Johnny Depp Verdict: Ụlọikpe asịla Amber Heard kwụọ Johnny Depp $15m

Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe ekpebiela ka Amber Heard kwụọ Johnny Depp bụbu di ya nde dọla 15 ebe Depp ga-akwụ Heard nde dọla abụọ, dịka o meriri ya n'ụlọikpe.

Ụlọikpe kpebiri na Amber Heard dere akụkọ nkọtọ na mkparị (nke Bekee kpọọ libel) gbasara Depp ka ha gbasachara dịka di na nwunye.

N'ihi nke a ha kwuru ka ọ kwụọ Depp nde dọla iri ($10m) n'ụgwọ iti aka n'obi maka ihe ndị o mebiri nakwa nde dọla ise ($5m) dịka ntaramahụhụ.

Heard bụ ome ejije na Hollywood bu ụzọ kpụpụ Depp bụkwa ome ejije Hollywood n'ụlọikpe ebe o boro ya ebubo mmegbu oge ha bụ di na nwunye.

Ndị otu ikpe (jury) chọpụtara na Heard kọtọrọ Depp n'ezie n'akụkọ o deere ndị ụlọntaakụkọ Washington Post n'afọ 2018, ebe o kwuru na ọ bụ;

"Onye a ma ama na-anọchite anya ndị a megbu emegbu n'ime ụlọ", ma kpebie na ya bụ okwu Heard kwuru maka alụmdinanwunye ya bụ "ụgha", na e nweghi ihe akaebe ọbụla gosiri na o mere.

"Kwụọ Amber Heard nde dọla abụọ" - Ọkaikpe

Ụlọikpe kpebikwara ka Depp kwụọ Heard bụbu nwunye ya nde dọla abụọ maka ikwụtọ aha ya (nke Bekee kpọrọ defamation).

Ha kwuru na o kwutọrọ ya site n'aka ọkaiwu ya bụ Adam Waldman, ma kwuo na ya bụ nde dọla abụọ bụ naanị ego iti aka n'obi.

Amber kwuru na "mkpebi a mechuru m ihu nke bụ na ọ tụrụ m ọnụ" site n'ozi o zipụtara.

Ọ bịara ụlọikpe mgbe otu ikpe (jury) merela mkpebi n'okwu a ebe Depp nọ n'ụlọikpe e mee mkpebi a.

Ụlọikpe mechiri mkpesa n'okwu ikpe a n'izu gara aga dịka anya ụwa niile nọ na-ele ya bụ ikpe.

Ụlọikpe ahụ nụrụ mkpes asaa dịka ọtụtụ ndị aka ebe pụtara kwuo ihe ha ma mere mgbe Amber na Depp nọkọ.

Otu n'ime ndị aka ebe tinyere ọnụ bụ onye na-eyi akwa a ma ama bụ Kate Moss dịka ya na Depp yịburu n'ebe afọ 1990.

Johnny Depp v Amber Heard: Kedụ ihe na-ese?

John Depp gbara afọ 58 kpupụrụ Amber Heard ụlọikpe n'ọnụ ego dọla nde 50 maka akụkọ o dere banyere ya nke kwuru na Depp mekpara ya ahụ oge na nọ dịka di na nwunye.

Heard kpụpukwa Depp ụlọikpe n'ọnụ ego nde dọla 100.

E hibere otu ikpe mmadụ asaa kwesiri ịnụ mkpesa ha ma nwee nkwekọrịta n'okwu mpụtara ya bụ ikpe.

N'ọnwa Disember 2018 Heard dere akụkọ banyere Depp nye ụlọọrụ ntaakụkọ The Washington Post nke isi okwu ya bụ "Onye a ma ama na-anọchịte anya mwakpo na mmekpa ahụ"

O bokwara ya ọtụtụ ebubo maka mmekpa ahụ na mwakpo.

Depp ghọrọ na aka ya adighị n'ebubo ndị a.

Dịka Depp nwetere mmeri nke gosiri na aka ya dị ọcha, Heard ga-akwụ ya ụgwọ maka mmetọ aha ya.

Makwụkwa ya ụgwọ maka ihe ndị ikpe a mebiri ya nke gụnyere ọrụ ya dịka onye na-eme ejije.