WHO ekwuola na ịrụte ọrụ aka na-edula mmadụ 745,000 mmụọ kwa afọ dịka nchọpụta gosiri

Foto na-egosi onye na-arụte ọrụ aka

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ịrụte ọrụ aka na-egbu puku kwuru puku mmadụ kwa afọ, dịka ngalaba ahụike mbaụwa bụ "World Health Organization" (WHO) si kwuo.

Nchọpụta mbụ a na-eme n'ụwa gbasara ya gosiri na mmadụ 745,000 nwụrụ n'afọ 2016 site n'ọrịa mkpọnwụahụ nakwa ọrịa obi nke ịrụ ọrụ ọtụtụ awa butere.

Nchọpụta a gosiri na ihe a kacha emetụta ndị mmadụ bi na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ Eshia nakwa Ndịda-Anyanwụ Pasifik.

WHO kwuru na ihe a nwereike ịkawanye njọ n'ihi mkpamkpa coronavirus.

Nchọpụta a e mere gosiri na ịrụ ọrụ ihe ruru awa 55 maọbụ karịa n'otu izu butere mmadụ iji pasentị 35 (35%) nwee ike ibute ọrịa mkpọnwụ ahụ, ma jirikwa pasentị 17 (17%) nwee ike ime ka mmadụ si n'ọrịa obi nwụọ.

Foto na-egosi onye na-arụte ọrụ aka

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ iji tụnyere ịrụ ọrụ awa 35 ruo 40 n'otu izu.

Nchọpụta a nke ngalaba International Labour Organization (ILO) so mee, gosikwara na ihe ruru atọ n'ime anọ bụ mmadụ ole nwụrụ n'ihi ịrụ ọrụ ọtụtụ awa bụ ụmụnwoke katatụrụla ahụ maọbụ ndị merela okenye.

Ọtụtụ mgbe, ọnwụ ndị a na-abịa mgbe onye ahụ bitetụrụla ndụ, ụfọdụ oge mgbe ọtụtụ afọ gachara, karịa mgbe onye ahụ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ ahụ.

line

Akụkọ ga-amasị gị...

Aha onyonyo, Career Choice: Ọrụ Bekee na ịrụrụ onwe gị ọrụ, kedụ nke na-amasị gị?
line

Dịka nchọpụta a agụnyeghi oge mkpamkpa ọrịa coronavirus a, ndị ọrụ WHO kwuru na etu ọtụtụ ndị mmadụ si malite ịrụ ọrụ n'ebe ọbụla ha nọ karịa ịbata n'ụlọọrụ nakwa ndakpọ akụnaụba, nwereike iso n'etu ihe ize ndụ ịrụte ọrụ aka si arị elu.

"Anyị nwere ihe mgbaama gosiri na mgbe mba dị iche iche banyere na mgbachi obodo, awa ole e ji arụ ọrụ ji ihe ruru pasentị iri (10%) rịgoo," ka Frank Pega bụ onye ọrụ WHO kwuru.

Nchọpụta ahụ kwuru na ịrụ ọrụ ọtụtụ awa so bute ụfọdụ nrịanrịa si n'ịrụ ọrụ, nke mere ya nsogbu ọrịa si n'ọrụ kacha.

WHO na-atụ atụmatụ ka ndị isi ụlọọrụ buru nke a n'uche mgbe ha na-enyocha ihe ndị nwereike ibutere ndị na-arụrụ ha ọrụ nsogbu ahụike.

Pega kwuru sị na ikwu sị na 'ihe a bụ awa ole onye ga na-arụ' ga-abara ndị ọrụ uru dịka a hụrụ na ọ na-akwalite ntinye uchu n'ọrụ.

"Ọ bụ atụmatụ gosiri amamihe na ebulighi awa ole mmadụ ji arụ ọrụ n'oge akụnaụba ọtụtụ mba dị na nsogbu."

Aha onyonyo, May Day 2020: Lee ndị ọrụ nọ n'ihu agha Covid-19