You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ụlọikpe enyela EFCC iwu ịnapụ Theodore Orji ego ruru nde naịra 228.4

    Ụlọikpe enyela ụlọorụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commssion (EFCC) ịnapụ Theodore Orji, bụbu Gọvanọ Abia Steeti ego ruru nde narị naịra abụọ na nde iri abụọ na asatọ na ụma anọ (N2228.4m).

    Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nyere iwu ahụ ma kwuo ka EFCC machie ọbaego Theodore Orji nwere n’ụlọakụ maka ebubo ịbụpụ egọ mgbe ọ na-achị Abia Steeti.

    Cheta na EFCC gara n’ụlọikpe inweta ikike ka ha machie ọbaego Theodore Orji ma were ego ahụ nye gọọmenti etiti.

    Ọkaikpe Emeka Nwite mere ihe EFCC rịọrọ ya ma nye ohere ịnụ ikpe ahụ ọzọ n’abalị atọ nke ọnwa Febuwari afọ 2025.

    Ọkaikpe Nwite ga-eji oge ahụ mara ma e mekwara ihe o nyere n’iwu.

  2. Nnamdi Kanu ekwuola Ọkaikpe Binta Nyako agaghị ekpe ya ikpe ọzọ – Aloy Ejimakor

    Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na Nnamdi Kanu enweghi ikpe ọbụla n’ụlọikpe Ọkaikpe Binta Murtala-Nyako nọ n'isi ya.

    Ejimakor mere ka a mata nke a n’akwụkwọ o degaara osote odeakwụkwọ n’ụlọikpe dị elu n’Abuja.

    Ọ kọwara na dịka ọnọdụ ikpe Nnamdi Kanu na Gọọmenti etiti Naịjirịa si di na Ọkaikpe Binta Nyoka enwezugala onwe ya dịka ọkaikpe n’okwu ahụ.

    Ejimakor kwuru na e nwebeghi ihe gbanwere maọbụ nwee ụlọikpe kagburu mkpebi Nyako nyere n'isepu aka n’ikpe Nnamdi Kanu.

    Ọ na-ekwu ihe ndị a maka na ọkaiwu na-anọchita anya gọọmenti Naịjirịa bụ Asiwaju Awomolo degaara osote odeakwụkwọ ụlọikpe ukwu dị n’Abuja akwụkwọ ma na-achọ ka ha hiwe ụbọchị a ga-amalite ikpe Nnamdi Kanu ikpe ọzọ.

  3. Etu Boko Haram si bọọ ọbọ na mwakpoo ndịagha Naịjirịa mere ha

    Otu na-enyi ndụ egwu bụ Boko Haram wakporo ndịagha Naịjirịa n’abalị anọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2025 nke kpara ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

    Mkpamkpa ahụ kpara n’ogige ndịagha Naịjirịa dị n’obodo Gari n’okpuruochichi Damboa nke Borno steeti.

    Odeakwụkwọ mgbasaozi ndịagha Naịjirịa bụ Ọchịagha Edward Buba kwuru na Boko Haram wakporo ụgbọala ndịagha Naịjirịa na-eme nkpagharị n'ihi nchekwa n’ogige ha.

    Ọ sị na ndịgha ụgbọelu nke Naịjirịa bịakwara nyere ndị otu ha aka ma lụsoo ndị Boko Haram agha mgbe ndị Boko Haram na-agba ọsọ.

    Ọ sị na ndị Boko Haram mmadụ 34 nwụrụ mgbe ndịagha na Boko Haram ahụ na-akwakọrịta mgbọ.

    Ndịagha Naịjirịa nwetekwara egbe AK 47 nke ndị Boko Haram ruru iri abụọ na atọ nakwa mgbọ egbe ruru 200.

    Mana ndịagha Naịjirịa mmadụ isii nwụrụ n’oge ha na-akwakọrịta mgbọ.

    Cheta na n’ọnwa Novemba afọ 2024 ka e gburu ọtụtụ ndịagha Naịjirịa n’obodo Kareto dị n’okpuruọchịọchị Mobbar na Sokoto steeti.

    Ọzọ mere n’ọnwa Disemba, mgbe Boko Haram wakporo ndiagha Nịjel mmadụ 40.

  4. Ọ bụ ndị omekome, ọ bụghị Ipob na-eme tigbuo-zogbuo n'Ọwụwa Anyanwụ- Ejiofor

    Ọkaiwu na-anọchitebu Nnamdi Kanu , onye ndu otu Ipob bụ Ifeanyi Ejiofor akpoola oku ka ndị ọrụ nchekwa kwụsị iji ọsọ ebo Ipob ebubo oge ọbụla e nwere nsogbu tigbuo-zogbuo n'Owụwa Anyanwụ.

    Ejiofor kpooro oku a n'ozi o wepụtara ụbọchị Tuzde dịka ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ebe otu onye a na-enyo enyo ndị ọrụ nchekwa nwuchiri kwụpụtara na aka ya na nke ndị otu ya dị na mbiti kwere na Ihiala, Anambra steeti na nsonso a.

    N'abalị 30 nke ọnwa Disemba afọ 2024, ndị omekome wakporo ebe a na-akwa ozu n’ Ihiala dị n’Anambra steeti, ma ndị ma gbuo mmadụ asaa gụnyere ndị ọrụ nchekwa na ndị nkịtị, ebe ndị ọzọ meruru ahụ .

    N'okwu ya, Ejiofor sịrị, "Iji ọsọ ebo Ipob ebubo maka tigbu-zogbuo ọbụla mere n'Ọwụwa Anynawnụ na-emeghị nnyocha ọbụla na-eme ka ike ịgwụ ụmụamala n'inye aka buo agha megide ndị iro na-akwọ aka ọbara ma na-eyi ndị mmadụ egwu."

    Nwa amadi ahụ onye rụtụrụ aka na ọrụ nchekwa obodo bụ ọrụ dịịrị ma ndị obodo ma ndị ọrụ nchekwa, kpọrọ ndị ọrụ nchekwa oku ka ha were aka e ji eso ndị omekome so ndị na-akpa mkpamkpa n'Ọwụwa Anywanwụ ma kwụsị ịna-ahụta ha dịka "ndị ọgụ nnwereonwe."

    Ọ sịrị, "Ndị a bụ ndị omekome, so ha ka e si eso ndị omekome.

    Ha abụghị ndị na-alụ ọgụ nnwereonwe. Ha bụ ndị ike ọchịchịrị, ndị mbibi na ndị mmebi."

    Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị ezigbo nwa afọ Igbo maọbụ nwa Biafra ya na ndị omekome ga-ejikọ aka na-egbu ma na-atọrọ ndị nke ya.

    " Ha bụ ndị obi akpo kwesịrị ịta ahụhụ maka mkpamkpa ha kpara."

  5. A zọpụtala ọtụtụ narị mmadụ n'alaọmajijiji mere na Tibet, China

    Ndị ọrụ gbatagbata ruru puku iri na anọ (14,000) awụchiela Tibet na mbọ a na-agba iji zọpụta ọtụtụ mmadụ tọrọ oge alaọmajijiji mere ma gbuo mmadụ ruru 126 n’obodo dị na Chaịna.

    Akụkọ kwuru na a zọpụtala mmadụ 400 kemgbe alaọmajijiji ahụ mebiri ọtụtụ ụlọ na mpaghara Mount Everest mere ụbọchị Tuzde 7 Jenụwarị, 2025.

    Osote Onyeisi bụ Zhang Guoqing rutere ebe ahụ ụbọchị Wenezde 8 Jenụwarị iji hụ ka ọrụ gbatagbata nke e kwuru na oke oyi na-egbochi si aga ebe ahụ.

    Alaọmajijiji bụ ihe na0emekarị na mpaghara ahụ mana a na-ekwu na alaọmajijiji nke bụ nke kachasị egwu n’ọtụtụ afọ.

  6. A gwala puku mmadụ pụọ n’ụlọ ha dịka nnukwu ọkụ na-agba n'ime ime obodo Los Angeles

    E tinyele ọnọdụ gbatagbata na Los Angeles mba Amerịka maka nnukwu ọkụ na-agba n’ala sitere acres iri ruo ihe karịrị puku acres abụọ na narị itoolu (2,900 acres) n'ime ọtụtụ awa.

    Onyeisi ndị ọrụ na-agbaṅụ ọkụ bụ Kristin Crowley agwala mmadụ karịrị puku iri atọ ka ha pụọ n’ụlọ ha dịka ọkụ ahụ na-aga n’ihu agbari ọtụtụ ụlọ.

    Ihe onyonyo anyị hụrụ gosiri ọtụtụ ụlọ na-agba ọkụ na mpaghara Pacific Palisades ebe ọtụtụ mmadụ hapụrụ ụgbọala ha gbalaga.

    Ọkụ ahụ malitere n’abalị Tuzde 7 Jenụwarị. Akụkọ kwuru na oke ikuku nyere aka fesaa ọkụ na mpaghara obodo ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na ndị a ma ama so na ndị a gwara ka ha pụọ n’ụlọ ha maka ọkụ ahụ.

  7. Ụtụtụ ọma ndị ihe ọma na-amasị

    Unu asaala chi ee.

    Daalụ maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo dịka anyị na-ewetara gị akụkọ si mbaụwa.

    Ndewo nu.

  8. E butuola onye uweojii n’ọkwa, kposaa ngalaba ‘Anti-Cultism Unit’ n’Abịa steeti

    Ụlọọrụ ndị uweojii Abịa steeti ebutuola onye uweojii nọ n’ọkwa ‘corporal’ ka ọ bụrụzie ‘constable’ n’ihi akparamaagwa na-ezighị ezi n’ihu ọhanaeze.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka kwuputara nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Tuzde 7 Jenụwarị 2025.

    Onye uweojii ahụ e buturu n’ọkwa bụbu Corporal Ebuka Okonkwo na-arụ ọrụ na Area Command dị n’Aba mana e zigara ya n’ọrụ pụrụiche n’Isuochi.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, e nwere ya bụ mkpebi oge e mechara ya nnyocha ma chọpụta na o mere omume na-ezighị ezi n’ihu ọhanaeze.

    N’aka nke ọzọ, Chinaka kwuru na kọmịshọna ndị uweojii n’Abịa steeti bụ Danladi Isa ekposaala ngalaba ndị uweojii na-ebu agha megide otu nzuzo bụ Anti-Cultism Unit n’ihi omume na-ezighị ezi.

    Ọ sịrị na Isa mere nke a dabere n’ọhụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ihibe ndị uweojii maara nke ha riri, ndị na-erube isi n’iwu nakwa ndị nwere obi mmadụ.

  9. E duola John Dramani Mahama n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala Gana

    A nọrọ taa Tuzde, 7 Jenụwarị, 2025 duo John Dramani Mahama n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala Ghana na Ọkankụzi Jane Naana Opoku Agyemang dịka Osote Onyeisiala Gana.

    Cheta na John Mahama nke pati National Democratic Congress ji vootu dị pasenti 56.55 merie Mahamudu Bawumia nke pati New Patriotic Party onye nwetara vootu dị pasenti 41.61 na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere ụbọchị Satọde 7 Disemba, 2024 na Gana.

    Mmemme idu n’iyi ọrụ a nke dọtara ọtụtụ ndị isiala mba dị iche iche n’Afrịka, kpọtụrụ taa n’ogige Black Star Square dị n’Accra, isi obodo Gana.

    E dukwara ndị omeiwu ọhụrụ Gana n’iyi ọrụ taa tupu a malite mmemme idu n’iyi nke Onyeisiala na Osote Onyeisiala.

    Ndị isiala ruru iri abụọ na atọ bịara mmemme ahụ gụnyere Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu onye bụkwa onyeisioche Ecowas.

    Cheta na John Mahama chịburu Gana n’afọ 2012 ruo afọ 2017.

    Ka ọ dị ugbua, Ọkankụzi Jane Naana Opoku Agyemang bụ nwaanyị mbụ ga-abụ ga-eji ọkwa Osote Onyeisiala Gana.

  10. Ogbunigwe nwataakwụkwọ webatara n’ụlọakwụkwọ akpaala mkpamkpa n’Abuja

    Ụlọakwụkwọ Sani Uthman Islamiya dị n’ime obodo Kuchibuyi n’Okpuru ọchịchị Bwari dị n'Abụja ka nwataakwụkwọ ji ogbunigwe bata n’ime ya.

    Ogbunigwe ahụ gburu onye ahụ ji ya ma meruo ndị ọzọ ahụ.

    Ebe mkpamkpa ahụ kpara bụ n’ụlọakwụkwụ ndị na-enweghị nne maọbụ nna a na-akpọ almajiri na-agụ akwụkwọ.

    A na-ekwu na nwata akwụkwọ ahụ ji ogbunigwe bịa akwụkwọ si Katsina lọghachita n’Abuja n’abalị gara aga.

    E kwuru na “Ogbunigwe ahụ gbara mgbe nwataakwụkwọ ahụ na-egosi ya nwataakwụkwọ ọzọ”

    “Onye nke ji ya nwụrụ ozugbo ozugbo ebe onye nke abụọ nwụrụ n’ụlọọgwụ”.

    Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abụja bụ Josephine Adeh wepụtara kwuru na “ọ bụ n’abalị isii n’ọnwa Jenuwari, afọ 2025 n’ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ ka mkpamkpa ahụ kpara”.

    Ha sị na “ụmụnwoke atọ si Kastina steeti bịara hụ onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ bụ Mallam Adamu Ashimu. A na-enyo enyo na ọ bụ mmadụ atọ ndị ahụ webatara ogbunigwe ahụ. Mana mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ndị ahụ nwụrụ mgbe ogbunigwe gbara, ebe nwoke ọzọ na nwaanyị na-ere ahịa n´ụlọakwụkwọ ahụ merụrụ ahụ”.

    Ndị uweojii kwuru na ha jidere onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ ka ha jụọ ya ajụjụ ma mechie agụmaakwụkwọ n’ebe ahụ.

  11. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ gburu nwanne ha nwoke ma lie ya n'Anambra Steeti

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha anwụchiela ụmụnne abụọ jịkọrọ aka gbuo nwanne ha nwoke ma lie ya n’Oko, dị n’okpuru ọchịchị Orumba Nọt, Anambra steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga kwuru na mmadụ abụọ ahụ aha ha bụ Chidiebere Okeke na Emebo Ogochukwu jịkọrọ aka tigbuo nwanne ha nwoke Chibuzor Okeke maka ebubo ohi.

    Ikenga kwuru na mmadụ abụọ ahụ tiri Chibuzor ihe ruo oge ọ kwụsịrị ikuume. Ngwa Ngwa nke e mere, ha bugara ya ụlọọgwụ ebebdọkịnta nọrọ kwuo na ọ nwụọla.

    Ka nke a mere, Chidiebere na Emebo buru ozu Chibuzor, gwuo ili n’ogige ụlọ ha ma lie ya iji kpochie ajọ agwa ha kpara.

    Tochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachi ma kwuo na a ga-akpụpụ mmadụ abụọ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha.

  12. Mmadụ 95 anwụọla n’alaọmajijiji mere na Tibet, mba Chaịna

    Ihe ruru mmadụ 95 anwụọla ebe mmadụ 130 meruru ahụ oge ala ọmajijiji mere na mpaghara Tibet, mba Chaịna.

    Akụkọ si n’ụlọọrụ US Geological Survey, kwuru na alaọmajijiji ahụ mere n’ala nsọ Shigatse dị na Tibet n’elekere mbụ nke ụtụtụ. E kwuru na alaọmajijiji mekwara na Nepal nakwa ọtụtụ mpaghara mba India.

    Nnyocha na-ekwu na alaọmajijiji bụ ihe na-emekarị na mpaghara ndị a.

    Shigatse bụ ala nsọ kachasị na Tibet. Ọ bụ isioche Panchena Lama, onye ọkwa ya gbagotara n’okpukperechi Buddism.

    Alaọmajijiji a mere bụ nke a kọwara dịka nke kachasị n’ime ọtụtụ afọ na Chaịna.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ agbaṅụọla ọkụ na mmiri na mpaghara Tibet.

    Ndịagha ụgbọelu Chaịna amalitela ọrụ ịzọpụta ndị alaọmajijiji a metụtara.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Xi Jinping akpọọla oku ka a malite ọrụ ịchọpụta ma zọpụta ndị alaọmajijiji metụtara iji belata ọnwụ nwereike isite na ya.

    A na-ekwu na ọtụtụ mmadụ bi na Kathmandu gbapụ n’ụlọ ha oge alaọmajijiji ahụ mere.

  13. Ndị be anyị unu abọọla chi?

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Daalu dịka ị na-esonyere BBC Igbo taa maka akụkụ gbara ọkpurukpu si mbaụwa.

  14. EFCC achụọla ndị ọrụ ha mmadụ 27 maka mpụ

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) achụọla ndị ọrụ ha iri abụọ na asaa (27) maka mpụ na igwu ndị mmadụ chandum.

    Dele Oyewale bụ ọnụ na-ekwuru EFCC sịrị na ha chụrụ mmadụ iri abụọ na asaa ndị ahụ dịka ngalaba na-ahụ maka akparamaagwa ndị ọrụ EFCC si nye ha ndụmọdụ ma kwuo na onyeisi ụlọọrụ ha bụ Ola Olukoyede binyere aka na ya.

    Ọ kwuru na EFCC adịghị akwado mpụ, iri ngarị na igwu mmadụ chandum.

    Ọ kwere nkwa na EFCC na-enyocha ebubo niile e boro onye ọrụ ha ma kwuo na ha amalitela ime nnyocha banyere ebubo otu onye ọrụ ha a sịrị na ọ napụrụ mmadụ narị nde dọla anọ ($400,000).

    Ha ji ohere ahụ dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịdabanye n’aka ndị omekome ji aha EFCC egwu chandum maọbụ na-anapụ mmadụ ihe.

    Na nsonso a ka a kpụpụrụ ndị ọrụ EFCC mmadụ abụọ bụ Ojobo Joshua na Aliyu Hashim n’ụlọikpe maka ebubo na ha chọrọ iri ngarị ego ruru otu nde dọla ($1m) n’ịsị Mohammed Bello-Kaka bụ onyeisi ụlọọrụ Nigerian Ports Authority.

  15. Aka akparala ndị Chaịna maka ọlaedo mba Kongo

    Anwụchiela ụmụafọ Chaịna atọ ma napụta ha ọkpụrụkpụ ọlaọcha iri na abụọ (12) na akwụkwọ ego ruru narị puku dọla asatọ ($800,000) na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Kongo.

    Dịka Gọvanọ South Kivu bụ Jean Jacques Purusi siri kwuo, ha zoro ọlaedo na ego ndị ahụ n’okpuru oche ụgbọala ha ji eme njem.

    O kwuru na e meghị ka onye ọbụla mata atụmatụ ha mere iji nwụchie mmadụ ndị ahụ dịka a nọọrọ na nso nso a tọhapụ ụmụafọ Chaịna e boro ebubo igwupụta ọlaedo n’ụzọ iwu akwadoghị na mpaghara ahụ.

    Mpaghara ọwụwa anyanwụ Kongo nwere ọtụtụ ọlaedo na akụrụngwa ndị e ji emepụta batịrị ekwentị na ụgbọala ndị na-eji ikikere latrik arụ ọrụ.

  16. Praịm mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau arịtuola n’ọchịchị

    Praịm mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau arịtuola n’ọkwa ọchịchị.

    Justin Trudeau kwuru na ya chọrọ ịhapụ ọkwa ya dịka onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na mba ahụ nakwa dịka Praịm mịnịsta ha.

    Justin Trudeau kwuru na ya rịturu n’ọkwa ọchịchị ka ya na ezinaụlọ ya kpachara nkata.

    Ọ sị na ọ bụ nkwado ezinaụlọ ya nyere ya so mee ka ya bụrụ Praịm mịnịsta ma kwuo na ọ bụ n’abalị garaaga ka ya gwara ụmụaka ya na ya chọrọ ịrịtu n’ọkwa ọchịchị.

  17. Ndịagha nnupụisi mba Rwanda na-akwado ewegharala obodo dị na Congo

    Ndịagha nnupụisi mba Rwanda na-akwado iwegharala obodo Masisi dị n’ọwụwa anyanwụ mba Demokratik Rịpụblik of Kongo.

    Dịka akụkọ dị iche iche siri kwuo, nke a bụ obodo nke abụọ otu a na-akpọ M23 weghaara na mpaghara ugwu nke Kivu, nwere onyinye ọ natarachị dị n’ala nke ukwuu.

    Ndị otu ahụ ewegharala oke nnukwu n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo kemgbe afọ 2021, ma chụpụ ọtụtụ narị puku mmadụ n’ụlọ ha.

    Mba Angola agbaala mbọ iji dozie okwu dị n’etiti onyeisiala Félix Tshisekedi na onyeisiala mba Rwanda bụ Paul Kagame mana okwu ahụ biri n’ọnwa garaga.

    “O nwutere anyị ịnụ na ndị otu M23 weghaara obodo Masisi,” Alexis Bahunga bụ onye omeiwu nke mpaghara ugwu Kivu, gwara ndị ntakụkọ AFP.

    O kwuru n’ọnọdụ a etinyela mpaghara ahụ na nsogbu ma rịọ ka gọọmentị mee ka ndịagha nọ na mpaghara ahụ sie ike.

    Otu onye bi ebe ahụ gwara AFP na M23 na ndị obodo nzukọ mgbe ndị otu ahụ kwuru na ha bịara ị napụta obodo ahụ.

  18. Hamas ewepụtala aha mmadụ 34 ha nwụchiri ha nwereike ịtọhapụ

    Otu onye ọrụ ọkwa ya dị elu na Hamas enyela BBC aha mmadụ iri atọ na anọ ndị ejieji otu ahụ nọ na mba Palestine nwere ike ịnye ịtọhapụ ma ha na mba Izrel nwee nkwekọrịta ịkwụsị agha.

    Ka ọ dị ugbua, amaghị mmadụ ole n’ime ndị ahụ e depụtara aha ha ka dị ndụ.

    Ndị ahụ e dere aha ha gụnyere ụmụnwaanyị iri na ndị okenye iri na otu ndị gbara afọ iri ise ruo afọ iri asatọ na ise nakwa ụmụaka ndị Hamas kwuru na ha nwụrụ oge Izrel tụrụ ogbunigwe na mba ahụ.

    Aha ọtụtụ ndị Hamas depụtara aha ha maka ntọhapụ, nọ n’ọrịa.

    Ozi si n’aka mịnịstrị ahụike Gaza nke Hamas na-ahụ maka ya, kwuru na ogbunigwe mba Izrel tụrụ na mba ahụ na ngwụcha izuụka gara aga gburu mmadụ karịrị otu narị.

    Ụlọọrụ praịm minista Izrel ekwuola na Hamas enyeghị ya aha ndị ha ji.

    O kwuru na mba Izrel enwetabeghị ozi sitere n’aka Hamas banyere ọnọdụ ndị ha ji edepụtara aha ha.

  19. E tinyela ọnọdụ gbatagbata n’ọtụtụ steeti Amerịka maka oke oyi

    Ihe karịrị nde iri isii ndị mba Amerịka nọ na oke oyi maka oke mmiri ozuzo nke nwereike inweta oke sno na oke oyi na mba ahụ n'ime ihe karịrị afọ iri.

    E kwupụtala ọnọdụ gbatagbata na steeti asaa gụnyere Kansas, otu n'ime mpaghara oke oyi kacha njọ, Missouri, Kentucky, Virginia, West Virginia, Arkansas na akụkụ New Jersey.

    Ndị na-ebu amụma banyere ihuigwe na-ekwu na ihe na-akpata mgbanwe ihuigwe a bụ pola vortex - mpaghara ikuku oyi na-ekesa na gburugburu Arctic ma na-ebute oke oyi na mpaghara etiti Amerịka.

    A kagbuola ọtụtụ puku njem ụgbọelu, mechie ọtụtụ okporoụzọ ma mechie ụlọakwụkwọ n'ihi oke ikuku oyi ahụ.

    A na-atụ anya na ihuigwe ga-amalite ibelata ụbọchị Mọnde.

    Ebe ndị ọzọ a na-ekwu oke sno a nwereike imetụta gụnyere Washington DC bụ isi obodo Amerịka.

  20. Nasir El-Rufai ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ọ banyere pati PDP

    Onye chịburu Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai ekwuola na akụkọ ahụ na-efegharị na ya abanyela pati Peoples Democratic Party abụghị eziokwu.

    Ozi El-Rufai wepụtara n’akara X kwuru na ọ ka bụ onye otu pati All Progressive Congress (APC). Ọ kọwara akụkọ ahụ dịka aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru.

    El-Rufai gara n’ihu kwuo na ya enyefeela ndị wepụtara ozi ụgha ahụ n’aka ndị ọkaiwu iwu ya maka ikpe ha ikpe.