You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndịagha Sudan sị ha anapụla ndịagha nnupụisi mpaghara ọwụwa anyanwụ

    Ndịagha Sụdan kwuru na ha ewegharaala otu obodo a ma ama dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ, bụ nke ndịagha nnupụisi jichiri kemgbe ihe ruru afọ abụọ.

    Ihe onyonyoo fesara n’ọbaozi soshal midịa gosiri ebe ndị mmadụ na-aṅụrị ọnụ n’ogbe dịka ndịagha banyere n’ime obodo Wad Madani.

    Onyendu ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) bụ General Mohamed Hamdan Dagalo nabatara mmeri ahụ ndịagha meriri ha n’ozi o jiri olu ya gbasaa.

    Mana ọ ṅụrụ iyi na ha ga-aga n’ihu na-ebu agha ruo mgbe ha nwetara mmeri, ọ bụrụgodu na ọ ga-ewe afọ iri abụọ (20) nọ n’ihu.

    Wad Madani bụ isi obodo Al Jazira steeti nke dị na mpaghara ndịda isi obodo Sụdan bụ Khartoum.

  2. A gwala ndị bi na Los Angeles ka ha nọrọ n’ime ụlọ n’ihi anwụrụ ọkụ

    Mmadụ iri na otu anwụọla dịka a na-eche na iri na atọ ndị ọzọ na-efu efu n’ihi ọkụ ọgbụgba tiwapụrụ na Lọs Angelis dị n’Amerịka.

    A na-atụ ụjọ na ọnụọgụ mmadụ mmadụ ndị nwụrụ anwụ nwere ike gbagolite n’ebe ọ dị ukwuu.

    Ndị ọrụ ahụike adọọla aka na ntị ka onye ọbụla nọrọ n’ime ụlọ n’ihi na anwụrụ ọkụ na ntụ ndị e ji agbanyụ ọkụ ahụ nwereike ibute ihe iyi egwu maka ahụike ọhanaeze.

    Ka osinadị, a kpọpụla mmadụ karịrị otu narị puku na iri ise na mpaghara ndị ahụ ma machie ndị mmadụ ịpụta ezi n’oge abalị.

  3. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi eee, Ụbọchị ụka ọma nụ ooo!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo nke taa dịka Chinonso Ugorji ga-amalite ugbua iwetere gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche. Michael Ilediagu ga-anọkwa ebe a oge na-adịghị anya.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị...

  4. A gwala mmadụ karịrị puku 144 ka ha pụọ n'ụlọ n'ihi ọkụ ọzara na-agba na Los Angeles

    Ndị ọrụ gọọmentị agwala mba Amerịka agwala ndị bi n’obodo Los Angeles karịrị mmadụ puku 144 ka ha si n’ụlọ ha pụọ n’ihi ọkụ ọzụ na-eyi egwu ebe ahụ.

    N’ozi e wepụtara n’akara Facebook nke gọvanọ steeti ahụ, o kwuru na e hiwela ogige asatọ ebe a ga-elekọta ndị ha pụrụ ụlọ ha, na mmadụ karịrị narị asaa bi ebe ahụ ugbua.

    Ọkụ a nke malitere ịgba kamgbe ụbọchị ole ma ole egbuola mmadụ iri na otu na steeti ahụ.

    Oke ifufe na-efe na mpaghara ahụ na-enye aka ịkwanye ọkụ ikụ ihe ma na-egbochi ndị na-enye ndị na-agbanyụ ọkụ nsogbu.

  5. INEC ewepụtala bọjet N126bn maka afọ 2025

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naijirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ewepụtala bọjet ọnụego ya dị otu narị ijeri naira na iri abụọ na isii (N126bn) maka afọ 2025.

    Onyeisioche ulọọrụ ahụ bụ Mahmood Yakubu kwuputara nke a mgbe ọ na-azara ọnụ ya maka atụmatụ mkpata na mmefu ego ụlọorụ INEC nke 2024 n'ụlọ omeiwu Naijirịa n’ụbọchị Fraịde 10 Jenụwarị 2025.

    Ọ gwara ndị omeiwu ka ha welite aka n’ego a ga-ewepụtara ulọọrụ ahụ n’afọ 2025 iji kwado ọrụ ha ma gbalahụ ụkọ ego ha gabigara n’afọ 2024 e nyere ulọọrụ ahụ ego dị ijeri naira iri anọ (N40bn).

    Dịka Yakubu kwuputara maka ego e ji ahazi ntuliaka na Naịjirịa dị ugbu a, ọ gara n’ihu rịọ ụlọ omeiwu ka ha kwado bọjet 2025 fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro atọ nke ha kwadoro n'afọ gara aga bu 2024.

  6. David Moyes alọghachila dịka onye nchịkọta Everton nke ugboro abụọ

    Otu egwu bọọlụ na mba England bụ Everton ahọpụtala David Moyes dịka onye nchịkọta ha nke ugboro abụọ.

    Nwoke a bụ Moyes si mba Scotland, dị afọ iri isii na otu (61) binyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta na ọ ga-achịkọta otu egwu bọọlụ Everton afọ abụọ na ọkara dịka ha chụrụ onye nchịkọta ha bụ Sean Dyche n’ụbọchị Tọzde.

    Otu egwu bọọlụ Everton na-agba onye nke iri na isii (16) n’amamaaka Premier League, nke a pụtara na ha ji otu ụkwụ na-agbalahụ mpaghara ọdịda dịka ha nwere naanị mmeri atọ n'ime egwuregwu iri na itoolu ha gbarala.

    Moyes kwuru, "E nwere m ọmarịcha afọ iri na otu na ọganihu n’Everton, nke a mere egbughị m oge mgbe e nyere m ohere ịlọghachi na nnukwu otu egwu bọọlụ a."

  7. EFCC anwụchiela ndị China anọ na mmadụ 101 ndị ọzọ n’Abuja maka...

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela mmadụ otu narị na ise (105) gụnyere ụmụafọ Chaịna anọ na mpaghara Gudu dị n’Abụja.

    Onyeisi ngalaba mgbasaozi n’ụlọọrụ EFCC bụ Dele Oyewale kpughere nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Fraịde 10 Jenụwarị 2025.

    Ọ sịrị na ọ bụ n’ime otu ụlọ ka ha nwụchiri mmadụ ndị ahụ a na-enyo enyo maka igwu ndị mmadụ chandum.

    Dịka o siri kwuo n’ozi ahụ, ọnọdụ a bụ otu akụkụ mbọ na-aga n’ihu EFCC na-agba iji kpochapụ igwu chandum na agwa mpụ ndị ọzọ na Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu kwuo na n’ime mmadụ otu narị na ise (105) ha nwụchiri, anọ n’ime ha bụ ndị Chaịna ebe otu narị na otu (101) ndị nke ọzọ bụcha ụmụafọ Naịjirịa.

    Ọ kọwara na mmadụ ndị ahụ ha nwụchiri n’ụbọchị Tọzde 9 Jenụwarị 2025 gụnyere ụmụnwoke iri isii na asaa (67) na ụmụnwaanyị iri atọ na asatọ (38).

  8. Maapụ na-egosi mpaghara ọkụ gbara na Los Angeles mba Amerịka

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-agba mbọ ugbua iji kwụsị nnukwu ọkụ na-agba na Lọs Angelis nke gburu opekatampe mmadụ iri, repịa ọtụtụ ụlọ ma mee ka puku kwuru puku mmadụ gbapụ n'ụlọ ha.

    Maapụ a na na-egosi na ọnọdụ ọkụ ọgbụgba na-agbanwe agbanwe ma na-egosi ebe ọkụ gbara na mmebi ọ kpatara.

    Ọkụ kachasị ukwuu na mpaghara Pacific Palisades bụ ọkụ kachasị na-emebi ihe na Lọs Angelis. Mpaghara fọrọ nke nta ka o ruo acre puku iri abụọ (20,000) agbaala ọkụ ugbu a.

    Idobe mpaghara ọkụ metụtara na maapụ New York na London na-enye nghọta etu ọkụ ahụ si buo ibu, ọ gbatịpụrụ site na Clapham ruo Greenwich n’isi obodo UK, ma ọ bụ gafee nnukwu mpaghara Manhattan na Queens.

    N’aka nke ọzọ, Gọvanọ California akpọọla oku ka e mee nnyocha nke onwe banyere etu ụkọ mmiri si mebie ọgụ a na-alụ megide oke ọkụ na-agba na mpaghara Lọs Angelis.

    Otu nwaanyị onye omeiwu na California bụ Judy Chu kwuru na ọ dị mkpa ịgbanwe usoro mkpuchi ‘insurance’ iji hụ na ndị nwe ụlọ nwere ike nweta mkpuchi nke ọma.

  9. Igbo nwe mmadụ, ụnụ asaala chi eee, Ka Afọ taa fọtara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo nke ụbọchị taa.

    Amaka Ewuzie na Chinonso Ugorji awuchiela iwetara gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana echefula na Ikechukwu Kalu ga-esonyere anyị oge na-adịghị anya.

    Anyị na-asị gị nnọọ...

  10. Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe mana ọ gaghị aga mkpọrọ

    Ụlọikpe amaala onye a hopụtara dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Amerịka bụ Donald Trump ikpe n’ebubo inye “ego kpuchie ọnụ’’ mana ọ gaghị aga mkpọrọ maọbụ kwụọ ụgwọ.

    Ọkaikpe Juan Merchan kwuru na aka Trump adịghị iwu n’ebubo iri atọ na anọ gbadoro ụkwụ n’ikpuchi ego ọ kwụrụ otu nwaanyị akwụna.

    Ọkaikpe Merchan kwuru na ihe mere o jiri kpebie na Trump agaghị aga mkpọrọ bụ maka na ọ bụ “naanị ntaramahụhụ ziri ezi a ga-enwenu ka a ghara imetọ ọkwa kachasị elu na mba ha.”

    Ka o nyere mkpebi ahụ, ọ gwara Trump “Ana ma asị ka Chineke gbaa gị ume dịka ị na-abanye n’ọchịchị nke ugboro abụọ.”

    Na mbụ ụlọikpe kachasị jụrụ ịnabata mkpesa Trump wetere ka a kwụsị ịma ya ikpe ahụ nke ga-eme ka ọ bụrụ onye mbụ a mara ikpe ga-achị mba Amerịka.

    Mana ụlọikpe mechara maa ya ikpe maka etu o si were akwụkwọ adịgboroja ma chọrọ ịbịachi ego dị otu puku narị dọla na puku iri atọ ($130,000) ọ kwụrụ onye na-agba akwụna nke ọ sị na ọ bụ ego o mefuru n’ikpe n’afọ 2016.

    Trump na ọkaiwu agaghị n’ụlọikpe kama ha sonyere n’ihe onyonyo ịntanetị.

    Trump kwuru na nke a bụ “ihe ọjọọ nye ya” ma sị na aka ya niile dị ọcha kpam kpam, ebe ọkaiwu ya kwuru na e kwesighi ibu ya ebubo ndị a na mbụ.

  11. Gọọmenti Amerịka enyeghachila Naịjirịa $52.88m ha napụtara Dieziani Madueke

    Gọọmenti Amerịka nọọrọ n’ụbọchị Fraịde 10 Disemba 2025 weghachitere Naịjirịa nde dọla iri ise na abụọ na ụma iri asatọ na asatọ ($52.88m).

    Ha sịrị na nke ahụ bụ ego a napụtara onye bụbu Mịnịsta hụrụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke na ndị otu ya.

    Alison-Madueke bụ Mịnịsta hụrụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa malite n’afọ 2010 rute 2015. E boro ya ebubo izu nnukwu ego dịka Mịnịsta, bụ nke ọ gọrọ ugboro ugboro.

    Ngalaba na-ahụ maka ikpe ziri ezi n’Amerịka kpebiri ikpe n’afọ 2023 gbasara okwu abụọ metụtara ijichi ngwongwo ndị a sị o zupụrụ site na mba Amerịka. A kpọkwara aha ụfọdụ ndị otu ya n’okwu ahụ.

    Oge ọ na-ekwu okwu na emume e ji binye aka n’akwụkwọ maka nke ahụ n’Abụja, Minista ikpe ziri ezi na Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi kwuru na ego ahụ e weghachiri bụ nzọpụ njem kwesịrị ekwesị n’agha Naịjirịa na-ebu megide nrụrụaka.

    O kwuru na nde dọla iri ise ($50m) n’ime ego ahụ ga-abụ maka iji tinye ọkụ latrik n’ime ime obodo ebe nde dọla abụọ na ụma iri asatọ na asatọ fọrọ afọ ($2.88m) ga-abụ maka iji kwalite ngalaba ikpe ziri ezi.

  12. Donald Trump na-akwado izute Onyeisiala Russia Vladimir Putin

    Donald Trump ekwuola na ọ malitela ịhazi atụmatụ izute Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin.

    Trump bụ onye meriri ntuliaka onyeisiala mba Amerịka ekwughị oge nzute ahụ ga-abụ.

    N’okwu ya n’ụlọ ya dị na Mar-a-Lago resort, Florida, ‘Putin chọrọ ka anyị nwee nzụkọ, anyị ana m akwado ya”.

    Kremlin bụ obi ọchịchị mba Roshịa kwuru na ọ dị njikere izute Trump bụ onye a ga-edu n’iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Amerịka ụbọchị Mọnde, 20 Jenụwarị, 2025.

    Cheta na Trump kwere nkwa inweta nkwekọrịta ma kwụsị agha dị n’etiti Rọshịa na Ukren ngwa ngwa ọ banyere n’ọkwa dịka Onyeisiala mba Amerịka.

    N’aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru mịnịstrị mba Ukren na-ahụ maka mmekọ mba ofesi kwuru na ha na-atụ anya ka nzukọ Trump na Putin mịta ezi mkpụrụ.

  13. A wakpola ndịagha Benin n’okeala ha na Niger na Burkina Faso

    Ndị ọchịchị gọọmenti Benin ekwuola na ọtụtụ ndịagha ha anwụọla oge wakporo ha na mpaghara okeala ha na Nijie na Bọkịna Faso ọgbaaghara metụtara.

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa obodo bụ Colonel Faizou Gomina kwuru na otu ogige ndịagha ha kachasị nwee akụrụngwa dị na mpaghara ugwu mba ahụ ka a wakporo ụbọchị Wenezde 8 Jenụwarị.

    Col Gomina kwuru na-emerụla ha ahụ nke ukwuu.

    Enweghị onye ma ndị aka ha dị na mwakpo a. Cheta na Benin enweela ọtụtụ mwakpo n'ime afọ ole na ole gara aga na mpaghara ugwu ha nke a na-ekwu na ọ bụ ndịagha nnupuisi mba ndị agbata obi ha na-eme.

    Otu onye diplomat gwara ụlọọrụmgbasaozi AFP na e gbuola ihe karịrị ndịagha Benin 120 n'ime afọ 2021 ruo Disemba 2024.

    N'ọnwa gara aga, ndị ji egbe gburu ndịagha atọ ma merụọ mmadụ anọ ndị ọzọ na-eche ụkpụrụ mmanụ agbidi dị n'ugwu ọwụwa anyanwụ nche.

    Col Gomina enyeghị ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo ahụ mere na Wenezde, mana ndị isi otu ndọrọndọrọ ọchịchị a na-akpọ The Democrats, kwuru na e gburu ihe ruru ndịagha 30 na mpaghara Alibori dị ka ụlọọrụ mgbasaozi Reuters si kọọ.

    AFP kwuru na otu onye ọrụ nchekwa gwara ha na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ bụ iri abụọ na asatọ.

  14. Ọkụ agbagbuola mmadụ iri ma tinye ọgbaaghara na Los Angeles, California

    Ndị ọchịchị ekwuola na ihe ruru mmadụ iri anwụọla n’oke ọkụ na-agba na Los Angeles dị na mba Amerịka.

    Ndị nyocha ahụike na mpaghara Los Angeles kwuru na a ka na-enyocha ozu ndị ahụ ọkụ gbagburu iji mata ndị ha bụ.

    Ndị nnyocha ahụike kwuru n’abalị Tọzde 9 Jenụwarị, 2025 na nchọpụta ahụ nwereike inwe ọtụtụ izuụka n'ihi na ngalaba nnyocha ahụike amaghị ebe ndị ahụ nọ nwụọ.

    Ndị uweojii Los Angeles kwuru na ha anwụchiela otu nwoke a na-enyo enyo na o tinyere ọkụ na mpaghara Woodland Hills dị na obodo ahụ.

    Ha kwuru n’onye ahụ a na-enyo enyo nọ n'ụlọ mkpọrọ mana a ga-enyfe ya n’aka Topanga Station.

    Onyeisi ndị uweojii Los Angeles County Sheriff bụ Robert Luna kwuru na ha na-enwe nsogbu iru mpaghara ọkụ ahụ kachasi metụta ma kwuo na ọnụọgọ ndị nwụrụ nwereike ịgbago.

    Ọkụ ahụ gbara n’Eaton ka a na-ekwu na o gbariri ụlọ ruru puku ise.

    A na-ekwu na e nwereike itinye ọnọdụ onye apụtala ezi na mpaghara dị iche a nwụchiri mmadụ iri abụọ na-ezu ohi n’ụlọ ndị mmadụ.

  15. Ụtụtụ oma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo dịka anyị na-ewetara gị akụkọ si mbaụwa taa.

    Ọfọ anyị bụ ka oziọma ruo gị na ezinaụlọ gị aka taa.

    Ndewo.

  16. Oxford etinyela mkpụrụ okwu Naijirịa iri abụọ n’akwụkwọ nkọwa okwu ha

    Ụlọọrụ na-emepụta akwụkwọ nkọwa okwu Oxford English Dictionary etinyela mkpụrụ okwu Naijirịa iri abụọ na mgbanwe ha mere n'akwụkwọ nkọwa okwu h'afọ 2025.

    Otu onye ndụmọdụ olu bekee na-arụrụ ndị Oxford English Dictionary bụ Kingsley Ugwuanyi kwupụtara nke a n’akara soshal midia bụ Linkedln ma kọwaa etu o si nye aka nweta mgbanwe n’akwụkwọ nkọwa okwu a.

    Mkpụrụ okwu ndị e tinyere n’akwụkwọ nkọwa okwu ha gụnyere japa, agbero, eba, 419, abi, cross carpet, cross-carpeting, area boy, Edo, Kanuri, kobo, Naija, suya, yahoo, yahoo boy na gele.

    Ndị ọzọ bụ yarn dust, janded, jand na adire.

    Oxford tinyekwara etu e si akpọ mkpụrụ okwu ndị ahụ n’akwụkwọ nkọwa okwu a iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta mkpụrụ okwu ndị ahụ.

  17. Ọkụ ọzọ amalitela ịgba Hollywood Hills dị na Los Angeles, mba Amerịka

    Ihe ruru ọkụ ọhụrụ ise amalitela ịgba Los Angeles na mpaghara niile nọ ya n’akụkụ. Ọkụ ahụ malitere na mpaghara Hollywood Hills ụbọchị Wenezde 8 Jenụwarị, eruwela ebe a ma ama bụ Hollywood Sign ebe ụlọ niile dị na Sunset Boulevard bụ nke ọkụ ahụ gbariri.

    Otu onyeisi ụlọọrụ na-agbaṅụ ọkụ gwara BBC na ọkụ a na-agba Hollywood Hills bụ nke ha na-enweghị ike igbochi maka na ọ na-agbasa n’ike n’ike.

    Ụlọ mmadụ abụọ a ma ama bi na mpaghara bụ Billy Crystal na Paris Hilton agbaala ọkụ.

    Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ agbagbuola mmadụ ise ebe mmadụ ruru puku narị iri atọ na asaa apụola n’ụlọ ha. Ndị ọrụ na-agbaṅụ ọkụ kọwara ọkụ dịka nke kachasị kemgbe e hibere Los Angeles.

    Ụlọ karịrị otu puku gbara ọkụ mgbe ọkụ ahụ gbara n’ime ma gburugburu obodo ahụ nke jupụtara n’ulọ ndị a ma ama na-eme ejije.

    Ụfọdụ ebe ọkụ ahụ kacha njọ bụ na mpaghara Pacific Palisades, ebe ọkụ nke ifufe na-efe efe gbawara site na ọtụtụ otu narị acres ruo ihe karịrị 15,000 n'ogo kemgbe Tuzde.

    Otu onye ọzọ na-eme ejije bụ James Woods, tiwara anya mmiri na ụlọ mgbasaozi CNN oge ọ na-akọwa etu ụlọ ya dị na Pacific Palisades si gbaa ọkụ.

    "Otu ụbọchị ị na-egwu mmiri na ọdọ mmiri mana echi ya, ihe niile agaala," ka ọ gwara netwọk ahụ.

  18. Ndị uweojii amalitela ịchọ ndị ‘Rev Sister’ abụọ a tọọrọ n’Anambra Steeti

    Ndị uweojii Anambra amalitela ịchọ ndị 'Reverend Sister' abụọ ụka Katọliki akụkọ kwuru na a tọọrọ n'obodo Ufuma dị n'okpuruọchịchị Orumba Nọt nke Anambra steeti.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru nna ihe mwute a mere na mgbede Tuzde 7 Jenụwarị 2025 oge ndị Rev Sister abụọ ahụ na-alọta njem nzukọ ọrụ aka ha gara n’Ogboji.

    O kwuru na Kọmishọna ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Nnaghe Obono Itam na osote ya na-ahụ maka ọrụ gara ebe ihe ahụ mere ma nye iwu ka amalite ọrụ iji chọta Rev Sister abụọ ahụ.

    Nke a na-abịa dịka onye ụkọchukwu ụka Katọliki amama n’Anambra steeti bụ Fada Emmanuel Obimma e ji Ebube muonso mara, kpọkuru Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo ka gọọmenti ya rụọ ọrụ banyere ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

    Fada Emmanuel Obimma onye kpọrọ oku a n’ozi afọ ọhụrụ o wepụtara, gwara Gọvanọ Soludo ka ọ rituo n'ọkwa ọchịchị ma ọ bụrụ na ọ maghị ihe ọ ga-eme iji chụọ ndị omekome na-akpa mkpamkpa ọsọ ụkwụ eruala ma nweta ezi nchekwa ọhanaeze n'Anambra steet.

  19. Mba Amerịka etinyela iwu n’isi onye ndu otu RSF na Sudan maka mgbukpọ agbụrụ 'genocide'

    Mba Amerịka ebola otu ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) nke mba Sudan ebubo mgbukpọ agbụrụ ‘genocide’ ma tinye iwu n'isi onye ndu otu ahụ bụ Mohamed Hamdan Dagalo.

    Ode akwukwọ gọọmenti mba Amerịka bụ Antony Blinken kwuru n’ubọchị Tuzde na a na-ata Mohamed Hamdan Dagalo bụ onye a ma dịka Hemedti ahụhụ maka arụ o mere megide ndị Sudan n'oge ọgụ nke ruru ọnwa iri abụọ.

    Ọ kwuru na RSF na ndịagha nnupụisi ndị ọzọ kpara ọtụtụ ajọ agwa na mba Sudan nke gụnyere ịgbu ọtutụ ụmụnwoke, ụmụntorobịa na ụmụaka, ịwakpo ma dinaa ọtụtụ umụnwaanyị n’ike n'ihi na ha a bụghị agbụrụ haa.

    Blinken kwuru na ndịagha nnupụisi a wakporo ndị nkịtị na-agbapụ ọsọ ndụ ma gbuo ndị aka ha dị ọcha na-agbanarị ọgụ na mba Sudan.

    O kwuru n’ozị ndị a mere ka o kpebie na otu RSF na ndịagha nnupụisi ndị ọsọ jikọrọ aka mee mgbukpọ agbụrụ na Sudan.

  20. Ndị be anyị unu abọọla chị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Tọzde, 9 Jenụwarị 2025.

    Ọfọ anyị bụ ka ihe ọma mere onye ọbụla taa.