụrụ n'ezie na gọọmentị a na-ebuso mpu na aghọghọ agha, na agaghị ekwu na sọọsọ mmadụ ise n'ime ndị ọchịchị bụ ndị zuru ego Naijiria.
Ụgbọmmịrị South Korea eruola Ghana
South Korea ezigala ụgbọmmịrị agha n'osimili no na mpaghara Ghana maka ndị otu ha ndị omekome tọọrọ na-ebe ahụ.
Ha na-ebokwa na ọ dịka ndị omekome a bụ ndị Naịjirịa.
Ha kwuru na ugbua, na ha jubeghị maka ego ntọhapụ ọbụla n'aka ha.
Na akụkọ egwuregwu
N'asọmpị Premier league agbara taa, Arsenal merị Stoke City ọkpụ ato na-asataghị otu.
Ọ bụ Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu abụọ.
Alexandre Lacazette nyere goolu nke ikpeazu, nke mere ya atọ.
N'asọmpị Chelsea na Tottenham Hotspur
Tottenham meriri ọkpụ atọ mana Chelsea sataha otu.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa