Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa
Ogbunigwe agbaala na Zamfara
A na-atụ uche na ndị njem amabeghị ọnụọgụgụ anwụọla dịka ihe a na-eche na ọ bụ ogbunigwe gbara na okporoụzọ Yar’Tasha–Dansadau dị na Zamfara Steeti ụbọchị Satode.
Ndị ueojii steeti kwuru na ihe ọgb ugba gbara n'ezie mana ha ekwughị ma ọbụ ogbunigwe nakwa- mmadụ ole o metụtara.
Zamfara bu mpaghara ndị omekome bu egbe na-akpa mkpamkpa na Naijiria
Izrel anabatala Somaliland dịka mba kwụụrụ onwe ya
Izrel abụrụla mba mbụ ga-anabata mba si Somalia kewapụta a kpọrọ Somaliland dịka mba nweere onwe ya.
Praim Minista Benjamin Netanyahu Izrel chọrọ ka ha na Somaliland nwee mmekọrịta n'ọrụugbo, ahụike nakwa teknụzụ.
Onyeisiala Somaliland bụ Abdirahman Mohamed Abdullahi, kpọrọ nke a "nnukwu ihe nribama".
Nna malite ịhụta mba Somali etu ahụ bata Izrel nyere Somaliland nwere ike ime ka mba ndị ọzọ ṅomie Izrel ma mepere ndị Somaliland ụzọ azụmahịa na mmekọrita mba na mba.
Mana Praim Minista mba Somalia bụ Hamza Abdi Barre, kwuru na mba ya anabataghị ihe Izrel mere is na o megidere ikike nkwụrụonwe nke Somalia.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Somaliland bụ Abdirahman Mohamed Abdullahi, kpọrọ nke a "nnukwu ihe nribama".
Mba Taịland na Kambodịa ekwetala ịkwụsị ịkwa mgbọ
Ebe foto si, Reuters
Ndị minista na-ahụ
maka nchekwa na mba Taịland na kambodịa ekwuola na mba abụọ ahụ ekwetala ịkwụsị
ịkwa mgbọ ozugbo ozugbo.
Mba abụọ ahụ
kwetara ịkwụsị mkpagharị nke ndịagha, ma mee ka ụmụ mmadụ ndị bi na mpaghara okeala
lọghachi n’ụlọ ha.
Nke a na-abịa dịka
a hụchara ọgbaaghara kpụ ọkụ n’ọnụ n’okeala mba Taịland na Kambodịa, nke opekatampe,
mmadụ iri anọ na otu nwụrụ n’ime ya, ebe ihe ruru nde mmadụ gbapụrụ n’ụlọ ha.
Nkwụsị ịkwa mgbọ
a malitere n’elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị, n’oge mba ha (05:00 GMT).
Ozi ndị Minista ahụ
wepụtara sịrị na ọ bụrụ na nkwụsị ịkwa mgbọ a ruo ụbọchị atọ, mba Taịland ga-atọhapụ
ndịagha mba Kambodịa iri na asatọ ha ji eji.
E nwetara ọganihu
a, oge ndị ọchịchị Taịland na Kambodịa nwechara mkparịtaụka were ụfọdụ ụbọchị,
nke ebumnobi ya bụ ịkwụsị agha ọhụrụ dị n’etiti mba abụọ ahụ.
Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.
Nnukwu ọṅụ na ihu sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Eke 27 Disemba, 2025
N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị tupu Uche Akolisa eburu oche n'oge ehihie.
Ihe anyị ga-eme maka ọkụ gbara ụlọ ‘Great Nigeria Insurance House’ - Gọvanọ Sanwo-Olu
Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu / X
Nkọwa foto, Babajide Sanwo-Olu
Gọvanọ Legọs steeti, Babajide Sanwo-Olu ekwuola ihe gọọmenti ya ga-eme banyere ọku gbara ụlọ Great Nigeria Insurance House na Balogun dị na mpaghara Lagos Island.
Ọkụ gbara ụlọ ahụ nwere ọtụụ ogoogo ma mebie ọtụtụ
ihe a mabeghị ego ole ọ pụtara.
Mkpamkpa ahụ kpara n’abalị Wenezde Desemba 24, 2025, nkenke awa ole na ole tupu emume Ekeresimesi amalite.
Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu / X
N'oge Sanwo-Olu gara mgbaru n’ebe ahụ ka o kwuru sị “enweghị etu a ga-esi kọwaa ahụhụ na ihe ụfụ ọkụ a butere”.
Ọ gwara ndị o metụtara ka ha kasie obi, ma kelee ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ etu ha si gbochie ọkụ ahụ ifesa karịa.
O kwere nkwa na gọọmenti ya ga-atule ihe mere ma nye ndị o metụtara nkwado”.
Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu / X
E wepụtala aha ndị nwụrụ oge helikọpta kpọkara na mba Tanzanịa
Ebe foto si, ALTEZZA TRAVEL
Nkọwa foto, Mgbe Ụgbọelụ ahụ kpọkashịrị na-akwadọ ifeli elụ
Ndị ọrụ gọọmenti mba Tanzanịa ewepụtala aha ndị nwụrụ oge helikọpta kpọkasịrị na mba ahụ n'ụbọchị Tọzde.
Ọdachi a mere mgbe ụgbọelu ahụ gara ibupụ ndị ọrụ ahụike ha nọ na nsogbu dịka ndị mmadụ na-arị ugwu Kilimanjaro.
Mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede a gụnyere David Plos na Ana Plosovo ndị amaala mba Czech Repọblik bịara njem nleta na Tanzanịa.
Ndị ọzọ nwụrụ bụ ndị amaala Tanzanịa mmadụ abụọ bụ Innocent Mbaga, onye bụ onyendu na-elekọta ndị bịara njem nlegharị anya nakwa dọkịta Jimmy Daniel.
Onye ọkwọụgbọelu ahụ bụ Constantine Mazonde bụ nwaamaala Zimbabwe so na ndị nwụrụ.
Etụ o sị dị ugbua, Gọọmenti Tanzanịa enyela iwu ka e mee nnyocha ma chọpụta ihe kpatara ọdachị ojọọ a.
Akụkọ kwuru na ụgbọelu ahụ bụ "Airbus Helicọpta H125' nwere akara '5H-KMA', bụ nke ndị ụlọọrụ KiliMedi Air ji arụ ọrụ kpọkasịrị obere oge dịka o felichara elu n'ọdọụgbọelu Barafu dị na ndagwurugwu Barafu n'ugwu Kilimanjaro a ma ama, bụ ebe ọtụtụ mmadụ na-eme njem nlegharị anya na-agbakọ ma na-arị elụ afọ niile.
Ebe foto si, ALTEZZA TRAVEL
Nkọwa foto, Ogige ebe Ụgbọelu ahụ kpọkashịrị dịka ndị mmadụ gbakọrọ inyere aka zọpụta ndị ihe mmetụtara
Ogbunigwe agbagbuola mmadụ ise na Borno Steeti
Ebe foto si, Reuters
Opekatampe mmadụ
ise anwụọla oge ogbunigwe gbawara n’ime ụlọekpere ndị Alakụba dị na Borno
Steeti.
Ọnụ
na-ekwuchitere ndị uweojii Borno Steeti bụ Nahum Daso gwara ndị mgbasaozi na ogbunigwe
ahụ merụrụ mmadụ iri atọ na ise ndị ọzọ ahụ n’ahịa Gamboru dị na Maiduguri oge ha
na-ekpe ekpere abalị.
Onyonyoo a hụrụ
na soshal midịa gosiri ihe yiri oge ogbunigwe ahụ gbachara, dịka a hụrụ ka ndị
mmadụ kwụ na mpaghara ahịa ahụ, ebe ụzụzụ jupụtara ebe niile.
O nwebeghị otu ọbụla
kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo a, mana ndịagha nnupuisi ejirila ogbunigwe wakpoo ụlọekpere
ndị Alakụba nakwa ebe e nwere ọtụtụ mmadụ n’oge gara aga.
A nwụchiela mmadụ 11 maka egbe a gbara n’ebe a na-aṅụ mmanya na Saụt Afrịka
Ebe foto si, AFP via Getty Images
A nwụchiela mmadụ
iri na otu a na-enyo enyo maka egbe a gbara aghara aghara n’ebe a na-aṅụ mmanya na mba Saụt Afrịka.
Ọ bụ n’ụbọchị Sọnde
ka a gbara egbe ahụ aghara aghara ma gbagbuo mmadụ itoolu.
Ndị uweojii
malitere ịchọ ndị ojiegbe iri na abụọ a na-amaghị ndị ha bụ e kwuru gbara egbe
ahụ n’elekere mbụ nke ime abalị (n’oge Saụt Afrịka) na Bekkersdal dị n’akụkụ
Johannesburg.
N’ụbọchị Wenezde,
osote kọmịshọna ndị uweojii nke mpaghara ahụ bụ Fred Kekana kwuru na mmadụ
itoolu n’ime ndị a nwụchiri bụ ụmụafọ Lesotho ebe otu n’ime ha bụ onye Mozambique.
E jichikwara onye
nke ọzọ a na-enyo enyo, bụ onye e kwenyere na ọ bụ nwaafọ Saụt Afrịka na-arụ
ebe a na-egwupụta akụ ndị chi nyere.
Igbo bụ Igbo, Ekeresimesi ọma nụ, Anyị sị oji ngajị eri, cheta onye ji aka.
Nnukwu ọṅụ na ihu sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde Afọ, 25 Disemba, 2025 ma bụrụkwa ụbọchị Ekeresimesi.
N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-anọrị tupu Uche Akolisa, Michael Ngene na Michael Ilediagu eburu oche n'oge ehihie.
Sunday Jackson: Gọvanọ Fintri agbarala nwoke a mara ikpe ọnwụ maka igbu ọchịehi Ekeresimesi
Ebe foto si, Screengrab
Gọvanọ Adamawa steeti bụ Ahmadu Fintiri enyela otu onye ọrụugbo nọrọla na mkpọrọ afọ 11 dịka ọ na-eche ọnwụ ya ntọhapụ.
Ụlọikpe Kachasị mara Sunday Jackson ikpe ọnwụ maka igbu otu onye ọchịehi wakporo ya n'ugbo ya dịka ọ naazọ onwe ya.
Jackson na mmadụ abụọ ndị ọzọ;Joseph Eugene na Maxwell Ibrahim bụ ndị Gọvanọ Fintri nyere mgbaghara n'abali 23 nke ọnwa Disemba afọ 2025 dịka a na-emerube emume Ekeresimesi na afọ ọhụrụ.
Ka ọ dị ugbua , onye omeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ekwupụtala obi ụtọ ya na ntọhapụ a tọhapụrụ Jackson ma sị na nke a mezuru n'ihi ọkụ mba Amerịka chara Naijiria n'otele banyere okwu a.
Na nsonso a, mba Amerịka na-acha Naijiria ọkụ banyere ebubo igbusịsị ndị ụka Kraistị ọkachasị n'Ugwu Naijiria.
N'ozi ya n'akara ọbaozi X,Moore kwuru sị,"O teela m na-akpọ oku ka a tọhapụ Sunday ma n'ọha ma n' ọgbakọ ime ụlọ, ọbụladị oge m du ndị omeiwu mee njem gaa Naijria na nsonso a."
Ọ gara n'ihu sị na nwaamadị ahụ bụ onye a wakporo, ọ zọwa onwe ya ma gbuo onye wakporo ya, so na ndị otu Kraịstị na-agabiga mmekpa ahụ na Naijiria.
"Onye nweanyị bịara ịtọhapụ ndị e ji eji, ugbua Sunday ga-enwe ohere ya na ezinaụlọ ya ịgbakọ Ekeresimesi."
A kpụpụla Malami ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka ego ruru N212bn
Ebe foto si, Abubakar Malami/X
Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka na Naijiria bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) akpụpụla onye bụbụ Okaiwu Ukwu nke Gọọmentị Etiti na Minista na-ahu maka ikpe bụ Abubakar Malami, Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abụja maka ebubo ibupụ akatamkpo ego nakwa izo ego na ihe ndị ọzọ o nwetara n'uzọ megidere iwu.
Ndị eso kpụpụ ụlọikpe n' okwu ahụ gụnyere nwa Malami nwoke bụ Abubakar Malami nakwa onye ọrụ ya a kpọrọ Bashir Asabe.
EFCC na-ebo ha ebubo iji ụlọọru dị iche iche were zofuo ijeri kwuru ijeri naira n'agbata afọ '2015 rue afọ 2025.
A na-ebokwa ebubo na malami zụrụ ụlọ 41 na Kebbi, Kano na Abuja gụnyere ụlọ nkwari, ụlọakwụkwọ na ụlọbibi nke ọnụahịa ya ruru ijeri naira 212.89(N212.89 bn).
Cheta na Malami bụ ọkaiwu Ukwu nakwa Minista na-ahụ maka ikpe n'oge Ọchịchị Muhammadu Buhari afọ asatọ Buhari chịrị malite n'afọ 2015 rue afọ 2023.
Mba Amerịka ajụọla inye onye bụbu kọmishọna EU na ọtụtụ ndị ọzọ akwụkwọ njem ‘visa’
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ mba Amerịka
ekwuola na ha agaghị enye mmadụ ise gụnyere onye jibu ọkwa kọmishọna EU bụ
Thierry Breton akwụkwọ njem visa maka ihe ụfọdụ ha dere n’akara soshal midia ha
dị iche iche.
Odeakwụkwọ
gọọmenti Amerịka bụ Marco Rubio kwuru na ihe ndị ahụ ha dere bụ nke metụtara ndị
Amerịka nakwa ụfọdụ ụlọọrụ mba Amerịka.
E kwuru na ọ
bụ Breton kpalitere atụmatụ Digital Service Act (DSA) nke EU mapụtara iji
gbochie nlebanye anya a na-elebanye n’ụlọọrụ soshal midia ụfọdụ.
Breton na
Elon Musk onyeisi ụlọọrụ X enwebuola esemokwu n’oge gara aga banyere ime ka X
na-esonye iwu EU mapụtara.
Ndị uweojii abụọ anwụọla na mwakpo e mere na Mosko isiobodo mba Rọshịa
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ abụọ
gụnyere ndị uweojii abụọ anwụọla na mwakpo e mere na Mosko isiobodo mba Rọshịa.
Kọmitii mba
Rọshịa na-eme nnyocha kwuru na ndị uweojii abụọ na-ahazị ụgbọala kwuru na ha hụrụ
otu onye a na-eyo eyo n’akụkụ ụgbọala ndị uweojii na Yeletskaya mana oge ha gara
ịnwụchi ya, ogbunigwe gbawapụrụ
Ndị uweojii
abụọ ahụ na otu onye ọzọ nwụrụ site na ahụ ha merụrụ n’ọdachi ahụ.
Nke a na-abịa
dịka nnukwu ọchịagha ndịagha mba Rọshịa bụ Ọchịagha Fanil Sarvarov nwụrụ oge
ogbunigwe e tinyere n’ụgbọala gbawapụrụ n’ụbọchị Mọnde.
Ọnụ na-ekwuru
kọmitii nnyocha ahụ bụ Svetlana Petrenko kwuru na a malitela ime nnyocha iji chọpụta
ihe mere e ji awakpo ma na-egbu ndị uweojii.
Ụtụtụ ọma ndị be anyị
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 24 Disemba, 2025 ma bụrụkwa ahịa Orie.
Gaa n'ihu soro akara soshal midia anyị maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.
Ndewo.
Malite n’afọ 2026, NIN na akara CAC ga-abụ akara njirimara ụtụisi
Ebe foto si, FIRS/X, Getty Images
Dịka ụlọọrụ Federal
Inland Revenue Service (FIRS) siri kwuo, akara National Identification Number
(NIN) ga-abụzi akara njirimara ụtụisi maka ụmụafọ Naịjirịa malite n’afọ 2026.
Nkwupụta a na-abịa
dịka ndị mmadụ na-enwe mmetụta gbasara otu mpaghara iwu ụtụisi, bụ nke mere ka ọ
bụrụ iwu na onye niile ga-enweta akara njirimara ụtụisi iji nwee akara ọbaego.
Site n’ozi ụlọọrụ
NIMC wepụtara, e nyela ụmụafọ Naịjirịa dị otu narị nde na iri abụọ na atọ na ụma
itoolu akara njirimara NIN kemgbe ọnwa Ọktoba, 2025.
Site n’ozi ha wepụtara
n’akara X n’ụbọchị Mọnde 22 Disemba 2025, FIRS kwuru na akara ndebanyeaha nke ụlọọrụ
Corporate Affairs Commission (CAC) na-enye ga-abụ akara njirimara ụtụisi ha.
Iwu ụtụisi bụ Nigeria
Tax Administration Act (NTAA) a atụrụ anya ịmalite rụwa ọrụ n’ọnwa Jenụwarị,
2026 manyere onye niile iji akara ụtụisi atụ mgbere.
Nwunye Gọvanọ Nwifuru agbapụtala mmadụ 25 nọ na mkpọrọ
Ebe foto si, Gov House Ebonyi state
Nkọwa foto, Ndị a tọhapụrụ n'ụlọ mkpọrọ
Opekatampe
mmadụ 25 nọ na mkpọrọ n’Abakiliki enwerụla onwe ha site n’enyemụaka nwunye Gọvanọ
Ebonyi steeti bụ Mary Mauduline Uzoamaka Nwifuru.
Uzoamaka kwụrụ
ụgwọ ha ji ma mee ka ha si n’ụlọmkpọrọ laa.
Kọmịshịọna
na-ahụ maka ikpe ọha n’Ebonyi steeti bụ Ben Uruchi Odoh sị na ndị ahụ pụtara dịka
nwunye gọvanọ kwụrụ ụgwọ ha ji.
Onyeisi ụlọọrụ
‘Nigeria Correctional Service Ebonyi Steeti bụ Angela Chika Igwugwu kenere
nwunye Gọvanọ Nwifuru ma kpọọ oku ka a gwado ha n’inyere ndị a sin a mkpọrọ pụta
aka ma kwado ha ị bụ ndị gbanwere agbawe.
Ebe foto si, Gov House Ebonyi state
Nkọwa foto, Mary Mauduline Uzoamaka Nwifuru
Ọ sị na a rụrụ ụlọ nga dị n’Abakiliki maka mmadụ 387 mana ndị nọ n’ime ya ugbua ruru mmadụ 1,018.
Ọ kawara na ndị na-anọ n’ime otu ime ụlọ n’ụlọ nga ahụ na-eru mmadụ 122 ma ha na-aga mposi ma na-asa ahụ n’out ime ụlọ ahụ.
Mana ọ bụ mgbe nwunye Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Mary Mauduline Uzoamaka Nwifuru kwuru okwu ka ọ sị na ihe ya mere bụ maka mmụọ ekeresimesi.
Ọ sị na ya chọrọ ka a na-anabata ndị mmadụ na ya achọghị nkewa na ịkpa oke.
Onye uweojii a gbara egbe n’oge a wakporo 'Bondi beach' esila ụlọọgwụ laa
Ebe foto si, PA Media
Nkọwa foto, Jack Hibbert
Jack Hibbert
bụ onye ọrụ nchekwa a gbara egbe mgbe a wakporo ‘Bondi Beach’ esila n’ụlọọgwụ
laa.
Jack dị naanị
ọnwa anọ n’ọrụ ya mgbe a gbara ya egbe ahụ n'oge ndị ojiegbe mmadụ abụọ gbagburu
mmadụ 15, meruo mmadụ 40 ahụ n’ọdọ mkporindụ dị na Hanukkah.
Nwaamadị a dị
naanị afọ iri na abụọ na-enwezi nsogbu ijiri
otu anya ya hụta ụzọ kamgbe ahụ dịka ezinaụlọ ya si kwuo.
N'okwu ezinaụlọ ya "anyị agaghị arịọ ihe ọzọ ọkachasị ka nwaanyị bụ Jack si lọghachịta n’ime
ekeresimesi a, nke a bụ ihe ịtụnanya".
Ndị uweojii abụọ ka mgbọ egbe tụrụ na mwakpo ahụ mere na ‘Bondi
beach’ mana dịka Jack sị n'ụlọọgwụ laa, onye ọzọ a gbara egbe bụ Scott Dyson dị afọ 25 ka nọ n’ụlọọgwụ
na-anara ọgwụgwọ.
Rọshịa ewelitela aka n'ogbunigwe ha na-atụ na mba Yukren
Ebe foto si, Press service of the State Emergency Service of Ukraine in Odesa region
Mba Rọshịa ewelitela
aka n’ogbunigwe ha na-atụ na mpaghara ndịda Yukren bụ Odesa, nke mebiri ọtụtụ
akụrụngwa ọkụ latrik ma na-achọ imebi akụrụngwa njem ụgbọmmiri.
Osote Praịm
Minista mba Yukren bụ Oleksiy Kuleba kwuru na Mosko kpachara anya na
mwakpo a ha na-eme ma kwuo na ebe agha na-elekwasị anya ugbua bụ n’Odesa.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ọtụtụ
mwakpo a Mosko na-eme ha bụ iji gbochie ha emela njem n’ọgbọmmiri.
Na mbido ọnwa Disemba, Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin
yiri egwu na ọ ga-emebi okporo njem ụgbọmmiri ndị Yukren iji megwara n’ogbunigwe
ha tụrụ ụgbọmmiri tanka ndị Rọshịa
a kpọrọ ‘shadow fleet’ n’osimiri ojii.
‘Shadow
fleet’ bụ ọtụtụ ụgbọmmiri Rọshịa na-eji agafe mpagara Yurope maka mmachi e nyere
ha kamgbe afọ 2022 ha wakporo mba Yukren.
Na mgbede Mọnde,
Rọshịa tụrụ ọtụtụ ogbunigwe n’ọdọmmiri Odesa mebie ụgbọmmiri mmadụ nwee dịka gọvanọ
mpaghara ahụ si kwuo.
Nke a so n’ọtụtụ
ogbunigwe a tụrụla na mpaghara ahụ kamgbe ụbọchị ole ma ole nke mebirila ọtụtụ
akụrụngwa ọkụ latrik ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ.