Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ọkụ gbara n'ụlọ oringo dị na mba India ataala isi mmadụ 25

    Ndị mmadụ na ndị uweojii kwụcha n'ihu ụlọ oringo ebe ọkụ gbagburu mmadụ iri abụọ na ise

    Ọkụ gbara n’ụlọ ebe a na-agba oringo a ma ama dị na mpaghara obodo Goa nke mba India egbuola mmadu iri abụọ na ise dịka ndị ọrụ obodo si kwuo.

    Ọtụtụ ndị nke metụtara bụ ndị ọrụ ụlọ oringo ahụ a kpọrọ ‘Birch by Romeo Lane nightclub’, nke dị n’ọnụ mmiri a ma ama. Ndị bịara njem nlereanya sokwa na ndị nwụrụ anwụ.

    Ndị uweojii kwuru na udummanụ gaasị gbawara n’usekwu ụlọ oringo ahụ, nke mere nnukwu ọkụ jiri malite ịgba n’ebe ahụ n’etiti abalị Satọde.

    N’ụtụtụ Sọnde, onye ọrụ gọọmenti kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ esila na mmadụ iri abụọ na atọ gbagoo elu. Ndị hụrụ ka ihe a si mee gwara BBC na ọkụ gbara n’ụlọ oringp ahụ bụ ihe nkụja.

    “Ọkụ ahụ kachasị agba na gburu gburu usekwu n’ala,” nke bụ ihe Alok Kumar, onyeisi ndị uweojii kwuru.

    Ọtụtụ ozu ndị a hụrụ bụ n’akụkụ usekwu “nke gosiri na ndị ahụ bụ ndị ọrụ ụlọ oringo ahụ”, ka Maazị Alok Kumar gbakwụnyere.

    Onye mịnịsta obodo Goa bụ Pramod Sawant gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ atọ nwụrụ na mmerụ ahụ ọkụ gbara ha ebe ndị ọzọ nwụrụ site n’ikuku anwụrụọkụ kochiri ha ime na anya.

    O kwuru na mmadụ anọ bịara njem nlereanya nwụrụ anwụ mana ọ kọwaghị mba ha si maọbụ mmadụ ole ha dị.

    Ndị mmadụ jupụtara n’ụlọ Oringo ahụ maka na ọ na onye ngwakọta egwu nke Bollywood a ma na-eti egwu ebe ahụ.

    Mpaghara ebe ọkụ ahụ gbara bụ ebe e nwere ọtụtụ mkpori ndụ n’oge abalị.

  2. Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!

    Anyị ji obi dị ọcha na-anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị ụka a.

    Ekpere anyị bụ ka aṅụrị ụbọchị taa zuoro gị na ezinaụlọ gị oke.

    Biko, buru oche gị bịa nọnyere anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  3. Oluwaseun Adekoya: A tụọla nwaafọ Naịjirịa nga afọ 20 n'Amerịka maka igwu ụlọakụ chandum

    FBI

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe mba Amerịka atụọla otu nwaafọ Naịjirịa mkpọrọ maka igwu ụlọakụ chandum nakwa izupụ ego (money laundering) tinyekwara iji aha mmadụ dị iche iche akpa mkpamkpa n'Amerịka.

    A mara Oluwaseun Adekoya, a ma dịka 'Sammy LaBanco' gbara afọ 40 onye bi na Cliffside Park, New Jersey, ikpe maka igwu ụlọakụ chadum, ịkpa nkata izupụ akatamkpo ego nakwa izu njirimara mmadụ itoolu, ma tụọ ya mkpọrọ afọ 20.

    Adekoya bụ nwa afọ Naịjirịa nwetara ikike igwunye n'Amerịka n'afọ 2004.

    Ntaramahụhụ ndị ọzọ so amamikpe ahụ gụnyere na ọ ga-akwụghachi ego dị nde dọla abụọ na ụma abụọ, nakwa ibughachi ya ala nna ya ma oge ya gwụ na mkpọrọ.

    N'ikpe ahụ nke e kpere ya izuụka atọ, Ọkaikpe John A. Sarcone III nakwa onye uweojii nzuzo 'Federal Bureau of Investigation' (FBI) bụ Craig L. Tremaroli, gbara ama na Adekoya si n'ụlọ ya enweta akara pụrụ iche a kpọrọ 'Social Security Numbers', akara ọbaego ha n'ụlọakụ, were ya nyefee ndị otu ya bụ nke ha ji adọrọ ego ndị mmacụ n'ụlọakụ.

    N'ikpe ya, Ọkaikpe Mae A. D’Agostino kwuru na Adekoya bụ "onye ohi tara nchara", na "onye mmebi iwu eleghi anya n'azụ" bụ onye na-ezu njirimara ndị mmadụ ma na-egwu ndị mmadụ chandum malite n'afọ 2008 ka ọ dị afọ 22."

    "E nyere Oluwaseun Adekoya ohere ibi n'Amerịka, mana o zuru njirimara ndị Amerịka aka ha dị ọcha iji na-ekpori ndụ , na-enweghị ntụgharị obi ọbụla."

    FBI malitere inyocha Adekọya n'afọ 2022 dịka a chọpụtara na e ji aha mmadụ dị iche iche adọrọ ego n'ụlọakụ Broadview Federal Credit Union (bụbu CAP COM Federal Credit Union na State Employees Federal Credit Union (SEFCU)), dị n'Albany.

    Nnyocha ha gbapuru Adekoya na mmadụ 13 ndi ọzọ ya na ya na-arụkọ, nke mere ka a nwuchie ya n'ọnwa Disemba n'afọ 2023.

    FBI nwetara elekere aka 'Rolex watches', akpụkpọụkwụ nakwa akpa oke ọnụahịa, nakwa ego dị puku dọla iri abụọ na isii.

  4. A gbagbuola mmadụ 11 na mgbọ a kwara na Saụt Afrịka

    Ụgbọala ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    A gbagbuola opekatampe mmadụ 11 dịka a kwara mgbọ n'otu ebe obibi na mba Saụt Afrika.

    Mmadụ 14 merụrụ ahụ dịka ụmụnwoke bu egbe wakporo otu ebe n'obodo Saulsville dị n'Ọdịda Anyanwụ Pretoria, n'ụtụtụ taa bụ Satọde.

    Otu nwatakịrị dị afọ atọ so na ndị nwụrụ anwụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Athlenda Mathe sịrí, "Opekatampe mmadụ atọ bu egbe batara n'ụlọ obibi a ebe ndị mmadụ nọ na-aṅụ mmanya, ma gbakasịwa egbe."

    A maghị ihe mere e ji gbaa egbe ahụ, o nwebeghịkwanụ onye a nwuchiri.

    Mgbọ a ha kwara bụ nke mere n'ikpeazụ a dịka ịkwa mgbọ na-akpọtụ na mba ahụ mpụ na-arị ibe ya elu na nsonso a.

  5. Akpabio agbaala Natasha-Akpoti Uduaghan akwụkwọ n’ọnụego ijeri N200

    Akpabio agbaala Natasha-Akpoti Uduaghan akwụkwọ n’ọnụego ijeri N200

    Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio, Natasha Akpoti-Uduaghan/Facebook

    Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa bụ Godswill Akpabio agbaala akwụkwọ ọhụrụ n’ụlọikpe megide Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchite anya Kogi Central n’ụlọomeiwu ahụ.

    Nke a dị n’ozi Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan bipụtara n’akara ọbaozi Facebook ya n’ụbọchị Fraịde 5 Disemba, 2025.

    Natasha Uduaghan kwuru na ya natara ozi n’ụbọchị Fraịde 5 Disemba gbasara akwụkwọ ọhụrụ ahụ Akpabio gbara megide ya.

    O kwuru na Akpabio gbara ya akwụkwọ n’ọnụego narị ijeri naịra abụọ (N200bn) maka ebubo nkwutọ kwuru na ọ na-emekpa ya ahụ ka ha nwee aramara.

    Akpabio agbaala Natasha-Akpoti Uduaghan akwụkwọ n’ọnụego ijeri N200

    Ebe foto si, Natasha Akpoti-Uduaghan/Facebook

    “Ugbua obi atọọla m ụtọ na Sịnetọ Akpabio welitere okwu a, maka na Kọmitii Ụlọomeiwu Sịnetị na-ahụ maka Iwu na Usoro jụrụ inye m ohere ka m kọwaa onwe m gbasara okwu a, maka na nwunye Akpabio agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe megide m n’ihi ya,” ka Uduaghan dere.

    Natasha Akpoti-Uduaghan sịrị: “enweela m ohere ugbua igosipụta etu e siri mekpaa m ahụ inwe aramara, nakwa etu ọjụjụ m jụrụ si butere m ọtụtụ mkpagbu”.

    “Akpabio, ka anyị hụzie n’ụlọikpe,” ka Natasha jiri chịkọta okwu ya.

  6. DSS anwuchiela dọkịta a na-ebo ebubo ibugara ndị ntọrị ọgwụ na Kwara steeti

    DSS anwuchiela dọkịta a na-ebo ebubo ibugara ndị ntọrị ọgwụ na Kwara steeti

    Ebe foto si, DSS/X, Getty Images

    Ndị ọrụ nchekwa Department of State Service (DSS) kwuru na ha anwuchiela onye dọkịta a na-ebo ebubo na o si Sokoto na-ebugara ndị ntọrị ọgwụ n’ufọdụ akụkụ Kwara steeti.

    Nke a dị n’ozi odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Kwara steeti bụ Rafiu Ajakaye kesara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Fraịde 5 Disemba, 2025.

    Ajakaye kwuru na a nwuchiri dọkịta ahụ na mpaghara Jebba site n’ozi e nwetara gbasara ndị ntọrị ahụ na ndị na-ebugara ha ngwaahịa.

    O kwuru na ọ dị ka ndị omekome ahụ chọrọ ezi nlekọta ahụike, n’ihi ọtụtụ mgbọ egbe tụtara ha oge ha na ndị nchekwa gbarịtara onwe ha egbe.

    Ozi anyị hụrụ n’akara ọbaozi Ajakaye kwuru na “a na-akpọ oku ka a kwalitekwuo nchekwa gburugburu ụlọahụike ndị nọ n’akụkụ ọhịa.”

  7. Agha okeala adaala n’etiti Pakịstan na Afganịstan

    Agha okeala adaala n’etiti Pakịstan na Afganịstan

    Ebe foto si, Getty Images

    Agha ọjọọ ọhụrụ adaala n’etiti mba Pakịstan na ndị otu Talịban nke mba Afganịstan, dịka mba abụọ ahụ na-eborịta onwe ha ebubo imebi nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Ndị mmadụ ji abalị gbapụ n’obodo Spin Boldak nke mba Afganịstan, bụ nke nọ n’okeala dị 2,574km jikọtara mba abụọ ahụ.

    Otu onye ọrụ ahụike n’obodo Kandahar gwara BBC Pashto na otu ụlọọgwụ dị n’obodo ahụ enwetala ozu mmadụ anọ.

    E nwetakwara ozi na mmadụ atọ merụrụ ahụ na Pakịstan.

    Agha etiwapụla ugboro ugboro n’etiti mba abụọ ahụ na nso nso a, dịka Gọọmenti Talịban nke mba Afganịstan boro Pakịstan ebubo isi n’elu ebu agha na mba ahụ.

  8. Ndị nwe mmadụ, unu asaala chi?, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo

    Obi sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Nkwọ 6 Disemba, 2025.

    Ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị n'ụtụtụ a tupu Uche Akolisa eburu oche n'oge ehihie.

    Naanị gaa n'ihu sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  9. Aka akparala nwaanyị rere nwaodibo ọkụ n'otele

    Juliet Igwe

    Ebe foto si, NPF

    Nkọwa foto, Juliet Igwe rere nwata ya na ya bi dị afọ isii ọkụ 'candle' n'otele, wụọ ya mmiri ọkụ n'aka maka iwere anụ n'ite

    Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwaanyị maka ebubo iji ọkụ mpanaka ree nwatakịrị ya na ya bi ọkụ n'otele maka ebubo izu ohi n'Owere ,Imo Steeti na nsonso a.

    Oriaku Juliet Igwe gbara afọ 38 rere nwatakịrị odibo ya (anyị achọghị ịkpọ aha ya) gbara afọ isii ọkụ n'otele, ma wụọ ya mmiri ọkụ n'aka maka ebubo na o zuru anụ dị n'ite.

    Oge a gbara ya ajụjụọnụ, Oriaku Igwe kwetara na ya merụ mere ya bụ ihe mana o kwuru na ya amataghị n'oku mpanaka na mmiri ọkụ ahụ ga-eru nwata ahụ nnukwu ahụ.

    Ọ gara n'ihu boo ebubo na nwata ahụ zuru anụ dị n'ite ya nke mere ya jiri taa ya ahụhụ ahụ iji kuziri ya ka ọ ghara ime ya ọzọ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bu Henry Okoye si kwuo, ndị uweojii steeti ahụ ga-aga n'ihu na nnyocha ha banyere okwu ahụ.

  10. Netflix chọrọ ịzụ Warner Bros $72 bn

    Netflix na Warner Bros

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-eme ihe onyonyo n'intanet bụ 'Netflix' ekwetala ịzụ ụlọọrụ aka ochie n' ime ihe onyonyo a ma ama n'ụwa bụ 'Warner Bros Discovery', ijeri dọla iri asaa( $72bn (£54bn).

    Netflix kụpụrụ ụlọọrụ dịka 'Comcast' na 'Paramount Skydance' iji zọta ohere ịbụ onye ga-azụtali Warner Bros.

    Cheta na ọ bụ Warner Bros nwe ihe onyonyo 'Harry Potter' nakwa 'Game of Thrones' nakwa 'HBO Max'.

    A na-eche na ọzụzụ Netflix ga-azụ Warner Bros ga-eme Netflix 'odogwu karịrị odogwu' n'okwu ime obi ụtọ n'ụwa.

    Mana a ka na-ele anya ka ndị ọ dị n'aka na gọọmentị binye aka na nnweghara Warner Bros tupu okwu enwee isi.

  11. Onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steeti na ndị omeiwu 16 abanyela APC

    Onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steeti bụ Martin Amaewhule

    Ebe foto si, Rivers State House of Assembly

    Onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steeti bụ Martin Amaewhule na ndị omeiwu iri na isii ndị ọzọ ahapụla pati PDP ma banye pati All Progressives Congress (APC).

    Amaewhule bụ onye na-anọchiteanya Obio-Akpor na ndị omeiwu ndị ọzọ ahụ kwuru na ihe mere ha ji hapụ pati PDP bụ maka esemokwu na adịghị n’otu dị na pati ahụ ugbua.

    Ha kwuru na ha kwenyere na pati APC bụ pati ga-enyere ha aka iweta ezi nnọchiteanya nye ndị mpaghara dị iche iche ha na-anọchiteanya ha n’ụlọomeiwu ahụ.

    Aha ndị omeiwu ndị ọzọ ahụ banyere APC gụnyere osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Dumle Maol na-anọchiteanya Gokana, Major Jack (Akuku-Toru), Linda Stewart (Okrika), Franklin Nwabochi (Ogba/Egbema/Ndoni), Azeru Opara (Port Harcourt 3), Smart Adoki (Port Harcourt 2), Enemi George (Asari-Toru 2) na Solomon Wami (Port Harcourt 1).

    Ndị ọzọ bụ Igwe Aforji (Eleme), Tekena Wellington (Asari-Toru 1), Looloo Opuende (Akuku-Toru 2), Peter Abbey (Degema), Arnold Dennis (Ogu/Bolo), Chimezie Nwankwo (Etche), Gerald Oforji (Oyigbo) na Ofiks Kabang (Andoni).

    Ka ọ dị ugbua pati APC nwere ndị omeiwu 17 ebe PDP nwere naanị ndị omeiwu 10 n’ụlọomeiwu steeti ahụ.

    Foto ndị omeiwu ahụ banyere APC
  12. Ndị uweojii anwchiela mmadụ ise a na-enyo enyo maka iji egbe ezu ohi na ime mpụ n’Enugwu Steeti

    Ndị uweojii awụchiela mmadụ ise a na-enyo enyo maka iji egbe ezu ohi na ime mpụ n’Enugwu Steeti

    Ebe foto si, PPRO Enugu Police Command

    Nkọwa foto, Ndị uweojii awụchiela mmadụ ise a na-enyo enyo maka iji egbe ezu ohi na ime mpụ n’Enugwu Steeti

    Ndị ọrụ uweojii kwuru na ha ejideela mmadụ ise a na-enyo enyo na ha bụ ndị ojiegbe ezu ohi na ndị omekome na-atọrọ mmadụ site n’usoro bekee kpọrọ “one chance” na Enugwu steeti.

    Ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ wepụtara kwuru na nnyocha ndị uweojii mere gosịrị na ihe ndị a mere n’ụbọchị 22 Nọvemba na abalị mbụ nke ọnwa Disemba 2025.

    Daniel Ndukwe kwuru na ndị a na-enyo enyo gụnyere Ikechukwu Patrick dị afọ iri na itoolu Odoh David dị afọ iri abụọ na otu, Izuchukwu Ogbodo dị afọ iri atọ na asaa, Charles Ekenechukwu Egwuatu dị afọ iri atọ na itoolu na Justina Dike bụ nwata nwaanyị di afọ iri atọ na asaa.

    Ndukwe kwuru na ihe ngosi ndị e nwetara n'aka ha gụnyere egbe, ụgbọala keke na pepe anọ e zuru ezu, mma mkpa, ọtụtụ igodo na ọtụtụ kaadị ekwe ntị.

    O kwuru na Patrick na Odoh bụ ndị ha buru ụzọ nwụchie, kwetara na ha so n’otu a na-akpọ Supreme Vikings Confraternity ma kweta na ihe ndị a napụtara ha bụ ihe ha ji ezu ohi.

    Ndukwe gara n’ihu kwuo na nkwupụta mmadụ abụọ ahụ mere ka ha jide Izuchukwu Ogbodo, onye e si n'aka ya nweta igodo isii na kaadị ekwe ntị ise.

    O kwukwara na nwata nwaanyị ahụ aha bụ Justina so n’ime ha kwetara na ya na Charles na Odoh so na-arụ ọrụ iji ụgbọala tọrọ ndị njem, na-ekweta na ya na-azụ ọgwụ ike na New Garriki, ebe ọ na-edobe ihe ndị e zuru.

    Ndukwe kwuru na ha ga-akpụpụ ndị ahụ a na-enyo enyo n'ụlọikpe mgbe emechara nnyocha.

  13. Ndị isi Rụwanda na DR Kongo ebinyela aka na nkwekọrịta udo nke Donald Trump haziri

    Ndị isi Rụwanda na DR Kongo ebinyeela aka na nkwekọrịta udo nke Donald Trump haziri

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị isi Rụwanda na DR Kongo ebinyeela aka na nkwekọrịta udo nke Donald Trump haziri

    Ndị isi mba Democratic Republic of Kongo na Rụwanda ebinyela aka na nkwekọrịta udo nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump haziri na Washington

    Onyeisiala DR Kongo bụ Felix Tshisekedi na onye ogbe ya na Rụwanda bụ Paul Kagame, toro nkwekọrịta a, nke ebumnobi ịkwụsị esemokwu dị ogologo afọ na mpaghara ahụ.

    Kagame kọwara Trump dịka onye ndu "kwụbara aka ya ọtọ" nke "jiri ohere ahụ" mee ihe iji weta udo.

    Cheta na ndị minista mba ofesi nke mba abụọ ahụ binyere aka na nkwekọrịta n’ọnwa Juun 2025, mana mba abụọ boro ibe ya ebubo imebi iwu ndị ahụ.

    Tupu nzukọ ahụ amalite, ọgụ na-aga n’ihu na mpaghara ọwụwa anyanwụ DR Kongo nke bara ọgaranya n'ihe onwunwe n'etiti ndịagha gọọmenti na ndị nnupụisi a na-ekwu na Rụwanda na-akwado.

    Trump kwukwara na mba Amerịka na-ebinye aka na nkwekọrịta nke ya na mba abụọ ahụ nke ga-ewepụta ohere ọhụrụ iji nweta ihe ndị dị mkpa.

    Paul Kagame kọwara Trump dịka onye ndu "nwere aka ziri ezi" nke "jiri ohere ahụ" mee ihe iji weta udo.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Paul Kagame kọwara Trump dịka onye ndu "nwere aka ziri ezi" nke "jiri ohere ahụ" mee ihe iji weta udo.
  14. Putin ekwuola na Rọshịa ga-ejiike weghaara Donbas ma ọ bụru na ndịagha Yukren apụghị na mpaghara ahụ

    Cheta na Mọsko na-achịkwa ihe dịka pasent 85 nke mpaghara Donbas.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na Mọsko na-achịkwa ihe dịka pasent 85 nke mpaghara Donbas.

    Onyeisiala Vladimir Putin adọọla aka na ntị ọzọ na ndịagha Yukren ga-apụrịrị na mpaghara Donbas nke ọwụwa anyanwụ Yukren ma ọ bụghị ya, Rọshịa ga-ejiike weghaara ya, ma na-ajụkwa nkwekọrịta ọ bụla gbasara etu esi akwụsị agha na Yukren.

    "Anyị ga-ejiike anapụta okeala ndị a, ma ọ bụghị ya, ndịagha Yukren ga-apụ n'okeala ndị a," ka ọ gwara ụlọmgbasa ozi India Today.

    Cheta na Mọsko na-achịkwa ihe dịka pasent 85 nke mpaghara Donbas.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ya agaghị enyefee ikike ala ahụ.

    Okwu Putin bịara mgbe Donald Trump kwuru na ndị ya na ha na-akparịtaụka gbasara atụmatụ udo nke mba Amerịka kwenyere na onye ndu Rọshịa "ga-achọ ịkwụsị agha ahụ" mgbe mkparịtaụka ha na Mọsko nke ụbọchị Tuzde gasịrị.

    Mana onye nnọchianya Trump bụ Steve Witkoff, nọ na Mọsko, ga-ezutekwa ndị otu mba Yukren na Florida.

  15. Ụtụtụ ọma ndị be anyị.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 5 Disemba, 2025.

    Ka udo chịa na ndụ anyị niile taa.

    Nonyere anyị dịka anyị ga na-ewetara gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara Facebook, Instagram nakwa Watsapp Chanelụ anyị maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Ya gazie!

  16. Ndị omokome agbaala ọdọ mmanụ ụgbọala Echemas n'Ebonyi steeti ọkụ

    Ọdọ mmanụ ụgbọala Echemas a gbara ọkụ n'Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Ndị omekome agbaala ọdọ mmanụ ụgbọala ụlọọrụ Echemas dị n'Ebonyi steeti ọkụ ma gbalaga.

    Akụkọ kwuru na mkpa mkpa mebiri ọtụtụ ihe ọnụ ego ya gbara ọkpụrụkpụ. Onye hụrụ oge ihe mere gwara BBC Igbo etu ndị omekome si bịa gbakasịa ebe niile tupu ha amụnye ya ọkụ.

    Ụgbọala  gbara ọkụ n'ọdọ mmanụ ụgbọala Echemas n'Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    N'oge a kpọtụrụ Joshua Ukandu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ, o kwuru na ndị omekome ahụ ji mma wakpo ndị na-ere mmanụ ụgbọala n'ụlọọrụ ahụ.

    O kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha banyere ihe mere ma nwụchie ndị ọ bụ ha kpara ajọ agwa ahụ.

  17. Ihe mere Onyeisiala Putin ji mee njem mba Ịndia

    Onyeisiala Putin mba Rọshịa na Praịm Mịnịsta mba Ịndia Narendra Modi

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin amalitela njem abalị abụọ n amba Ịndia ebe ọ ga-ezute Praịm Mịnịsta Narendra Modi mba Ịndia ma sonye n’ọgbakọ mba abụọ ahụ na-enwe kwa afọ.

    Akụkọ kwuru na a na-atụ anya na mba Ịndia na Rọshịa ga-ebinyeaka na nkwekọrịta dị iche iche. Njem ya na-abịa dịka mba Amerịka na-akwanye ọkụ ka mba Ịndia kwụsị ịzụ mmanụ agbidi n’aka Rọshịa.

    Nke a na-abịa dịka mba Amerịka na Rọshịa na-enwe mkparịtaụka banyere agha dị n’etiti ha n amba Yukren.

    Ịndia na Rọshịa na-enwe mmekọ kemgbe ọtụtụ afọ gara aga mana ajụjụ juru ọtụtụ mmadụ ọnụ bụ kedụ uru mba abụọ a baara onwe ha.

    Ụfọdụ kwuru na mba Ịndia nwere ọnụọgụgụ mmadụ ruru otu ijeri, nke mba Rọshị na-ahụta dịka ihe ga-abara ha uru na-abịa n’ihe gbasara azụmahịa.

  18. Mmadụ abụọ anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ mere n’Enugwu - FRSC

    FRSC ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’Enugwu

    Ebe foto si, FRSC/Facebook

    Nkọwa foto, FRSC ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’Enugwu

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọala n’okporoụzọ bụ Federal Road Safety Commission (FRSC) ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede mere ụnyiahụ bụ abalị atọ nke ọnwa Disemba n’ụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt.

    Onyeisi ndị ụlọọrụ FRSC dị n’Enugwu bụ Maazị Franklin Agbakoba kọọrọ ndị ntaakụkọ na ọ bụ ụgbọala iri na otu kụkọrọ isi wee metụta ndị njem ruru iri atọ n’ọnụọgụgụ.

    O kwuru na ọtụtụ n’ime ha nwere nuukwu mmeru ahụ mana naanị mmadụ abụọ nwụrụ n’ebe ahụ.

    Mkpa mkpa ahụ mere n’ogige Gariki ọhụrụ dị na ụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt.

    Ha kwuru na ụgbọala nwere mberede ahụ gụnyere ụgbọala na-ebu aja bụ ‘Tipper’, gwongworo anọ, ụgbọala trailer abụọ, ụgbọala Sienna, bọs Hiace, obere bọs na ụgbọala Jeep.

    Agbakoba kọwara na ha gbatara ngwa ngwa nke mere na ha zọpụtara ọtụtụ ndị mmadụ ihe mberede ahụ metụtara.

    FRSC ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’Enugwu
    Nkọwa foto, FRSC ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’Enugwu
  19. Trump ga-ahụ maka ibinye aka na nkwekọrịta udo n'etiti DR Kongo na Rụwanda

    Ndịagha Kongo na-alụso ndị otu nnupụisi ọgụ mba ahụ ruo ọtụtụ afọ

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha Kongo na-alụso ndị otu nnupụisi ọgụ mba ahụ ruo ọtụtụ afọ

    Ndị isi mba Democratic Republic of Kongo na Rụwanda ga-ebinye aka na nkwekọrịta udo nke ebumnuche ya bụ ịkwụsị esemokwu ogologo oge na mpaghara ahụ na nzukọ nke Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump haziri na Washington.

    Tupu nzukọ ahụ amalite, agha na-arị elu n'ọwụwa anyanwụ DR Kongo nke bara ọgaranya n'ihe onwunwe, n'etiti ndịagha gọọmenti na ndị nnupụisi a na-eche na mba Rụwanda na-akwado.

    Ndịagha DR Kongo boro ndị iro ha ebubo na ha na-agbalị "imebi" usoro udo ahụ, mana ndị nnupụisi M23 kwuru na ndịagha ebidola mwakpo iji mebie nkwekọrịta agha ahụ.

    Cheta na M23 weghaara akụkụ buru ibu nke ọwụwa anyanwụ DR Kongo na mmalite afọ a, n'agha nke gburu ọtụtụ puku mmadụ ma chụpụ ọtụtụ ndị ọzọ n'ụlọ ha.

    Chetakwa na isi ebe azụmaahịa dị n'ọwụwa anyanwụ DR Kongo, Goma, nọ n'okpuru ndị nnupụisi kemgbe ọnwa Jenụwarị 2025.

  20. Ndị mkparịtaụka Yukren na mba Amerịka ga-ezukọ na Florida dịka mkparịtaụka Moscow gasịrị - Ụlọọrụ White House

    Ụlọọrụ White House kwuru na ndị mkparịtaụka Yukren na mba Amerịka ga-ezukọ na Florida

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụlọọrụ White House kwuru na ndị mkparịtaụka Yukren na mba Amerịka ga-ezukọ na Florida

    Ụlọọrụ White House ekwuola na onye nnọchianya pụrụ iche nke mba Amerịka bụ Steve Witkoff ga-ezute onyeisi ndị kansụl nchekwa mba Yukren bụ Rustem Umerov, maka mkparịtaụka ha ga-enwe na Miami n’ụbọchị Tọzde 4 Disemba 2025.

    Nzuko a na-abịa mgbe Witkoff na onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa ise na Moscow n’ụbọchị Tuzde, ma wee mkparịtaụka nke Kremlin kwuru na ha "enweghị nkwekọrịta" iji kwụsị agha na Yukren.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na mkparịtaụka ahụ - nke ọgọ ya nwoke bụ Jared Kushner sokwa - "dị mma nke ukwuu", mana o kwukwara na ọ dị oke ngwa ikwu ihe ga-eme n'ihi na "ọ na-ewe mmadụ abụọ iji nwee nkwenye."

    Minista mba ofesi nke Yukren bụ Andrii Sybhia kwuru na Rọshịa ga-akwụsị ịkwafu ọbara, ma boo Putin ebubo na ọ "na-emefusị oge ụwa".

    Cheta na Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na n’ụbọchị Wenezde na nzukọ dị n'etiti ndị mkparịtaụka mba Amerịka na Yukren ga-eme "n'ụbọchị ndị na-abịa".