Otu na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) akwaala arịrị maka ndị ntaakụkọ atọ e gburu n’Anambra steeti.
Ndị ojiegbe wakporo ụgbọala bu ndị ntaakụkọ ahụ n’ụzọ sị Ihiala gawa Orlu n'ụbọchị Tuzde 8 Ọktoba, 2024
Dịka ozi ngalaba mgbasaozi otu NFF zipuru “onyeisi NFF bụ Alhaji Ibrahim Musa Gusau kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obị kemgbe ụbọchị Tuzde abalị 8 nke ọnwa Ọktoba, afọ 2024 bụ ụbọchị ndị ejiegbe gbagburu ndị ntaakụkọ mmadụ atọ ahụ”.
“Ndị egwuregwu na Naịjirịa na ụlọọrụ Supersports nwere ezigbo mmeko na adịmnamma. Supersports na-enye aka eme ka ndị Naịjirịa na-enwe obiụtọ.
"Ekpere anyị bụ ka Chineke gbaa ezinaụlọ ndị e gburu ume, ma gbakwa ụlọọrụ Supersports ume”.
“Ugbua anyị ka na-ekpe ekpere ka otu onye so n’ụgbọala ahụ lọghachịta. Ka ọ lọta ma lakwuru ezinaụlọ ya.”
NFF gara n’ihu kelee ndị ọrụ nchekwa maka mbọ niile ha na-agba kemgbe mkpamkpa ahụ kpara.
Oge anyị kpọtụụrụ Gọọmenti Anambra steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Christian Aburime gwara onye ntaakụkọ anyị ka ọ kpọtụrụ ndị uweojii maka akụkọ ahụ.
Mana ka ọnọdụ dị ugbua, ndị uweojii ekwubeghị okwu gbasara ndị ntaakụkọ ahụ e gburu n'agbanyeghị mbọ niile BBC Igbo gbara ka anyị nwete ọsịsa ha.
Oge anyị na-ebipụta akụkọ a, anyị amabeghị ọnọdụ onye nke a na-achọ achọ nakwa ọnọdụ ezinaụlọ ndị ntaakụkọ ahụ e gburu.
Ihe Peter Obi kwuru maka ndị Supersports Tv e gburu
Onye zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi akatọọla etu ndị ojiegbe si egbu ụmụ Naịjirịa ma na-atọrọ ha ma kọwaa ọnọdụ ahụ dịka ihe jọgburu onwe ya.
Peter Obi, onye kwuru na ọnọdụ ahụ na-akawanye njọ katọrọ ka ndị omekoome siri wakpoo ndị ntaakụkọ na-arụrụ ndị SupersportsTV ọrụ oge ha na-aga Uyo, dị n'Akwa Ibom steeti maka asọmpi ndị Ugo Naịjirịa nwere.
Dịka Obi siri kwuo “ndị ejiegbe gburu ụfọdụ ma tọrọ ndị ọzọ”.
Ebe mkpamkpa ahụ kpara bụ n’ụzọ Ihiala dị n’Anambra nke na-aga Orlu, Imo steeti.
Peter Obi bere akwa arịrị ma kwuo na ugbua “na Naịjirịa amaghịzi mmadụ ole na-anwụ maka ajọ ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba dị ugbua”.
Obi jikwa ohere ahụ jụọ sị “kedu mgbe anyị ga-agwa ndị na-egbu ụmụ amaala na nke a bụ nke ikpeazu?”
Ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị e gburu ụmụ ha ma rịọ ndị ọrụ nchekwa ka ha tinyekwuo uchu maka ichekwa ndụ na akụnụba ụmụ Naịjirịa.