Mba Chad adọọla Sudan aka na ntị na ha ga-emegwara, dịka ogbunigwe droonu gbuchara mmadụ 17

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Chad enyela ndịagha iwu ka ha megwara mwakpo ọbụla Sudan ga-eme n’ọdịnihu.
Iwu a sochiri mwakpo ogbunigwe droonu gburu opekatampe mmadụ iri na asaa ma merụọ ụfọdụ ndị ọzọ ahụ, oge ha na-aga akwamozu.
Dịka o yi uwe ndịagha, Onyeisiala Idris Mahamat Déby kpọrọ nzukọ nchekwa gbatagbata na mgbede Wenezde, ebe ọ nọrọ nye iwu ka ndịagha mụrụ anya nke ọma.
O nyekwara iwu ka e mechie okeala jikọtara mba Chad na Sudan n’uju.
Ọ kọwara mwakpo ahụ lekwasara anya n’obodo Tiné dị n’okeala dịka “nke jọgburu onwe ya nakwa mwakpo ihere” megide mba Chad.
N’ọnwa gara aga ka mba Chad mechiri okeala ha na mba Sudan ruo n’oge a maghị iji kwụsị mwakpo otu mba Sudan ndị bu ngwaọgụ na-eme ha aghara aghara.
Ka o sina dị, ha nyere ohere maka ọrụ obi ebere, nke a ga-ebu ụzọ nata nkwado n’aka ndị ọchịchị.
Ndị bi n’obodo Tiné kwuru na ndị mwakpo nke ụbọchị Wenezde metụtara bụ ndị na-eru uju.
Otu n’ime ha, ndị ntaakụkọ Reuters jụrụ ajụjụ kwuru na ha gbakọrọ n’otu ụlọ maka mmemme akwamozu gụnyere ịgụpụta Koran.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:


















