You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. Paul Biya: E gbochiela ụlọmgbasaozi ịkpa maka ahụike onyeisiala Cameroon

    Ndị ọchịchị Kameruun amachiela ụlọmgbasaozi dị iche iche ikwu okwu gbasara ọnọdụ ahụike Onyeisiala ha bụ Paul Biya dịka a nọchara na nso nso a fesaa akụkọ ụgha na ọ nwụọla.

    Minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme na Kameruun bụ Paul Atanga Nji gwara ndị gọvanọ mba ahụ na ya bụ akụkọ ụgha “kpara udo ụmụafọ Kameruun aka ọjọọ”.

    O kwusiri ya ike na “Amachiela nrụrịtaụka ọbụla a na-ahazi n’ụlọmgbasaozi gbasara ọnọdụ onyeisiala” ma yiekwa egwu na “ndị ọbụla nupụrụ isi na ntụziaka ahụ ka a ga-ekpe ikpe.”

    Ejibeghị anya hụ Onyeisiala ahụ gbara afọ iri itolu na otu (91) kemgbe ọ gachara Beijing maka ọgbakọ dị n’etiti Chaịna na Afrịka n’abalị 8 Septemba 2024.

    Ọ karịala afọ iri anọ (40) Paul Biya banyere n’ọkwa dịka onyeisiala Kameruun.

  2. A napụla mmadụ 9 ikikere ịbụ ụmụafọ Niger

    Ndịagha na-achị mba Nijie Rịpọblik anapụla mmadụ itolu ikikere ịbụ ụmụafọ mba ahụ dịka e boro ha ebubo iyi ndụ egwu, ịgba gọọmenti mgba okpuru na igbochi udo ọhanaeze.

    N’ozi ọ gụpụtara n’ụlọmgbasaozi tivii mba ahụ, onyendu ndịagha bụ General Abdourahmane Tchiani bịnyere aka n’iwu n’ụbọchị Tọzde 10 Ọktoba 2024 ka a napụ mmadụ ndị ahụ ikikere ị bụ ụmụafọ Nijie maka itinye aka n’omume ndị pụrụ ịkụnye ụkwụ na nchekwa mba ahụ.

    Ozi ahụ kwuru “Mmadụ ndị ahụ ka a na-enyo enyo itinye aka n’agwa ndị pụrụ igbochi udo na nchekwa, nakwa ịgbakọọrọ ikikere mba ọzọ aka nke ebumnoobi ya bụ ịkpalite ọgbaagbara megide mba anyị.”

    O dobeghị anya ebe mmadụ ndị ahụ bi mana ọ dịka ha bụ ndị mbụ a na-ebo ebubo iyi ndụ egwu site n’ọbaozi ndịagha na-achị Nijie Rịpọblik kepụtara n’ọnwa Ọgọst.

    N’ime mmadụ itolu ahụ a napụrụ ikikere ịbụ ụmụafọ Nijie gụnyere Rhissa ag Boula bụbu obere Minista n’oge ọchịchị Mohamed Bazoum.

  3. Ụlọomeiwu nta Naịjirịa akwadoola atụmatụ iwu ga-enye FRSC ikike ibu egbe

    Ụlọomiwu nta Naịjirịa akwadoola atụmatụ iwu maka nkepụta ngalaba ụlọọrụ Federal Road Safety Commission (FRSC) ga-enwe ikike ibu egbe

    Atụmatụ iwu ahụ nke Abiodun Derin Adesida na Olaide Lateef Mohammed binyere aka na ya, bụ nke chọrọ ka e kewapụta ngalaba FRSC Special Armed Squad.

    Atụmatụ iwu chọrọ ka ndị ọrụ FRSC nweta ezi nkuzi banyere nchekwa n’okporoụzọ ma mee ka ndị ọrụ FRSC ruru ọkwa Deputy Corps Marshal nweeike irite uru dị n’ọkwa ahụ tinyere uru ezumike nka ya na ya so.

    N’aka nke ọzọ, iwu ahụ chọrọ inye ndị ọrụ FRSC ikike iwepụ ihe mgbochi ọbụla n’ụzọ ma kuziere ndị ọkwọụgbọala na ọhanaeze etu ha ga-esi chekwaa onwe ha n’okporoụzọ.

    Ka a gọpụtara atụmatụ iwu ahụ, ndị omeiwu kwadoro ya ma nyefe ya ka agụọ ya nke ugboro abụọ.

  4. Oke ifufe Hurricane Milton egbuola mmadụ 16 na Florida, mba Amerịka

    Ihe ruru mmadụ 16 anwụọla dịka oke ifufe Hurricane Milton na-aga n’ihu na-akpa mkpamkpa na steeti Florida mba Amerịka. Mana akụkọ kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwereike ịrịgo dịka ndị ọrụ gbatagbata na-aga n’ihu n’ọrụ nzọpụta ndị o metụtara.

    Akụkọ kwuru na ụlọọrụ na azụmahịa na ụlọ obibi ruru nde abụọ enweghịzi ọkụ latrik ebe anapụtagoro ọtụtụ mmadụ na mpaghara ide mmiri metụtara

    Ihe oyonyo e kesara na soshal midia gosịrị oge ndị ọrụ Coasta Guard ji ụgbọele helikọpta gbapụtara otu nwoke mmiri Gulf nke Mexico buru.

    Ndị ọrụ agwala ndị bi na mpaghara Florida ka ha kwapụ maka a na-atụanya na oke ide mmiri nwereike ị bịa n’abalị ole na ole na-abịa.

    N’aka nke ọzọ, a gwara ndị mmadụ ka ha ghara ị ga n’ogige oke ifufe ahụ metụtara.

  5. Ndịagha Naịjirịa akọwaala ihe mere n’Ehime Mbano, Imo steeti

    Ọnụ na-ekwuru Ndịagha na 82-Div bụ JE Unuakhalu ekwuola na ọ bụ okwu ụgha na a wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ ha n’Ehime Mbano dị n’Imo steeti.

    Unuakhalu kwuru nke a n’akara X bụ ebe ọ nọ kọwaa ihe mere. N’okwu ya “anyị anụla akụkọ n’efegharị n’ịntanet na-ekwu na a wakporo ndịagha Naịjirịa n’okpuru ọchịchị Ehime Mbano dị n’Imo steet bụ nke kpara ọnwụ ọtụtụ ndịagha ma ndị nkịtị”.

    “Akụkọ ahụ bụ okwu ụgha ma bụrụ okwu ndi IPOB/ESN ma ndị na-akwado ha na efegharị”.

    “Ọ dị mma ka anyị cheta n’abalị atọ nke ọnwa ọktoba afọ 2023 ka ndị IPOB gbara ụlọọrụ gọmenti okpuruochichi Isiala Mbano ọkụ bụ nke ha chọkwara ime n’abalị asatọ nke ọnwa Ọktoba 2024 n’okpuru ọchịchị Ehime Mbano”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na IPOB na ndịagha kwakọtara mgbọ mana ndịagha churu ha ọsọ nke mere ọtụtụ n’ime ndị IPOB jiri meruo ahụ. “82-Div na-agwa ohaneze na ndị niile bi n’Imo steeti nakwa ndị niile bi na ndịda ọwụwa anyanwụ ka ha na-agwa ndị ọrụ nchekwa ihe ha maara gbasara ndị omokome niile bi na mkpaghara ahụ”.

  6. Ụlọikpe mkpegharị agwala Gọvanọ Fubara ka ọ nyegharịa ndị omeiwu Bọjetị 2024

    Ụlọikpe mkpegharị agwala Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Siminialayi Fubara ka ọ were bọjetị nke afọ 2024 nyeghachi ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ ka ha tụlee ya ma mee ka ọ bụrụ iwu.

    Cheta na e nwere oge ọgbaaghara tisara ụlọ omeiwu Rivas steeti ụzọ abụọ, nke mere e ji nwee ndị nke na-eso Gọvanọ Fubara ma nwekwa ndị ke na-agba ya ụkwụ bụ ndị karịrị n’ọnụọgụ.

    Oge Ọkaikpe Omotosho nke Ụlọikpe mkpeghari tinyere anya n’akwụkwọ Gọvanọ Fubara gbara gbasara ikike ndị omeiwu mmadụ anọ ahụ bụ ndị nabatara mmefu ego steeti ahụ nke afọ 2024; Ọkaikpe Omotosho kwuru na Gọvanọ Fubara enweghị ikike ịgba akwụkwọ.

    Ọ sịrị na Gọvanọ Fubara sepụrụ aka ma wepụ iyi ọ ṅụrụ oge ikpe ahụ nọ n'ụlọikpe nta nke mere na ọ nweghịzi ikike ọzọ ịgba akwụkwọ megide ikpe Ụlọikpe nta ahụ kpere.

    Ọ gara n’ihu gwa Gọvanọ Siminialayi Fubara na bọjetị afọ 2024 o ji arụ ọrụ adịghị n’iwu ma nye ya iwu ka ọ gaa nyeghachi ndị omeiwu bọjetị ahụ ka ha tụlee ya.

  7. Ndị Boko Haram a sị chegharịrị eburula egbe ndịagha gbalaga

    Ndị Boko Haram a sị chegharịrị echegharị bụ ndị a nabatara n'ọrụ ndịagha eburula egbe na ọgbatumtum ndịagha gbalaga na Borno steeti.

    Akụkọ kwuru na ndị ahụ bụbụ agha Boko Haram chiliburu aka elu bụ ndị e tinyere ka ha na ndịagha na-arụ ọrụ n'agha megide tigbuo-zogbuo ndị Boko Haram na steeti ahụ.

    Ndị ahụ bụ ndị ha na ezinaụlọ ha chiliburu aka elu sị na ha anọghị kwa n'otu Boko Haram soro rite elele n' atụmatụ ịgbaghara ndị mere mpụ(amnesty) nke Gọọmentị Borno Steeti hiwere.

    Otu onye ntakụkọ nọ na steeti ahụ gwara BBC Igbo na ya na ụfọdụ n'ime ndị Boko Haram chegharịrị echegharị kpara , ha kwuo na ya bụ ihe mere n'ezie.

    O kwuru na ụfọdụ ha na-ebo ebubo na ha ahụghị ihe nrite e kwere ha na kwa nke mere ka ha sere isi ha.

    Ha gbahapuru ọgige ndịagha dị na Mafa n'etiti abalị mbụ na abalị abụọ nke ọnwa Septemba afọ 2024.

    Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ọnụ na-ekwuru ndịagha mpaghara steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha nọ ọrụ na Borno Steeti bụ Kaptịn Ruben Kovangiya azaghị ekwentị ya nke ọ na-aza ajụjụ e zigara ya n'ekwentị banyere akụkọ a.

  8. Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa enyela nkwado maka nwereonwe gọọmenti okpuru ọchịchị

    Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa ekwuola na ha kwadoro iwu ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nyere n'ọnwa Julaị, 2024 banyere nwereonwe gọọmenti okpuru ọchịchị nke bekee ‘Local Govenment Autonomy’, ma kwuo na ha n’ụlọomeiwu nta Naịjirịa ga-arụ ọrụ nweta ndegharị n’iwu Naịjirịa iji hụ na gọọmenti okpuru ọchịchị nwere onwe ha.

    Ụlọomeiwu ahụ gara n’ihu gwa gọọmenti steeti ọbụla ka ha rubeisi nye iwu ahụ ụlọikpe nyere.

    Okwu ahụ nke Sịnetọ na-anọchiteanya Anambra Nọt bụ Tony Nwonye nọ n'isi ma nwee nkwado Sịnetọ itoolu ndị ọzọ, kwuru mkpa ọ dị ka gọọmenti steeti rube isi n’iwu ahụ iji hụ na-enwere ezi ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa.

    Sịnetọ Nwonye gara n’ihu kwuo na e nwere ọtụtụ steeti na-achọghị ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ. N’okwu ya, gọọmenti ndị a chọrọ imepụta iwu ga-egbochi ha ịkwụ ụgwọ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, Gọvanọ Douye Diri nke Bayelsa Steeti katọrọ akara ọchịchị etiti Naijiria ma kọwaa dịka ọnọdụ jọgburu onwe ya etu ọ bụ naanị Gọọmenti etiti nwere ike ịmepụta gọọmenti okpuru ọchịchị ime obodo dịka ihe nhụsianya.

  9. Nwunye nna m na-akpagbu mụ na ụmụ nne m tupu ndị uweojii anwuchie ya

    Ndị uweojii Imo steeti agbapụtala nwaada Amarachi Emmanuel na ụmụ nne ya n’aka nwunye nna ya n’emekpa ọ na-akpagbu ha.

    Amarachi Emmanuel gbara afọ 12 gwara ndị uweojii na nwunye nna ya aha ya bụ Blessing Emmanuel na-emesị ya na nwanne ya ike ma na-ata ha ahụhụ nke dị ukwuu.

    Ozi banyere akụkọ a pụtara ihe ka onye ntaakụkọ Chidiebube Okeoma kesara vidio gọsịrị nwaada Amarachi Emmanuel ebe ọ na-ere mmiri pure water n’okporoụzọ n’akara soshal midia ya. Ihe vidio ahụ bụ nke mere ka ụfọdụ malite ịjụ ajụjụ banyere ọnọdụ ahụ nwaada Amarachi Emmanuel nakwa ihe butere ọnya juru ya ahụ ya niile.

    Ihe foto BBC Igbo nwetara gosịrị anya nwaada Amarachi Emmanuel na-acha ọbara ọbara site n'ihe nwunye nna ya tiri ya nakwa afọ na ụkwụ ya gbara ọkụ

    Chidiebube Okeoma kwuru na o degara isi ụlọọrụ ndị uweojii Area command dị n’Owerri, isi obodo Imo steeti banyere ọnọdụ nwaada ahụ.

    Ozi kwuru na ndị uweojii gara ngwangwa wuchi nwunye nna ahụ bụ Blessing Emmanuel onye akụkọ kwuru na ọ bụ onye nkuzi.

    Ka ọ dị ugbua a, nwaada Amarachi Emmanuel nọ n’ụlọọgwụ Umuguma General hospital enweta nleta ebe kọmishọna ndị uweojii Imo steeti bụ Aboki Danjuma enyela iwu ka e mee nyocha banyere okwu ahụ.

  10. Ndị uweojii atọhapụla Speed Darlington

    Ndị uweojii Naịjirịa enyela Darlington Okoye onye a maara dịka Speed Darlington ntọhapụ beelu.

    Nke a na-abịa dịka ndị uweojii wuchiri nwaamadi ahụ ụbọchị Fraịde 4 Ọktoba 2024 ka otiegwu Damini Ogulu onye a ma ama dịka Burna Boy degara ndị uweojii akwụkwọ banyere ihe oyonyo Speed Darlington mere maka ya.

    Speed Darlington nwetara ntọhapụ beelu ka ọkaiwu ya bụ Deji Adeyanju kwuru na nwaamadi ahụ mezuru iwu niile dị n’akwụkwọ beelu ahụ.

    Ọkaiwu Deji Adeyanju kwuru na enweghị ihe ọbụla dị n’akwụkwọ mkpesa ahụ Burna Boy degara ndị uweojii kwesịrị ime ka ndị uweojii wuchie Speed Darlington.

    Cheta na akụkọ pụtara ihe na a na-achọ Speed Darlington achọ ihe ruru abalị atọ. Nke a mere ka ndị ezinaụlọ ya na ndị enyi ya malite cịchọ ya.

    Ihe vidio fesara na soshal midia gosịrị ebe nne Speed Darlington a kpọrọ Queen na-arịọ Burna Boy ka ọ tọhapụ nwa ya nwoke. O kwuru na Burna Boy duuru ndị uweojii bịa n’ụlọ Speed Darlington ma wuchie ya.

  11. Oke ifufe 'Hurricane Milton' emebiela ụlọ ruru nde abụọ na Florida, mba Amerịka

    oke ifufe Hurricane Miilton amalitela ịkpa mkpamkpa na Florida. Akụkọ kwuru na ụlọ, ụlọọrụ na azụmahịa ruru nde abụọ enweghịzi ọkụ latrik ebe ozi kwuru na ọtụtụ mmadụ anwụọla na mpaghara Atlanti coast.

    Na mpaghara St Petersburg, anyị nụrụ na oke ikuku akụpụla gbamgbam ama egwuregwu Major League Baseball stadium.

    Oke ifufe ‘Milton’ bụ nke ndị ọkachamara kọwara dịka nke nọ n’ogogo ise ma bụrụ nke na-akpe ike dị egwu.

    Cheta na n’izu ụka abụọ gara aga, oke ifufe ahụ Hurricane Helen gburu ihe ruru mmadụ 225 na Florida, Georgia, Saụt Karolina, Tennessee, Virginia na Nọt Karolina.

    BB chọpụtara na ndị nọ na St Petersburg enweghi mmiri ọnụnụ maka na ndị ọchịchị machiri ụlọọrụ mmiri ọṅụṅụ n’ihi mmebi sitere n’oke ifufe ahụ.

    Ndị ọchịchị kwuru na mmachi ahụ ga-adịgide ruo oge ha ruzichara ihe ndị mebiri, mana oke ifufe ahụ ekweghị ha rụọ ọrụ.

    A gwala ndị bi ebe ahụ ka ha sie mmiri ọbụla ha chọrọ ịṅụ, jiri saa eze maọbụ jiri sie nri n’ọkụ

  12. Ndị uweoji ejidela dọkịnta Emmanuel Chimaobi Ugwumba bụ nwoke e bọrọ ebubo na ọ na-ere ụmụaka.

    Dọkịnta Emmanuel Chimaobi Ugwumba dị afọ 52 bụrụ nwa afọ Ezimo-Agu, dị n’okpuru ọchịchị Udenu dị n’Enugwu steeti. Ọnụ na-ekuru ndị uweoji n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe mere ka amata ihe mere tupuu ndị uweoji aga nwuchi Dọkịnta Emmanuel Chimaobi Ugwumba.

    N’okwu ya “Ọ bụ maka mgbasa ozi ọ mere n’akwụkwọ ndị Daily Sun Newspaper n’ọnwa Seputemba 27, afọ 2024 maka nwatakiri ezinaụlọ ya tufuru mere anyị ji nwuchie ya.

    O ji aha ụlọọrụ ndị Enugu State Ministry of Gender and Social Development dịka onyeisi ngaraba OTZ nwere mee mgbasa ozi ahụ

    ”Oge anyị nwuchiri ya ka anyị chọpụtara na ọ na atụ mgbere ụmụaka. Anyị nwetere nwanyị dị ime n’aka ya, nwatakịrị ahụ ọ bịpụtara fọtọ no be ya, nwatakịrị ọzọ dị afọ abụọ sọ na ndị anyị nwetere n’aka ya”.

    “Anyị chọpụtara na Emmanuel Chimaobi Ugwumba nwere ụlọọgwụ ebe ọ na-amụ nwa dị na Ugbaike Enugu-Ezike, n’okpuru ọchịchị Igbo-Eze”.

    “A chọpụtara na bido n’afọ 2017 ruo n’afọ 2024 na ya na ndị ọrụ Ugbaike Enugu-Ezike in Igbo-Eze jịkọrọ aka ọnụ nwere lekota ụmụnwanyị dị ime ma mụọ ụmụaka rụrụ asaa bụ ndị amabeghị ebe ha nọ ugbua”.

    “A hụkwara akwụkwọ dị icheiche anyị hụrụ n’aka ya bụ nke ndị Enugu State Ministry of Gender and Social Development bụ akwụkwọ ndị onweghị ikike ya ịnọ ya n’aka”.

    “Anyị kpọpụrụ ya ụlọikpe bụ ebe ọkaikpe zịgara ya n’ụlọ mkpọrọ rụọ mgbe ụlọikpe ga-anụ okwu gbasara ya ọzọ”.

  13. Lee ka ọkwọ ụgbọelu bu ndị mmadụ sị nwụọ n'elu na mba Amerịka

    Otu onye ọkpụ ụgbọelu bu ndị mmadụ sị na Seattle dị na mba US nwere na-aga Istanbul dị na mba Turkey kubiri ma nwụọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Turkish Airlines bụ Yahya Ustun kwuru na nwoke ahụ dị afọ 59, aha ya bụ Iicehin Pehivan.

    Yahya Ustun kwuru na ọ kubiri n’elu oge ọ na-anya ụgbọelu nke mere osote ya jiri nwere oche.

    Ọ sị na “ndị ọrụ ahụike gbatagbata gbara mbọ ka ha zọpụta Iicehin Pehivan mana onweghị ịsị nke mere ha jiri mee ka ụgbọelu ha kwụsị njem ma daa na mberede.

    Mana Pehivan awụọla tupuu ha adaa n’ala”. Ụgbọelu ahụ bụ Airbus A350 sị Seattle dị na US na-aga Istanbul dị na mba Turkey, mana ọ dara na mberede na New York.

    Oge ha sị na Seattle fenie elu, ọkpụ ụgbọelu ha enweghị nsogbu mana ọnọdụ ahụike ya gbanwere oge ha ruru mpaghara Nunavut dị na mba Canada.

    Ọ bụ oge ahụ ka osote ya nwere oche ma tinye ụgbọelu ahụ isi na ọdụ ụgbọelu John F Kennedy dị na New York.

    Mana ndị ọrụ Turkey Airline kwuru na Iicehin Pehivan na-eme nyocha ahụike ya kwamgbe kwamgbe ma n’ọnwa Maachị afọ a ka ọ mere nyocha ọzọ mana ahụghị ọrịa nwereike ịgbọchị ya ịrụọrụ ya dịka ọkpụụgbọelu.

    Mana ruo ugbua, ha edeputabeghị ihe kpatara ọnwụ ọkpụ ụgbọelu a.

  14. Usoro ọhụrụ e wepụtara maka ọkọlọtọ na egwu njirimara Naịjirịa eme

    Onyeisi ụlọọrụ National Orientation Agency (NOA), Mallam Lanre Issa-Onilu ekwuola na e nwere ụdụrị ihe ndị mmadụ ekweghị iji ọkọlọtọ ma egwu njirimara Naịjirịa nwere mee.

    Onye osote onyeisi na ngara mgbasaozị n’ụlọọrụ NOA bụ Paul Odenyi kwuchitere ọnụ Mallam Lanre Issa-Onilu n’akara X soshal mịdịa ha ma kọwaa nghọtafe dị n’ikike ahụ ndị mmadụ kwesiri iwete n’aka NOA tupuu ha ejiri egwu njiri mara Naịjirịa nakwa ọkọrọtọ Naịjirịa mee ihe.

    Cheta na akụkọ na-ekwu na ndị NOA nyere iwu na tupuu mmadụ ejiri ọkọrọ Naịjirịa rụpụta foto ma ọ bụ jịrị ọkọrọtọ Naịjirịa meputa ihe ọbụla na ha ga-enwete ịkịke.

    Mana Paul Odenyi kwuru na X sị na ọbụghị eziokwu na NOI kwuru na onye ọbụla chọrọ ịgụ egwu njirimara Naịjirịa ga-enweta ikike n’aka ha. Ọ sị na “nke bụ eziokwu bụ na Mallam Lanre Issa-Onilu na-ekwu na ndị na arụpụta ọkọrọtọ njirimara Naịjirịa ma jiri ya na-atụ mgbere kwesiri ịnata ịkịke n’aka NOA”.

    “Ndị ji egwu njirimara Naịjirịa arụpụta ihe onyonyo ma ọ bụ egwu e ji ere ahịa kwesiri ịbịa nwere egwu ahụ n’aka NOA”.

    Ọ gara n’ihu gwa ụmụ amaala Naịjirịa ka ha hara ige asịrị ndị na-ekwu na ọ bụ iwu na NOA ga-enye ha ịkịke tupuu ha agụọ egwu njiri mara Naịjirịa.

  15. NNPC agbanweela ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke ugboro atọ n’otu afọ

    Ọtụtụ ọdụ mmanụ ụgbọala nke Nigerian National Petroleum Corporation Ltd agbanweela ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke ugboro atọ n’otu afọ na Naịjirịa.

    Ufọdụ ọdụ mmanụ NNPC dị na Legọs na Abuja na-ere otu lita 998 na Legọs ebe otu lita n’Abuja bụ 1,030 naịra.

    Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ NNPC ekwubeghị ihe ọbụla banyere mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala ahụ.

    Cheta na n’ọnwa Septemba, ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation Limited wepụtara akwụkwọ ozi ha kwuru na ọ bụ ya bụ ego ole a ga-ere otu lita mmanụ ụgbọala. Ha kwuru na ha ne-ere ya etu ha si zụta n’aka ụlọọrụ Dangote.

  16. Kais Saied enwetela mmeri nke ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Tunisia

    Onyeisiala mba Tunisia bụ Kais Saied enwetela mmeria nke ugboro abụọ na ntụliaka onyeisiala e mwere na mba ahụ. Ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka na mba ahụ kwuru na Kais Saied jiri vootu dị pasenti 90 merie na ntụliaka ahụ.

    Ọ bụ naanị mmadụ abụọ n’ime mmadụ iri na otu kwuru na ha chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ ka e nyere ikike ịzọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka ahụ e mere ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba.

    Akụkọ kwuru na n’ime mmadụ dị nde itoolu (9 million), ọ bụ naani pasenti 29 n’ime ha sonyere tụọ vootu na ntụliaka ahụ.

    Onye gbara nke abụọ na mpụtara ntuliaka ahụ bụ o ji ego achụ ego Ayachi Zammel, ritere naanị vootu pasenti 7 agbanyehji na a tụrụ ya nga ihe ruru afọ 12 maka ebubo akwụkwọ ụgha abalị ise tupu e mee ntụliaka ahụ.

    Emeghị achụmnta vootu maọbụ nrụrịtaụka ọbụla, ebe akụkọ kwuru na-akwụkwọ achụmnta vootu niile a hụrụ bụ nke na-akwado Onyeisiala Kais Saied.

    Cheta na ọ bụ na mba Tunisia ka ngagharịiwe ndị okpukperechi alakụba malitere n’afọ 2010 nke butere ọchụchụ Zine El Abidine Ben Ali dịka onyeisiala mba ahụ n’afọ 2011.

    Ka a họpụtara ya dịka onyeisiala n’afọ 2019, Kais Saied gbara afọ 66 machiri ntụliaka ụlọomeiwu, degharịa iwu obodo ma nye onwe ikike ọchịchị niile

  17. Ụlọomeiwu mba Kenya amalitela okwu ịchụpụ Osote Onyeisiala Rigathi Gachagua

    Osote onyeisiala mba Kenya bụ Rigathi Gachagua ga-awụchi n’ụlọomeiwu mba Kenya taa maka ịzara ọnụ ya n’ebubo nrụrụaka nke mere ka ụlọomeiwu malite mkparịtaụka ịchụpụ ya n’ọkwa.

    Ebubo e boro Rigathi Gachagua gunyere ichere Onyeisiala William Ruto aka mgba nakwa ịkwado ndị mere ngagharịiwe na ndị na-achọ nkewa obodo.

    A na-ebo Gachagua ebubo na ọ na-eji ụlọọrụ 20 o nwere jiri ezuru ego obodo.

    N’ozi o wepụtara n’abalị Mọnde 7 Ọktoba, Rigathi Gachagua gọnarịrị ebubo ndị ahụ nke ọ kọwara dịka nkata ndị na-agba ya mgba na-akpa iji chụpụ ya n’ọkwa.

    Rigathi Gachagua gara n’ihu kwusie ike na ọ ga azara ọnụ ya megide ebubo ndị ahụ e boro ya.

  18. Onyeisiala Tinubu agwala ndị uweojii ka ha chekwaa ogige isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị na Riva steeti

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ka ndị uweojii chekwaa isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị niile dị na Riva steeti iji gbochie mwakpo n’ụdị ọbụla.

    Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuputara nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara banyere mwakpo ndị a na-amaghị wakporo ọtụtụ isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ ụbọchị Mọnde 7 Ọktoba, 2024.

    Onyeisiala Tinubu gwara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na steeti ahụ ka ha sepụ aka ma nye udo ohere na steeti ahụ.

    Cheta na ọgbaghara bidoro na Riva steeti dịka Gọvanọ Siminalayi Fubara duru ndị isioche okpuru ọchịchị ọhụrụ turu ugo na ntụliaka okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 5 Ọktoba.

    Ndị ekperima agaala mụnye ọkụ n’ụfọdụ isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị Rivas steeti ma chụpụ ndị isioche ọhụrụ e dụrụ n’iyi ọrụ.

    Akụkọ kwuru na Okpuru ọchịchị ndị amụnyere isi ụlọọrụ ha ọkụ gụnyere Ikwerre, Eleme, Obio/Akpor na Emohua.

  19. Ndị ojiegbe atọrọla di na nwunye ọhụrụ na mmadụ anọ ndị ọzọ n’Imo steeti

    Ndi ojiegbe amatabeghị ndị ha bụ atọrọla ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ na mmadụ anọ ndị ọzọ n’Okpuru ọchịchị Obowo dị n’Imo steeti.

    Njinji ahụ jiri mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asatọ nke abalị n’ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba 2024 oge mmadụ isii ahụ ji ụgbọala Toyota Sienna na-agba n’okporoụzọ Nwokeisama Junction dị n’Umulogho, Okpuru ọchịchị Obowo dị n’Imo steeti ịga leta mmadụ.

    Otu onye obodo ahụ bụ Uwalaka Chimaraoke kọwara di na nwunye ahụ a tọrọ dịka Maazị na Oriakụ Chidiebube Bartholomew.

    Chimaraoke kwuru na ha bụ ndị ojiegbe eburula ndị ha tọọrọ rie mbọmbọ tupu ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa awụchie.

    Oge a kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, o kwuru na ya ga-akpọtụrụ onye uweojii na-elekọta mpaghara ahụ iji chọpụta nke bụ eziokwu tupu ya azaghachi anyị.

  20. A mụnyela ọkụ n’ụfọdụ isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị na Rivers steeti

    Ndị ekperima agaala mụnye ọkụ n’ụfọdụ isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị Rivas steeti ma chụpụ ndị isioche ọhụrụ e dụrụ n’iyi ọrụ ụnyaahụ.

    Ọnọdụ na-abịa dịka e wepụsịrị ndị uweojii n’isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị ndị e nwere na Rivas steeti.

    Akụkọ kwuru na Okpuru ọchịchị ndị amụnyere isi ụlọọrụ ha ọkụ gụnyere Ikwerre, Eleme, Obio/Akpor na Emohua.

    E kwuru na ndị a na-enyo enyo na ha na-erubere minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike isi gara weghara isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị Ahoada West dịka a na-atụ egwu na otu onye anwụọla n’Okpuru ọchịchị Ahoada East.

    Ndị isioche Okpuru ọchịchị ndị ọzọ amalitela ọrụ n’udo ma duokwa ndị omeiwu Concillor ha n’iyi ọrụ tupu njinji ahụ amalite.

    Cheta na aka na-achi Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara duru ndị isioche iri abụọ na atọ (23) a họpụtara ọhụrụ na steeti ahụ n’iyi ọrụ n’ụbọchị Sọnde 6 Ọktoba 2024 oge e nyechara ha asambodo e ji họpụta ha n’ọkwa.