Anambra Steeti bụ steeti kacha nwee udo na Naịjirịa, anyị ekpochapụla ogige ndị omekome ruru 60 – Gọvanọ Soludo

Nchịkọta akụkọ ndị mere n'izu a

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu, Marvelous Obomanu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Uzoamaka Ewuzie, Adline Okere

  1. Mba Chad adọọla Sudan aka na ntị na ha ga-emegwara, dịka ogbunigwe droonu gbuchara mmadụ 17

    Chadian village children take shelter under trees after an attack on their village forced them to flee to a site for internally displaced Chadians November 20, 2006 at Goz Beida village, Chad

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Chad enyela ndịagha iwu ka ha megwara mwakpo ọbụla Sudan ga-eme n’ọdịnihu.

    Iwu a sochiri mwakpo ogbunigwe droonu gburu opekatampe mmadụ iri na asaa ma merụọ ụfọdụ ndị ọzọ ahụ, oge ha na-aga akwamozu.

    Dịka o yi uwe ndịagha, Onyeisiala Idris Mahamat Déby kpọrọ nzukọ nchekwa gbatagbata na mgbede Wenezde, ebe ọ nọrọ nye iwu ka ndịagha mụrụ anya nke ọma.

    O nyekwara iwu ka e mechie okeala jikọtara mba Chad na Sudan n’uju.

    Ọ kọwara mwakpo ahụ lekwasara anya n’obodo Tiné dị n’okeala dịka “nke jọgburu onwe ya nakwa mwakpo ihere” megide mba Chad.

    N’ọnwa gara aga ka mba Chad mechiri okeala ha na mba Sudan ruo n’oge a maghị iji kwụsị mwakpo otu mba Sudan ndị bu ngwaọgụ na-eme ha aghara aghara.

    Ka o sina dị, ha nyere ohere maka ọrụ obi ebere, nke a ga-ebu ụzọ nata nkwado n’aka ndị ọchịchị.

    Ndị bi n’obodo Tiné kwuru na ndị mwakpo nke ụbọchị Wenezde metụtara bụ ndị na-eru uju.

    Otu n’ime ha, ndị ntaakụkọ Reuters jụrụ ajụjụ kwuru na ha gbakọrọ n’otu ụlọ maka mmemme akwamozu gụnyere ịgụpụta Koran.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  2. Ịran ka nwere ike ọgụ – Amerịka

    Ịran ka nwere ike ọgụ – Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndi ọchịchị mba Amerịka sị na Ịran ka nwere ngwaagha nakwa ikike ha ji aga n'ihu na mwakpo ha na-eme.

    Onye isi nchekwa bụ Ọchịagha Dan Caine, kwuru nke a oge ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakukọ n'ọgbakọ Odeakwukwọ Nchekwa bụ Pete Hegseth hiwere.

    A jụrụ ya ma ndịagha a ka nwere ike ime mwakpo, ọkachasị n'akụrụngwa mmanụ na mpaghara Gulf, n'agbanyeghị agha malitere kemgbe izuụka atọ.

    Mana Caine zara si, “Ịran ji ọtụtụ ngwaagha bido ọgụ a. Ọ bụ ihe mere Amerịka ji were ikike ha niile na-alụ ọgụ a."O kwukwara na ndị United States ga-aga n'ihu “na-achụ ma na-egbukwa ha,” mana ọ gbakwunyere na “Ịran ka nwere ikike ilu agha.”

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  3. EFCC na AANISS ejikọọla aka maka ibu agha megide iji ego azụta vootu

    Ola Olukoyede bụ onyeisi ụlọọrụ EFCC

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ụlọọrụ na-ebu agha emegide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) nakwa otu jikọtara ndị gụrụ banyere nchekwa a na-akpọ "Alumni Association of the National Institute for Security Studies, AANISS" ekwekọtala na ha ga-ejikọ aka ọnụ megide ị ji ego azụta vootu.

    EFCC na otu AANISS mere ka a mata nke a n’Abuja dịka ha zutechara n’isi ụlọọrụ EFCC.

    Onyeisi AANISS bụ Mike Ejiofor kwuru na atụmatụ ahụ ga-enyere aka gbochie nrụrụaka na ntulịaka ọkachasị ị jiri ego azụta vootu ma too mbọ niile ụlọọrụ EFCC na-agba maka nke ahụ.

    Olukoyede bụ onyeisi ụlọọrụ EFCC kwetere na ọ bụ ọrụ ha ibuso agha megide ndị ji ego azụta vootu ma kwuo na ha na-eme ike ha banyere ya.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  4. Igbo ndị ọma anyị ekelee unu

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị maka inweta akụkọ ndị mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    E chefukwala isonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Nnọọ!

  5. Ndị uweojii anwụchiela onye a na-enyo enyo n’ikpe ogbugbu mmadụ na Riva steeti

    Onye a na-enyo enyo kwukwara na otu ahụ buru ma lie ozu onye ahụ nwụrụ anwụ n'ili dị omimi n'ime ọhịa dị na Ekerre-Ugbor iji zoo mpụ ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images/Rivers Police Command

    Nkọwa foto, Onye a na-enyo enyo kwukwara na otu ahụ buru ma lie ozu onye ahụ nwụrụ anwụ n'ili dị omimi n'ime ọhịa dị na Ekerre-Ugbor iji zoo mpụ ahụ.

    Ndị uweojii Riva steeti enweela nnukwu ọganihu na nnyocha ogbugbu mmadụ, dịka ha jidere onye a na-enyo enyo maka ogbugbu nwoke dị afọ iri anọ na abụọ bụ Shedrack Ogadinma Chukwem na mpaghara okpuru ọchịchị Etche.

    Ndị uweojii nke ngalaba na-emegide otu nzuzo na Emuohia Annex, chọtara ma jide Robinson Uche dị afọ iri abụọ na itoolu n'isi ụtụtụ nke abalị isii nke ọnwa Maachị, 2026, mgbe ọrụ nzuzo na-aga n'ihu.

    Mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, onye a na-enyo enyo kwetara na ọ bụ ya mere ogbugbu ahụ, na-ekpughe na ya na mmadụ anọ ndị ọzọ dọtara onye ahụ e gburu n'ebe dị iche iche n'okpuru nduzi nke otu onye a kpọrọ Chief Elijah Okere.

    N’agbanyeghị, atụmatụ ahụ kara njọ mgbe mgbalị ha ijide onye ahụ nwụrụ anwụ kụrụ afọ n'ala, nke butere ngbagbu nke onye ahụ nwụrụ anwụ n'oge mkparịtaụka ahụ na Disemba 17, 2025.

    Onye a na-enyo enyo kwukwara na otu ahụ buru ma lie ozu onye ahụ nwụrụ anwụ n'ili dị omimi n'ime ọhịa dị na Ekerre-Ugbor iji zoo mpụ ahụ.

    Ndị uweojii mere ngwangwa n'ihi ozi a, ha wakporo ebe ahụ, gwupụta ozu ahụ, ma tinye ozu ahụ n'ụlọ nchekwa ozu ndịagha maka nnyocha ozu iji chọpụta ihe gburu ya.

    Kemgbe ahụ, ndị ọchịchị emeela ka ọrụ ịchụ nta mmadụ sie ike iji jide ndị ọzọ a na-enyo enyo ka nọ n'ebe ahụ, gụnyere ndị a kpọrọ "Onyia-Army," Achor, na Gift Okere, nke a makwaara dịka "Nnaye."

    Kọmishọna ndị uweojii bụ Olugbenga Adewole Adepoju, kwughachiri nkwa ha maka inwete ikpe ziri ezi, na-emesi ndị bi ebe ahụ obi ike na a ga-achụso ndị niile aka ha dị na mpụ ahụ, jide ha, ma kpee ha ikpe.

    O kwuru na nnyocha na-aga n'ihu.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  6. CAF anapụla mba Senịgal iko AFCON 2025 nye ya Moroko

    Oge a gbachara asọmpị AFCON 2025 bunye mba Senịgal iko nturuugu.

    Ebe foto si, Getty images

    Ngalaba mkpeghari ikpe nke otu bọọlụ jịkọtara mba Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) ekwuola na ọ bụ mba Moroko meriri n’asọmpị African Cup of Nations (AFCON) 2025.

    Ngalaba CAF ahụ bụ nke na-ahụ maka ikpe asọmpị nakwa egwuriegwu bọọlụ mere ka a mata nke a ma kwuo na ha gbadoro ụkwụ n’iwu ha nke iri asatọ na anọ (‘Article 84’).

    CAF kpebiri na mba Moroko ji ọkpụ atọ merie mba Senịgal ma bunye mba Moroko iko AFCON 2025.

    Lee mkpebi ngalaba mkpegharị ikpe CAF nyere maka nke a:

    • CAF kpebiri na ha nwereike ịnabata mkpesa otu egwu bọọlụ mba Moroko bụ Fédération Royale Marocaine de Football (FRMF) wetere ma kwuo na ọ dị ire.
    • CAF kagburu ma wezuga mkpebi ngalaba ha na-ahụ maka etu ndị na-agba bọọlụ si akpa agwa.
    • CAF kwuru na agwa ndị egwu bọọlụ mba Senịgal megidere iwu ‘Article 82 .
    • Ha sị na ndị Senigal pụrụ n’ike n’oge a na-asọ mpị nke agba ikpeazụ, bụ nke megidere iwu ‘Article 84’. Nke a mere CAF jiri nye ndị Senịgal ntaramaahụhụ gụnyere ịnapụ ha iko AFCON 2025 ma nye ya Moroko.
    • CAF manyere na Moroko gbara Senịgal ọkpụ atọ a na-asataghị otu dịka iwu ahụ si kwuo.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  7. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?, Ka Orie taa rotere anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde Orie 18 Maachị, 2026.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị maka inweta akụkọ ndị mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    E chefukwala isonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Nnọọ!

  8. Gọọmenti Etiti ekwupụtala ezumike ọha n'ụbọchị Tọzde na Fraịde maka emume ‘Eid-el-Fitr’

    Ndị Alakụba zukọrọ iji kpee ekpere tarawih mbụ nke Ramadan n'ụlọ alakụba Jamiâurrahman dị na mpaghara Kwandila nke steeti Kano, Naịjirịa, na Febụwarị 18, 2026.

    Ebe foto si, Anadolu via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị Alakụba zukọrọ iji kpee ekpere tarawih mbụ nke Ramadan n'ụlọ alakụba Jamiâurrahman dị na mpaghara Kwandila nke steeti Kano, Naịjirịa, na Febụwarị 18, 2026.

    Gọọmenti Etiti Naịjirịa ekwupụtala ụbọchị Tọzde, 19 Maachị na Fraịde, 20 Maachị, 2026, dịka ụbọchị ezumike ọha iji mee emume ‘Eid-el-Fitr,’ nke na-egosi njedebe nke ọnwa nsọ nke ‘Ramadan’.

    E kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ nke Mịnịstrị nke ime obodo bụ Magdalene Ajani, binyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde.

    Dịka o si kwuo, Minista nke ime obodo bụ Olubunmi Tunji-Ojo, onye kwupụtara nke ahụ n'aha gọọmenti etiti, kelere ndị Alakụba maka mmezu nke ọnwa nsọ nke ‘Ramadan’ nke ọma.

    Minista ahụ gwara ndị Alakụba ka ha nọgide na-enwe agwa ọma nke ịhụnanya, mmesapụ aka, udo, ndidi, na ịchụ aja nke a na-akpọ mkpa n'ọnwa nsọ.

    Ọ kpọkwara ndị Naịjirịa niile ka ha jiri oge emume ahụ kpee ekpere maka udo, ịdị n'otu, na ọganihu nke mba ahụ.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  9. Agha Iran: Ihe Sri Lanka na mba ndị Asia ndị ọzọ na-eme iji chekwaa mmanụ ụgbọala

    Ọdọmmanụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Sri Lanka ewepụtala ubọchị Wenezde ọbụla n'izu dịka ụbọchị ezumike na mbọ gọọmentị mba ahụ na-agba iji hụ na ha belatara ka e si emefu mmanụ ụgbọala dịka agha Iran, Izrel na Amerịka nke butere ụkọ mmanụ agbịdị na-aga n'ihu.

    Onyeisiala ha bụ Anura Kumara Dissanayake kwuru n'ọgbakọ ndụmọdụ ya na ndị welitere isi n'ọchịchị ya nwere nsonso a na, "Anyị kwesịrị ịkwado maka ihe ka njọ ime, ọ bụladị ka anyị na-atụ anya nke ọma."

    N'otu aka ahụ, na mba Filipines, ndị ọrụ gọọmentị enyela iwu otu ụbọchị ezumike n'ịzụụka dịka Onyeisiala ha bụ Ferdinand Marcos Jr machiri ndị ọrụ gọọmentị ị na-eme njem na-adịghị mkpa.

    Na mba Thailand, Gọọmentị agwala ụmụamala ha ka ha kwụsị iyi kotu nke bụ akwa na-ekpo ahụ okụ ma yiwe akwa obere iji belata mkpa ịgbanye igwe ntụoyi.

    Na Myanmar, ndị nwere ụgbọala nwere ohere ịkwọ ụgbọala taa, ha agaghị akwọ echi dịka akara ụgbọala ha sị were dị.

    Na Bangladesh, e mere ka ezumike Ramadan bịa nso ma tinye iwu ọkụ iji hụ na e belatara ka e si eji ọkụ eme ihe.

  10. Ọtụtụ ogbunigwe gbara n’obodo Maiduguri dị na Naịjirịa

    Ọtụtụ ogbunigwe gbara n’obodo Maiduguri dị na Naịjirịa

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ogbunigwe gbara n’obodo Maiduguri dị na Naịjirịa

    Gọvanọ Bornọ Steeti bụ Babagana Zulum ekwuola na ogbunigwe gbara na steeti ya nke gburu ọtụtụ ndị mmadụ

    Ihe onyoonyo na-efegharị n'ịntaneti na-egosi ka ndị ọrụ gbata gbata n’ụlọọgwụ dị na Maiduguri si elekọta ndị merụrụ ahụ mana anyị amaghị ma ihe onyonyo ahụ ọ bụ eziokwu.

    Aka na-achị steeti ahụ kwuputara ọdachị a akpọghị aha onye ọbụla ma ọ bụ ndị mere mkpa mkpa a.

    Ogbunigwe nke mbụ dara n'ụlọọrụ nzipu ozi nke nọ na etiti obodo, ọzọ sochiri ya ozugbo n'ahịa Mọnde a ma ama dịka ndị nchekwa abụọ na mmadụ atọ bi na Maiduguri gwara ndị ntaakụkọ Reuters.

    Ọtụtụ ogbunigwe gbara n’obodo Maiduguri dị na Naịjirịa

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ogbunigwe gbara n’obodo Maiduguri dị na Naịjirịa

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nahum Daso Kenneth kwuru na ezigala ndị nchekwa ebe ahụ ihe mere.

    Ndịagha Naịjirịa na ozi ha bipụtara kwuru na ndịagha gbara mbọ megide mwakpo ndị otu na-eyi ọha egwu a na-enyo eyo bụ ndị otu Islamist wakporo na Maiduguri n'isi ụtụtụ Mọnde.

  11. Ndị ọrụ ụlọikpe n'Abia steeti amalitela abụbụọrụ na-enweghị ngwụcha

    Ndị ọrụ ụlọikpe n'Abia steeti amalitela abụbụọrụ na-enweghị ngwụcha

    Ebe foto si, Ndị ọrụ ụlọikpe n'Abia steeti agbaala abụbụọrụ

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ụlọikpe n'Abia steeti amalitela abụbụọrụ na-enweghị ngwụcha

    E mechiela ụlọikpe nke dị n'Abia steeti dịka ndị otu ọrụ ikpe na Naịjirịa malitere abụbụọrụ na-enweghị ngwụcha.

    Onyeisioche steeti ndị ụlọikpe bụ Chinedu Ezeh kwurụ na abụbọ ọrụ a ka ha kọwara na gọọmentị emezubeghị nkwa ha n'ihe gbasara ọdịnamma ndị ọrụ ha.

    Ndị otu ọrụ a kwusiri ike na abụrụọrụ ha a dị mkpa iji nweta nnwere onwe n'ihe gbasara ụgwọ ọnwa ndị ụlọikpe bụ aka nke atọ nke gọọmentị obodo.

    Ndị ọbịa na ndị na-achọ enyemaka ụlọikpe bịara hụ ka ọnụ ụzọ ha kpochiri, ma hụkwa ndị ọrụ nchekwa na-eche ụlọikpe a nche.

    Ndị isi otu ahụ nke Marwan Mustapha na-edu, akwadola abụbụọrụ ahụ ndị otu ya gbara.

    Ndị na-agba akwụkwọ gosiri iwe ha maka mmechi ụlọikpe ahụ ha gbachiri na mberede, bụ nke kwụsịrị ọtụtụ ikpe dị ha oke mkpa.

  12. Ụtụọma ndị ọma! Ka chi bọrọ taa nye gị ihuọma.

  13. Mba Jamịnị agaghị eso lụọ agha Amerịka na Izrel na-ebuso mba Ịran - Merz

    Chanselọ mba Jamịnị bụ Friedrich Merz

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Friedrich Merz

    Chanselọ mba Jamịnị bụ Friedrich Merz ekwuola na mba ya agaghị eso mba Amerịka nakwa mba Izrel buso ndị Ịran agha dịka ụlọọrụ mgbasaozi Reuters si kwuo.

    N’okwu ya “anyị enweghị ikike n’iwu otu mba ụwa bụ United Nations, otu European Union maọbụ nke Nato ịsoro n’agha a”.

    Merz gwara ndị ntaakụkọ na Berlin na “O doro anya n’iwu na agha ahụ abụghị nke Nato”

    Ọ gara n’ihu kwuo na mba Amerịka maọbụ Izrel enweghị mgbe ha gwara mba Jamịnị na ha chọrọ ibuso Ịran agha tupuu ha ebido.

    Nke a gosiri na-enweghị mgbe a kpara nkata ka mba Jamịnị soro lụọ agha ahụ.

    "Ya mere na ajụjụ na mba Jamịnị a ga-eso lụọ agha ahụ ekwesịghị ịpụta nchancha”.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  14. Etu e si nwụchie ndị ekperima anọ a na-enyo maka iyi ọha egwu n’ọdọụgbọelu Akure

    Ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN).

    Ebe foto si, Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) / Facebook.

    Ụlọọrụ 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN) ekwuola etu e si jide mmadụ anọ bụ ndị a na-enyonyo maka iyi ọha egwu n’ọdọ ụgbọelu dị n’Akure, Ondo steeti.

    Onyeisi na ngalaba na-ahụ maka igbasaozi ọha bụ Henry Agbebire kwuru na nke a mere n’ụbọchị Sonde, abalị iri na ise nke ọnwa Maachị 2026.

    Agbebire kwuru na ọ bụ “ndị ọrụ nchekwa dị icheiche jidere ndị ahụ”.

    Ọ kọwara na ọtụtụ ndị omekome ahụ gbara ọsọ n’oge ndị ọrụ nchekwa bịara nso n’ebe ha si chọọ ịbata n’ọdọ ụgbọelu ahụ mana mmadụ anọ n’ime ha ka e jidere.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  15. Tinubu ga-ezute Eze Charles III na mba UK

    Ụfọdụ na-akatọ atụmatụ Tinubu n’ihi amaghị ihe – Minista mgbasaozi

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ụfọdụ nkatọ a na-akatọ atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu bụ n’ihi amaghị ihe nakwa aghụghọ.

    Minista mgbasaozi bụ Mohammed Idris kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ mbaụwa na-enwe mkparịtaụka na mba United Kingdom.

    Ọgbakọ ahụ bụ akụkụ nhazi a na-eme maka ọbịbịa Onyeisiala Bola Tinubu na mba UK n’ime izuụka a.

    Gbasara njem ahụ, Idris kwuru na Naịjirịa na mba UK agaala n’ihu na-emekọrịta ihe kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ma gbakwunye na njem a ga-akwalite mmekọrịta ahụ.

    Onye Eze Charles nke atọ ga-anabata Tinubu, n’ihe a tụrụ anya ga-abụ oge gbara ọkpụrụkpụ maka mmekọ Naịjirịa na mba UK.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  16. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?, Ka Nkwọ taa kwọtara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde Nkwọ 16 Maachị, 2026.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị maka inweta akụkọ ndị mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    E chefukwala isonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Nnọọ!

  17. NDLEA anwụchiela agadị nwoke dị afọ 74, napụta ya ọgwụike oge ọ chọrọ ịga mba UK

    NDLEA anwụchiela agadị nwoke dị afọ 74, napụta ya ọgwụike oge ọ chọrọ ịga mba UK

    Ebe foto si, NDLEA

    Ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela Ikwuakolam Nwaokoro Emeka dị afọ iri asaa na anọ.

    NDLEA nwụchiri agadị nwoke ahụ n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport (NAIA) dị n’Abuja, oge ha chọpụtara ọgwụike ‘cocain’ e zoro n’ime akwụkwọ nakwa ‘bolombolo’ n’ime ibu ya.

    Ọ bụ n’ụlọ ezumezu ndị chọrọ ime njem ka a nwuchiri Ikwuakolam n’ụbọchị Satọde 14 Maachị 2026, onye kwuru na ya na-aga Lọndọn dị na mba United Kingdom maka ezumike.

    A nwuchiri ya ka ọ na-akwado ịbanye n’ụgbọelu 'British Airways' si Abuja na-aga n’ọdọụgbọelu Heathrow dị na Lọndọn, nke akara ya bụ BA082.

    Oge e nyochara ibu ya, a chọtara ọgwụike ‘cocaine’ arọ ya dị kilogram iri na otu, e zoro n’ime ose a kwọrọ akwọ ma kechie n’akwụkwọ nakwa ‘bolombolo’.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  18. Harry na Meghan eboola onye odee obieze dere akwụkwọ ọhụrụ ebubo ịtụ asị

    Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Megann Sparkle

    Ebe foto si, PA Media

    Harry na Meghan ndị bụ 'Duke' na 'Duchess' nke Sussex eboola onye dere akwụkwọ ọhụrụ maka obieze mba Briten ebubo 'ịkọnụkọ ihe e meghị eme'.

    N'akụkọ e si n'ime akwụkwọ ahụ ka ga-apụta, nke e bipụtara n'akwụkwọ akụkọ 'Times', Tom Bowe kwuru na Ezenwaanyị Camila gwara otu enyi ya, na Meghan "asaala" Nwaeze Harry isi.

    O dekwara sị na Meghan bụ 'onye nkewa', na Nwaeze Wales na Adaeze Wales bụ Catherine na-ahụta ya dịka 'ihe iyi egwu'.

    Ọnụ na-ekwuru Nwaeze Harry na Meghan kwuru na Bower eteela "ọ gafere nkatọ gaa na nkwechiri".

    N'ozi ha wepụtara n'ụbochị Satọde ha kwuru sị: "Nke a bụ onye kwurula n'ọha sị, "Obieze ga-akwụgide site n'ihichapụ 'Sussexes' na ndụ anyị."

    "Ihe ọ na-ebu ịkọnụkọ ihe sọrọ ya banyere ndị ọmaghị nke ọ na-ezutela ha mbụ."

    "Ndị chọrọ ịma nke bụ eziokwu ga-achọ ya ebe ọzọ, ndị chọrọ nkọnụkọ isi mgbaka ma ebe ha ga-enweta ya."

    Ihe e si n'akwụkwọ bipụta metụrụ aka na mmekọ dị n'etiti Harry na Meghan, na Nwaeze William na Catherine, n'ụlọọrụ ha nakwa ọrụ ebere ha na-arụ kemgbe ha kwụsịrị ọrụ dịka ụmụeze gawa Amerịka n'afọ 2020 nakwa nkwekọrịta ha na 'Netflix' na 'Spotify' nwere.

    Bower na-ekwu na esemokwu n'etiti 'Sussexes' na William na Catherine arịala elu tupu Harry na Meghan esi na Briten pụọ.

    Onye odee ahụ kwuru na 'William na Catherine nwere nkụja maka Meghan dịka ha kwenyere na ọ na-atụ arịrị na Harry agaghị abụrịrị Eze."

    O kwukwara na Nwaeze Harry na-atụ egwu na nwanne ya nwoke bụrụ Eze na ọ ga-anapụ ha echichi dịka 'Duke na Duchess nke 'Sussex' ma chụọ ha na Briten kpamkpam.

    Bower edebuola akwụkwọ ọ kpọrọ " Revenge: Meghan, Harry, And the War Between the Windsors" nke e biputara n'afọ 2020.

  19. Ihe karịrị mmadụ 60 anwụọla na mba Kenya n’ihi oke idemmiri

    Ihe karịrị mmadụ 60 anwụọla na mba Kenya n’ihi oke idemmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mba Kenya n’ihi nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri agbagoola ma rute iri isii na abụọ.

    Ọnọdụ a emeela ka ihe karịrị mmadụ puku ise bi n’isiobodo Kenya bụ Naịrobi kwapụ n’ụlọ ha kemgbe nnukwu mmiri ozuzo malitere na mbido ọnwa a.

    Onyeisiala William Ruto ekwela ndị Kenya nkwa na gọọmenti ya dị ezigbo njikere izute nsogbu nnukwu mmiri ozuzo ahụ tinyere ndụ na ihe ndị e ji ebi ndụ na nsogbu.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ihe karịrị mmadụ 60 anwụọla na mba Kenya n’ihi oke idemmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Maazị Ruto kwuru na a gbapeela usoro enyemaka nke gụnyere ngalaba dị iche iche, iji zute nsogbu ahụ.

    Usoro a gụnyere ịkpọpụ ndị ọnọdụ ahụ metụtara nakwa ịgwọchasị ọwammiri ndị kpọchiri akpọchi.

    N’ozi o bipụtara n’akara X, Onyeisiala Ruto kwuru na gọọmenti ga-eme ihe niile kwesịrị ekwesị iji chekwaa ndụ ndị mmadụ ma nyekwara ha aka.

    Ihe karịrị mmadụ 60 anwụọla na mba Kenya n’ihi oke idemmiri

    Ebe foto si, Getty Images

  20. E gbuola mmadụ 20 dịka ndị ojiegbe wakporo ndị nchekwa na Plateau Steeti

    Security personnel stand at a female hostel at the Greenfield University in Kaduna, Nigeria, on April 21, 2021.

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ojiegbe bu ngwaọgụ dị iche iche egbuola opekatampe ndị nchekwa na ndị nche obodo iri abụọ oge ha wakporo otu ndị nchekwa n’obodo Wanka nakwa mpaghara Garga dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Kanam na Plateau Steeti.

    Ọ bụ ndị otu Kanam Development Association (KADA) kpughere nke a n’ozi odeakwụkwọ ha bụ ND Shehu Kanam na onyeisioche ha bụ Garba G. Aliyu binyere aka na ya n’ụbọchị Satọde.

    Ozi ahụ kwuru na ndị nwụrụ anwụ gụnyere ndị nchekwa iri na abụọ, nke abụọ n’ime ha bụ ndịagha ọkwa ha dị elu, tinyekwara ndị nche obodo asatọ na-enyere ndị nchekwa aka ichekwa obodo ndị ahụ.

    KADA gbakwunyere na ndị ojiegbe ahụ wụbara n’obodo Kyaram oge ha wakpochara ndị nchekwa, bukọrọ ngwongwo ndị mmadụ ruru nde kwuru nde Naịra ma zuokwa ọtụtụ ehi ndị obodo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ha kpọkuru gọọmenti ime obodo, nke steeti nakwa nke etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa iji gbochie nkwafu ọbara ịga n’ihu n’obodo ndị ahụ.

    Ha rịọkwara ka e mee ngwangwa zitekwuo ndịagha na ndị nchekwa na mpaghara Garga, Kyaram, Wanka nakwa obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu, ma tinyekwa ndị nchekwa n’okeala ha dị iche iche.

    Ka o sina dị, o nwebeghị ozi ndị nchekwa wepụtara gbasara nke a, dịka mbọ niile a gbara inweta ndịagha na ndị uweojii kụrụ afọ n’ala.