Ụlọikpe enyela EFCC iwu ịnapụ Theodore Orji ego ruru nde naịra 228.4
Ụlọikpe enyela ụlọorụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commssion (EFCC) ịnapụ Theodore Orji, bụbu Gọvanọ Abia Steeti ego ruru nde narị naịra abụọ na nde iri abụọ na asatọ na ụma anọ (N2228.4m).
Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nyere iwu ahụ ma kwuo ka EFCC machie ọbaego Theodore Orji nwere n’ụlọakụ maka ebubo ịbụpụ egọ mgbe ọ na-achị Abia Steeti.
Cheta na EFCC gara n’ụlọikpe inweta ikike ka ha machie ọbaego Theodore Orji ma were ego ahụ nye gọọmenti etiti.
Ọkaikpe Emeka Nwite mere ihe EFCC rịọrọ ya ma nye ohere ịnụ ikpe ahụ ọzọ n’abalị atọ nke ọnwa Febuwari afọ 2025.
Ọkaikpe Nwite ga-eji oge ahụ mara ma e mekwara ihe o nyere n’iwu.