You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalịa a: Ụmụaka 4 ọzọ apụtala n'ọgba Thailand
Akụkọ kachasị mkpa n'abalị a:
Abụbọ ọrụ
Ndị ọrụ Radio Nigeria Enugwu karịrị mmadụ otu narị emeela ngagharị iwe na gburugburu Enugwu iji gosi iwe ha ma kwuo na ha chọrọ nhazigharị ọnọdụ ha ji arụ ọrụ ma nyekwa gọọmentị izu ụka abụọ igbo mkpa ha.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị ọrụ FRCN agbanyụọla redio taa
N'aka ọzọ, ndị ọrụ Nigerian Labour Congress kwuru na ihe mere ha ji gbachie ụlọọrụ MTN na steeti dị iche iche, bụ maka na ụlọọrụ ahu adịghị eme ihe ha kwesịrị imere ndị ọrụ ha na Naịjirịa.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ihe NLC ji gbachie MTN na steeti dị icheiche
Akụkọ si mba ọzọ
Boris Johnson arituola n'ọkwa dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na ndị ọzọ nke bekee kpọrọ 'foreign' secretary'.
Akụkọ kwuru na ọ rituru ka e nwechara arụmụka gbasara atụmatụ mba Briten ga-esi mee Brexit.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Nritu Boris Johnson ebulitela okwu 'Brexit' elu
N'akụkọ ọzọ, a kpọpụtala ụmụaka asatọ so n'ime mmadụ iri na abụọ tọrọ n'ime ọgba na Thailand kamgbe izu abụọ.
N'egwuregwu
Mba Spen emeela Luis Enrique bụbu onye nchịkọta Barcelona, onye nchịkọta ha.
Enrique binyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka ọ chịkọta Spen afọ abụọ.
Cheta na Fernando Hierro kpọ Spen bịa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ a, rituru n'ọkwa dịka onye nchịkọta ha ụnyaahụ.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri nke taa
Ode akwụkwọ Chimamanda Adichie si na okwu na a na-emegide Igbo na Naịjirịa nwere eziokwu n'ime ya, mana ọpụpụ abụghị ihe ga-agwọ ya.