Onyeisi ụlọụka
katọlik bụ Pope Francis ekwuola ahụpụtala kadịnal 21 ọhụrụ. Nhọpụta pụtara
na Pope Francis ahọpụta kardinal dị pasenti 80 ndị ga-ekwuputa onye ga-anochi ya dịka
onyeisi ụlọụka katọlik.
Pope
Francis kwuru nke a n’ogige ụlọụka St Peter’s Square. Akụkọ kwụrụ na a ga-ahọpụta
ma doo ndị kardinal asọ ụbọchị Sọnde 8 Disemba 2024 n’ogige Vatican n’emume ‘Solemnity of the Immaculate Conception’.
Ndị ga-ahọpụta kadịnal ndị a si na kọntinent isii, gụnyere Australia,
Kanada, Indoneshia na Iran.
N’ime kadịnal 21 ọhụrụ ahụ,
20 erubeghi afọ iri asato (80) ma bụrụ ndị ga-esonye na ntụliaka ịhụpụta onye
ga-anọchiteanya Pope Francis. Nhọpụta kadịnal ọhụrụ ndị a ga-ebugo ọnụọgụ kadịnal
ụlọụka katọlik 140, nke gafere ọnụọgụ 120 nke Pope Paul VI hibere n’afọ 1975.
Aha kadịnal 21 ọhụrụ ahụ gụnyere:
Archbishọpụ Angelo
Acerbi, Apostolic Nuncio;
Archbishọpụ Carlos
Gustavo Castillo Mattasoglio nke Lima, Peru;
Archbishọpụ Vicente
Bokalic Iglic Cm, Archbishop nke Santiago Del Estero (Primate mba Argentina).
Archbishọpụ Luis Gerardo
Cabrera Herrera, Archbishop nke Guayaquil, Ecuador.
Archbishọpụ Fernando
Natalio Chomalí Garib Archbishọpụ Santiago De Chile, Chile.
Archbishọpụ Tarcisio Isao
Kikuchi nke Tokyo, Japan;
Bishọpụ Pablo Virgilio
Siongco David nke Kalookan, Philippines.
Archbishọpụ Ladislav
Nemet nke Belgrade; Serbia.
Archbishọpụ Jaime
Spengler nke Porto Alegre, Brazil.
Archbishọpụ Ignace Bessi
Dogbo nke Abidjan, Ivory Coast.
Archbishọpụ Jean-Paul
Vesco nke Algiers, Algeria.
Bishọpụ Paskalis Bruno
Syukur nke Bogor, Indonesia;
Archbishọpụ Dominique
Joseph Mathieu nke Tehran Ispahan, Iran.
Archbishọpụ Roberto
Repole nke Turin, Italy.
Bishọpụ Baldassare Reina,
Auxiliary Bishop nke Rome na Vicar General Diocese Rome.
Archbishọpụ Francis Leo nke
Toronto, Canada.
Archbishọpụ Rolandas
Makrickas, coadjutor Archpriest nke Papal Basilica, Saint Mary Major.
Bishọpụ Mykola Bychok nke
Yukrenu Eparchy Saints Peter na Paul nke Melbourne, Australia.
Dominican Fr. Timothy
Peter Joseph Radcliffe, onye bụbu masta nke Dominican Order.
Msgr.George Jacob
Koovakad,