Ndị
uweojii Nasarawa steeti anwụchiela onye otiegwu aha ya bụ Timileyi Ajayi si
Kogi steeti maka ebubo igbu enyi ya nwaanyị aha ya bụ Salome Adaidu ma gbukasịa
ahụ ya.
Akụkọ si n’aka
ndị uweojii kwuru na oge ha nwụchiri Timileyi, n’akụkụ ogige otu ụlọụka dị na
mpaghara Orozo ụbọchị Sọnde 12 Jenwụwarị, ha chọpụtara na o bu isi Salome n’akpa.
Ihe onyonyo
pụtara ihe na sohal midia, gosiri oge Timileyin na-akọwa etu o si gbua Salome.
Enyi Salome
Adaidu bụ Abby Simon gwara BBC
na ọnwụ Salome bụ ihe mwute nye ndị enyi na ezinaụlọ ya.
Abby kọwara na oge
nwanne Salome gara n’ụlọ ebe o bi, ọ chọpụtara na ụlọ ya ghasara aghasa ma hụọ ka
ọbara juru ebe niile.
Akụkọ kwuru na ọ bụ
onye ọgbaatumtum bu Timileyin si Orozo gawa Oke chọpụtara na ọbara si n’akpa ya
na-apụta. Ọ bụ oge ahụ ka ọ kpọkuru ọhanaeze ndị malitere ịjụ ya ajụjụ ihe o bu
n’akpa.
E kwuru na ndị mmadụ
malitere iti Timileyin ihe tupu ha kpọọ ndị uweojii bịara nwụchie ya.
Abby kwuru na Timileyin
abụghị enyi nwoke Salome Adaidu. “Anyị niile maara onwe anyị maka na anyị bụ
obere obodo, enweghị onye ma onye Timileyin bụ, ọ bụghị enyi nwoke Salome”.
Nke a abụghị oge mbụ
a na-enwe akụkọ dị etu. Cheta na n’ọnwa Disemba 2022, ndị uweojii Ogun steeti
nwụchiri otu nwoke gbara afọ 27 tigburu enyi ya nwaanyị na mpaghara Eredu
Ishara steeti ahụ.