Ụlọikpe atụọla mmadụ atọ nga maka ịkpaso Vinicius Jose Jr oke agbụrụ

Vinicius Jose Jr na-agbara ndị Real Madrid bọọlụ ka ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ Valencia mesoro omume ịkpa oke agbụrụ.
Nke a mere n’abalị 23 Mee 2023 n’ọgbọ egwuruegwu a kpọrọ Mestalla nke ndị Valencia.
Ka ihe ahụ mechara, La Liga kpọpụrụ mmadụ atọ ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ valencia ụlọikpe ebe a mara ha ikpe ma tụọ ha nga ọnwa asatọ.
Ụlọikpe machịrị mmadụ atọ ahụ ịbanye n’ọgbọ egwuruegwu nke La-liga maọbụ ebe ndị mba Spain na-agba bọọlụ rụọ afọ atọ, mana e mechara mee ya afọ abụọ.
Ndị wegara okwu ahụ n’ụlọikpe bụ Vinicius Jr La Liga na Spanish Football Federation (RFEF).
Onyeisioche La-Liga bụ Javier Tebas kwuru na ọ bụ ihe ga-enye aka ibuso ịkpa oke agbụrụ agha n’egwuruegwu bọọlụ ma nye aka iti Vinicius Jr aka n’obi.
Ọ gara n’ihu kọwaa na nke ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị dịịrị ndị na-aga n’ọgbọ egwuruegwu ịkpaarị ndị mmadụ.
“La-liga ga-achọta onye ị bụ, kpọpụ gị ụlọikpe maka ntaramahụhụ ga-eso ya”.
Ndị otu egwu bọọlụ Real Madrid kwuru na ha “ga ejisiike na-echekwa ihe njirimara ha, wepu ịkpa oke agbụrụ na ihe ịkpa oke ọbụla n’asọmpị bọolụ”.




