Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ha memilara ndị ntọ abụọ n'ime otu ji ụgbọala Keke EHM 542 XL eme ntọ n'okporoụzọ Obudi–Mgbala, nwere akara, ebe ndị otu ha ndị ọzọ bu apa mgbọ egbe gbalaga.
N'ozi mgbasaozi ha wepụtara ụbọchị Tuzde nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye binyere aka kwuru na ihe ndịuweojii napụtara ndị ntọ ahụ gụnyere egbe abụọ, mgbọ asaa, ekwentị abụọ nakwa ozu otu nwaanyị a mabeghị onye ọ bụ.
Ozi ahụ gara n'ihu gbaa ama na a dọnyela ozu ndị a nile n'ụlọzu dịka ndị uweojii na-aga n'ihu na nnyocha ha.
Etu nwoke gbapụru na nga si gbuo nwatanwanyị na Delta steeti
Ebe foto si, Harrison Gwamishu
Otu nwatanwaanyị anwụọla dịka otu ekperima si ụlomkpọro gbafuo wakporo ụlọ ebe o bi n'Agbọ dị na Delta Steeti izu ohi ma tọgbuo nwatanwaanyị ahụ.
Christabel Egedefe gbara afọ 26 zutere ọnwụ ya dịka Michael Ezenwai gbara afọ 30 wakporo ụlọ ebe nwatanwaanyị ahụ bi n'Agbọ, Delta steeti izu ohi.
Onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye bụ Harrison Gwambishu gbara BBC Igbo ama n'ekwentị kwuru na ọ bụ ka ekperima ahụ bụ onye sibu ụlọmkpọrọ gbapụta oge ngagharịiwe 'Endsars' gara ire ekwentị nwatanwaanyị ahụ, ka aka ndị uweojii kpara ya na nsonso a.
Ọ gara n'ihu kpọọ ndị uweojii oku ka ha nye ezinaụlọ nwatanwaanyị ahụ ikpe ziri ezi.
Akụkọ na-ekwu na aka nwaamadi ahụ so na ndị omekome a na-enyo gburu Uwa Omozuwa, nwata akwụkwọ mahadum Benin ahụ a wakporo ma gbuo afọ 2020 bụ ihe mere e ji jichie Ezenwai ahụ na Mkpọrọ Oko tupu ọ gbapụ ka ngagharịiwe Endars butere mgbaka ụfọdụ ụlọmkpọrọ n'ebe dị iche iche na Naijiria.
Dịka ọṅụ na-ekwuru ndị uweojii Delta state bụ Bright Edafe siri kwuo, Christabel Egedefe gzutere ọnwụ ya oge Michael Ezenwai bụ onye a na-enyo enyo gburu Christabel mgbe ọ na-achọ ịnara nwada ahụ ọgbatumtum ya.
Mkparịtaụka dị n’etiti mba Amerịka na Rọshịa banyere iweta udo na Yukren akpụọla afọ n’ala
Ebe foto si, Getty Images
Mkparịtaụka nwere awa ise dị n’etiti onyeisiala mba Rọshịa bụ
Vladimir Putin na onye nnọchiteanya onyeisiala mba Amerịka banyere iweta udo na
Yukren akpụọla afọ n’ala.
Ọnụ na-ekwuru Kremlin isiobodo mba Rọshịa kwuru na mkparịtaụka
ahụ e nwere na Moscow bụ nke gara nke ọma mana Rọshịa anabataghị atụmatụ e wepụtara.
Steve Witkoff na ọgọ ya nwoke Jared Kushner gara mkparịtaụka
ahụ iji weta udo n’agha ahụ dị n’etiti mba Rọshịa na Yukren . Mba Amerịka
ekwubeghị ihe ọbụla banyere mkparịtaụka ahụ.
Cheta na Onyeisiala Putin nọrọ n’ụbọchị Tuzde kwuo na ya
agaghị anabata atụmatụ ọhụrụ Kyive na Yurop wepụtara ma kwuo na ọ bụrụ na ya dị
njikere ma ọ bụrụ na Yurop chọrọ ịlụ ọgụ.
Mba Yukren na ndị nkwado na-arịọ mba Amerịka ka ha gbanweeatụmatụ
udo ha wepụtara nke mba Rọshịa nabatara.
Akụkọ kwuru na a gbanweela atụmatụ ahụ bụ nke e kwuru na ọ
ka baara mba Rọshịa uru ọtụtụ ugboro n’ime izuụka ole na ole gara aga.
Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde abalị atọ nke ọnwa Disemba, 2025 ma bụrụkwa ahịa Eke.
Zelensky ekwuola na ohere dị ugbua ịkwụsị agha Yukren na Rọshịa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Zelensky ekwuola na ohere dị ugbua ịkwụsị agha Yukren na Rọshịa
Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky na onye otu ya na
mba Ireland ga-enwe mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'oge na-adịghị anya.
O kwuru na ya na ndị otu mkparịtaụka Yukren na ndị ọchịchị
Amerịka kparịtara ụka gbasara atụmatụ udo nke Amerịka kwadoro.
"Ugbua karịa mgbe ọ bụla ọzọ, e nwere ohere ịkwụsị agha
a," ka Zelensky kwuru sị.
Mana ọ gara n’ihu kwuo o nwere ụfọdụ ihe e kwesịrị ime
banyere atụmatụ udo ahụ iji kwụsị agha.
Onye nnọchianya pụrụ iche nke Onyeisiala Trump bụ Steve
Witkoff, erutela na Moscow tupu oge ya na Onyeisiala Putin enwee mkparịtaụka
gbasara atụmatụ udo ahụ.
UK akatọọla igbu oge n’ibubata ihe enyemaka na Gaza
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Nwata nọ n'ebe obibi ndị Palestine a chụpụrụ na Deir al-Balah, n'etiti Gaza Strip na Nọvemba 25, 2025, dịka mmiri ozuzo na-agafe n'ụlọ ntu ahụ, ka agha na-aga n'ihu n'etiti Izrel na Hamas
Gọọmenti mba UK akatọla igbu oge n'ihe enyemaka ịbanye na Gaza
mgbe ibuga ihe karịrị ụlọikwuu otu puku na narị o zigara na Gaza were ihe karịrị
otu afọ iji rute mba ahụ.
Odeakwụkwọ mba ofesi ahụ ekwupụtakwala nchegbu ya na ihe enyemaka
ndị ọzọ nke UK kwadoro enwebeghị ike iru ndị bi na ya, n'agbanyeghị nkwekọrịta ịkwụsị
agha dị n'etiti Hamas na Izrel.
Yvette Cooper kwuru na ọnọdụ dị na Gaza ka dị njọ dịka ụlọọrụ
United Nations dọrọ aka na ntị na mmadụ otu nde na narị puku ise chọrọ ebe
obibi ngwa ngwa n'ihi oke mmiri ozuzo na-akawanye njọ na oke okpomọkụ na-abịa
tupu oge oyi.
Ụlọmgbasa ozi BBC agwaala gọọmenti Izrel ka ha zaa ajụjụ a.
Ụlọ ntu ndị ahụ - nke ezinụlọ dị mmadụ ise nwereike ibi
n'ime ya - ruru Gaza na Mọnde, a na-atụkwa anya na ndị ọzọ ga-abata n'izu a.
Gọvanọ Ademola Adeleke ekwuola ihe mere o ji pụọ na PDP
Ebe foto si, Gov. Ademola Adeleke / X
Nkọwa foto, Gọvanọ Ademola Adeleke
Gọvanọ Ademola
Adeleke na-achị Osun Steeti ekwuola na ya esila n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị
Peoples Democratic Party (PDP) pụọ.
Ademola Adeleke
jiri akara X soshal mịdịa nwere kwupụta nke a ma wepụta akwụkwọ o degara ndị
PDP n’abalị anọ nke ọnwa nọvemba 2025.
Ademola bụ
onye jiri otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ bụrụ onyeomweiwu na sịnet tupu ọ bụrụ gọvanọ
sị na ihe mere ya ji na-apụ bụ maka ọgbaaghara dị na out ha ugbua.
Edemede ahụ
bụ nke o degara onyeisioche wọọdụ 2, Sagba Abogunde, n’okpuru ọchịchị Ede Nọt,
Osun State ka ọ kwuru “maka nsogbu na ọgbaaghara na-ada banyere onye ga-abụ
onyeisioche na ndị ndu otu PDP na Naịjirịa, a na m apụ n’otu a ugbua”.
Ọ kenere otu
PDP maka inye ya ohere ịgara Naịjirịa ozi n’ọkwa dị icheiche dịka senetọ nakwa
gọvanọ.
Mana,
Adeleke ekwubeghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ ọ chọrọ ịbanye dịka o si na PDP pụọ.
Badaru Abubakar bụ mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa agbala arụkwaghịm
Ebe foto si, Bayo Onanugu / X
Nkọwa foto, Badaru Abubakar
Badaru Abubakar bụ mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa
arịtuola n’oche ma gbaa arụkwaghịm.
Dịka Bayo Onanugu bụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Naịjirịa
si kwuo sị na Badaru mere ka a mata nke a n’edemede o degara Onyeisiala Bola
Tinubu n’abalị nke mbụ n’ọnwa Desemba 2025.
Bayo kwuru na Onyeisiala nabatara akwụkwọ arụkwaghịm
ahụ ma kelee ya maka ọrụ niile ọ rụrụ Naịjirịa.
A na-atụ anya na Tinubu ga-akpọpụta ma gwa ndị Sịnet Naịjirịa
onye ga-anọchị ya.
Badaru Abubakar dị afọ iri isii na atọ bụbu gọvanọ chịrị
Jigawa steeti ugboro abụọ site n’afọ 2015 ruo n’afọ 2023.
Onyeisiala Bola Tinubu nyere ya ọkwa dịka mịnịsta
na-ahụ maka nchekwa n’Ọgọst 21, 2023.
Cheta na ọ na-agba arụkwaghịm dịka onyeisiala Bola
Tinubu tinyere ọnọdụ gbatagbata n’ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Ndị ozi pụrụiche mba Amerịka ga-ezute Onyeisiala mba Rọshịa maka ịkwụsị agha Yukren
Ebe foto si, EPA
Onyeisiala mba Rọahịa bụ Vladimir Putin ga-ezute onye ozi pụrụiche nke mba Amerịka bụ
Steve Witkoff n’obodo Moscow n’ụbọchị Tuzde, dịka isiụlọọrụ gọọmenti ‘White House’
nke Amerịka kwuru na ha na-atụ anya inwe nkwekọrịta maka nkwụsị agha Yukren.
N’otu aka
ahụ, a na-atụkwa anya na Jared Kushner bụ ọgọ nwoke Onyeisiala Donald Trump nke
Amerịka ga-eso na mkparịtaụka ahụ.
Ọgbakọ ahụ
na-abịa n’ime ụbọchị abụọ mba Amerịka na Yukren zutechara onwe ha ma nwee mkparịtaụka
nke Witkoff na Kushner so na ya, nke ga-edozi atụmatụ nkwekọrịta udo nke Amerịka
wepụtara e kwuru na mba Rọshịa nabatara.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwaara mkparịtaụka
ahụ dịka ihe “dị mma kwuo na e nwere ụfọdụ okwu ndị ọzọ siri ike e kwesiri ileba
anya.”
Mgbe ya na onyeisiala mba bụ Emmanuel Macron nwechara mkparịtaụka
n’ụbọchị Mọnde, Zelensky kwuru na ihe kachasị dị ha mkpa bụ Yukren ịkwụ onwe ya
dịka mba ma nwee nkwa nchekwa.
O kwuru na ihe gbasara okeala ka bụ okwu kachasị sir ike n’atụmatụ
udo ahụ dịka mba Rọshịa na-esi ọnwụ ka Yukren hapụrụ ha ụfọdụ okeala dị na
mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ nke ha ka ji.
Witkoff nwekwara mkparịtaụka n’etiti Praịm Mịnịsta mba Briten
bụ Keir Starmer, Zelensky nakwa onyeisi mkparịtaụka ọhụrụ nke mba Yukren bụ
Rustem Umerov ebe ndị ndu mba Yurop sonyere ha n’ọbaozi ịntanetị.
Igbpo mụrụ nze mụọ ọzọ!
Unu asaala chi? Anyị ji obiọma na-anabata gị n'ọbaozi BBC Igbo taa ma na-asị ka ụbọchị taa gaara gị nke ọma.
Biko buru oche gị bịa n'ọnyere n'ọgbakọ BBC Igbo dị iche iche maka ị gụrụ, ikiri nakwa igere akụkọ na-eme n'ụwa gbaa gburu gburu
Ndewo!
Ọrịa Ebola alaala na mba DR Kongo – Minista ahụike
Ebe foto si, Getty Images
Mba DR Kongo
ekwuola na ọrịa Ebola tiwapụrụ na mba ahụ ụbọchị iri itoolu gara aga alaala.
N’ụbọchị 4 Septemba
2025 ka e kwupụtara ntiwapụ ọrịa Ebola nke ugboro iri na isii na mpaghara Mweka
dị na mba DR Kongo.
Ka o sina dị, Minista
na-ahụ maka ahụike na mba ahụ bụ Dr Roger Samuel Kamba kwupụtara na ọrịa ahụ
alaala.
Oge ọ na-ekwu
okwu na Kinshasa, Minista ahụ kọwara nke a dịka “ezigbo ihe nnweta pụrụ iche
maka mba anyị na ndị na-agbakọrọ anyị aka.”
Mmadụ iri ise na
atọ butere ọrịa ahụ oge o tiwapụrụ, ebe mmadụ iri na otu bụ ndị na-edoghị anya
ma ha butere ya.
Ka ọ dị, mmadụ
iri atọ na anọ nwụrụ, ebe iri na itoolu ndị ọzọ nwetara onwe ha na mpaghara ahụike
isii dị na mba ahụ.
Ndị Kameruun na-eru uju dịka onye otu pati na-agba gọọmenti ụkwụ nwụrụ n'ụlọmkpọrọ
Ndị ọkaiwu na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Manidem ekwuola na
otu onye na-agba gọọmenti ụkwụ a ma ama na mba Kameruun bụ Anicet Ekane, anwụọla
n'ụlọmkpọrọ, ka ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ otu ọnwa e jidere ya.
Ekane so n'ime ndị isi otu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ ma bụrụkwa
otu onye na ndị kwadoro Issa Tchiroma Bakary na ntuliaka onyeisiala nke ụbọchị
iri na abụọ nke ọnwa Ọktoba 2025 ma kwuo na o meriri onye nọ n'ọkwa ọchịchị bụ
Paul Biya.
E jidere ụfọdụ n'ime ha n'isi obodo Douala ma buga ha n'isi
obodo Yaoundé.
Onye na-ekwuchitere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ gwara BBC na
Maazị Ekane nwụrụ n'ụtụtụ a n'ime ụlọọgwụ ndịagha.
“Anyị amaghị ihe ọ bụla gbasara ya... A kpọrọ nwunye ya ka ọ
bịa, mgbe ọ hụrụ onwe ya ebe ahụ, e bubatara ya ozu di ya,” ka o kwuru.
O kwukwara na ezinụlọ ahụ mechara buru ozu ahụ gaa ebe a
na-edebe ozu.
N'okwu ya, onye na-ekwuchitere mịnịstri nke nchekwa bụ Kaptịn
Cyrille Serge Atonfack kwuru na onye dị afọ iri asaa na anọ ahụ nwụrụ maka ọrịa.
Ogbunigwe mba Rọshịa egbuola mmadụ anọ na Yukren
Ebe foto si, Emergency Services Dnipropetrovsk
Dịka mba Amerịka na-agba mbọ ka agha Rọshịa na Yukren kwụsị,
ogbunigwe Rọshịa tụrụ Yukren egbuola mmadụ anọ.
Rọshịa wakporo Dnupro dị n’ọwụwa anyanwụ mba Yukren ma gbuo
mmadụ anọ ebe mmadụ iri anọ meruru ahụ.
Vidiyo dị n’ịntanet na-egosi nnukwu ọkụ na-agba n’ebe ahụ a wakporo,
ebe ụlọọrụ mgbasaozi na Yukren na-ekwu na ọ bụ n’ụlọọrụ, ụgbọala nakwa ụlọahịa
ndị mmadụ mebiri.
Mba Rọshịa kacha atụ ogbunigwe na mpaghara Dnipro kamgbe
Febuwarị 2022 agha ahụ bidoro.
A mara onye omeiwu Tulip Siddiq ikpe na Bangladesh
Ebe foto si, PA Media
Nkọwa foto, Onye omeiwu nọ na London gbara arụkwaghịm n'ọrụ gọọmenti na Jenụwarị iji zere "ihe ndọpụ uche" n'ihe gbasara njikọ ya na onye bụbu Praịm Minista Bangladesh bụ Sheikh Hasina.
A tụọla onye omeiwu Labour na onye bụbu minista Tulip Siddiq
ịga afọ abụọ na Bangladesh dịka e kpechara ya ikpe mgbe ọ nọghị ya maka ebubo
nrụrụaka.
E kwuru na ụlọikpe mara ya na mmadụ iri na isii ndị ọzọ
ikpe.
A mara ya ikpe maka ịmanye nwanne nne ya, Praịm Minista
Bangladesh a chụpụrụ bụ Sheikh Hasina, inweta ala maka ezinụlọ ya n'akụkụ isi
obodo Dhaka bụ ebubo nke o kwuru ọbụghị eziokwu.
Siddiq, onye bi na London, jụrụ ebubo ndị a ma na-egosikwa na
o nwereike ọ gaghị anọ n'ụlọmkpọrọ ahụ.
N'okwu ya, onye omeiwu Labour kwuru na usoro a "adịghị
mma ma bụrụkwa ihe ọchị site na mbido ruo na njedebe".
Onye omeiwu nọ na London gbara arụkwaghịm n'ọrụ gọọmenti na
Jenụwarị iji zere "ihe ndọpụ uche" n'ihe gbasara njikọ ya na onye bụbu
Praịm Minista Bangladesh bụ Sheikh Hasina.
Ndị ojiegbe atọrọla ụkọchukwu, nwunye ya na ọtụtụ ndị ọzọ n'ụlọụka na Kogi steeti
Aha onyonyo, 'Ihe anya m hụrụ n'ụlọụka ndị ojiegbe wakporo na Kogi steeti'
Ozi si Kogi
steeti na-ekwu na ndị ojiegbe gara tọrọ otu ụkọchukwu, nwunye ya na ndị ọzọ n’ụlọụka
n’ụbọchị Sonde.
A sị na
mkpamkpa ahụ kpara n’ụlọụka Cherubim na Seraphim dị n’Ejiba obodo dị n’okpuruochichi
Yagba na Kogi steeti.
Ndị mmadụ na-ekwu na ndị
ojiegbe ahụ bu ụzọ gbawa egbe agharaaghara nke mere ndị ụka ji bido na-agba ọsọ ndụ ha tupu ndị ojiegbe ejide ọtụtụ n'ime ha ma tọrọ ha.
Otu onye ọrụ
gọọmenti gwara BBC na ihe a bụ ihe mere eme mana ha ka na-achọ ịmara ihe ndị ọzọ
banyere ya.
Ọnụ
na-ekwuru gọọmenti Kogi steeti okwu bụ Kingsley Fanwo kwuru na gọọmenti na ndị ọrụ
nchekwa na-agba mbọ ijide ndị omekome ahụ.
N’okwu ya “ọ
bụ eziokwu, a gwara m na gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ ijide ndị
kpara mkpamkpa a”.Fanwo kwuru na “ndị omekome ndị ahụ mara na gọọmenti Kogi steeti ga-eme ihe ọbụla
iji chekwa ụmụamaala ha”.
Cheta na nsonso
a ka ndị ojiegbe tọrọ ụmụakwụkwọ karịrị narị atọ n’ụlọakwụkwọ Katọlịk dị na Naịja
steeti, a tókwara ọtụtụ ụmụakwụkwọ nwaanyị bi ebi n’ụlọakwụkwọ ha dị na Kebbi steeti, ma tọrọkwara ndị mmadụ n’ụlọụka na Kwara steeti.
Mmadụ 502 anwụọla n’idemmiri wakporo mba Indonesia
Ebe foto si, Getty Images
Ihe karịrị mmadụ 500 anwụọla ebe ọtụtụ narị ndị ọzọ merụrụ
ahụ n’idemmiri wakporo mba Indoneshịa n’izuụka gara aga.
Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị bi na mpaghara
Sumatra ebe e kwuru na ọtụtụ ndị idemmiri ahụ metụtara nọ ma na-enweghị nri,
mmiri nakwa ihe ndị e ji enyere ndụ aka.
Idemmiri ‘Cyclone Senyar’ kpara mkpamkpa na Indoneshịa ma
mebie ọtụtụ ụlọ obibi na ụgbọala.
Nnukwu mmiri ozuzo zoro n amba Taịland, Maleshịa, Filipins
nakwa Sri Lanka nke metụtara ọtụtụ mmadụ ma gbuo ihe ruru mmadụ 900 na mpaghara
Eshịa niile n’ọnwa Nọvemba 2025.
Ebe foto si, Getty Images
Ebe foto si, Getty Images
Ụtụtụ ọma ndị ọma
Anyị jị obi ọcha anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ọnwa ọhụrụ a bụ Disemba.
Ọfọ anyị n'isi gị na ezinaụlọ bụ ka chukwu okike abịama ga-emezuru gụ ihe ọma niile i bu n'obi dịka tupu afọ a abịa na njedebe.
Sonyere anyị dịka anyị na-ewetara akụkọ niile si Afrịka na mbaụwa gbaa gburugburu.