You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oprah Winfrey Prince Harry Meghan Markle: Ha kwuola ihe a sị si ekwula gbasara ụlọ eze England
Mgbe e biputara ya
Ajụjụ ọnụ Oprah Winfrey ,Harry nakwa Meghan Markle enwụrụla ọkụ n'elu intanet mba uwa dị iche iche.
Meghan na Harry kụwara ọtụtụ akụoyibo Nsugbe gbasara etu ha si nọdụ n'ụlọ eze England n'ihe onyonyo a ruru awa abụọ.
Lee ọkpụrụkpụ okwu si na ya bụ ajụjụ ọnụ Oprah Winfrey gbara ha pụta.
- Meghan kwuru na o nwere mgbe ọ dị ya ka ọ bụ ya were ndụ ya, nke o tinyere dịka " ọ dị m ka m nwụọ ugbua ugbua'
- O kwuru na otu onye ezinụlọ bee ụlọeze na-echekasị echiche maka etu ahụ nwa ya nwoke Archie si eji oji
- Harry kwuru na ya na nwunye na-agbachapụla ịnata ego n'aka ụlọeze mere ha ji achọ ka ha na Netflix na Spotify rụkọọ
- Meghan kwuru na ọ maghị ọtụtụ ihe maka ezinụlọ eze England tupu anụbata ya nke mere o ji gbagọjuo ya anya mgbe a sị ya kpọ isiala nye ezenwaanyị England.