Etu ndị aghammiri si wakpoo ọdọ ndị ntọ n'Anambra steeti, gbuo ndị a sị bụ ndị ntọ iri

Mgbe e biputara ya

Ndị agha mmiri Naijiria ngalaba nke Ọnịcha awakpọola ọhịa Ụsham dị n'Anambara steeti, nwụchie ndị ntọ ise ma gbagbuo iri n'ime ha, ebe ndị ọzọ riri mbọmbọ ọsọ

Ndị ha nwụchiri gụnyere nwaanyị na-edowere ndị ntọ ahụ egbe nakwa onye nke na-enyere ha aka agba aja.

Otu onye okenye Obodo Ogwu-Aniọcha achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara na ọhịa Ụsham dị n'agbata obodo ha na Amambutu Uli dịkwa n'Anambra.

Onyeisi ndị aghammiri ahụ bụ Sulemaina Agabi kwuru nke a mgbe ọ na-egosi ọha ndị ha nwụchiri n'ogige ndị agha n'Ọnicha n'ụbọchị Fraide.

Agabi, onye gbara ama na ha jere ije ahụ n'ime ndeli, kwuru na ndị ntọ ahụ so na ndị tọọrọ eze ọdịnala obodo Ugwu Aniocha, Igwe Oliver Nnaji, bụ onye a tọọrọ n'ọnwa Novemba afọ 2021.

O kwuru na ndị ha nwuchiri ekwuola ihe ha ma maka ntọrị Igwe ahụ.

Man nwa Igwe bụ Ignatius Nnaji gwara BBC Igbo na-ekentị na kemgbe abalị 15 nke ọnwa Novemba a tọọrọ nna ya, na ha ahụbeghị ya nke ha na-enweta ozi ọbụla banyere ya.

"Onye ọbụla na-ekwu na a tọhapụla nna bụ asị bụ asị.

"Kemgbe Noverember 15 were ruo taa bụ Disemba 31, anyị anụbeghị olu ya mara ma ọ dị ndị ma ọ nwụrụ anwụ."

O kwukwara na ndị tọọrọ ya a kpọbaghị ha.