Ukraine ịbanye NATO agwụla ihe ga-akwụsị agha dị n’etiti anyị na Russia - Zelensky

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A ga-akpụpụ onye na-agba ọchịchị Uganda ụkwụ n’ụlọikpe ndịagha

    A ga-akpụpụ onye na-agba ọchịchị Uganda ụkwụ n’ụlọikpe ndịagha

    Ebe foto si, AFP

    Nwunye onye na-agba ọchịchị Yuganda ụkwụ bụ Kizza Besigye ekwuola na a tọọrọ di ya na Kenya ma kpọghachi ya n’obodo ha bụ ebe e jichiri ya n’ụlọnga ndịagha.

    N’ozi o bipụtara n’ọbaozi X, Winnie Byanyima depụtara na di ya bụ onye e jichiri n’isi obodo Kenya bụ Naịrobi ụbọchị Satọde gara aga n’oge emume ngosipụta akwụkwọ ọhụrụ.

    “E meela ka m mara ugbua na ọ nọ n’ụlọnga ndịagha dị na Kampala,” ka o dere dịka ọ kpọrọ oku ka gọọmenti Yuganda tọhapụ di ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Felix Kulayigye gwara ụlọmgbasaozi Uganda Radio Network na a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe ma e mesịa.

  2. “Nsogbu abụghị ịgbazịta ego mana ọ bụ ihe e jiri ego ahụ mee” – Ọkammụta

    Onyeisiala Naịjirịa, Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu / X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa, Bola Ahmed Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Ahmed Tinubu edeela akwụkwọ degara ndị ụlọomeiwu ma gwa ha na gọọmenti ya chọrọ ịgbazịta ego kariri otu puku ojeri naira.

    Ihe ego ahụ pụtara n’ọnụ ego dollar bụ ‘$2.209billion’ bụ ego a ga-eji kwadoo mmefu ego nke afọ 2024.

    Ọ bụrụ na ụlọomeiwu nabata ma kwadoo mgbazịta ego ahụ, nke a ga-enyereaka imejuputa ego niile a manyere maka imefu n’afọ 2024 bụ nke ji N9.7tn eri mperi.

    Mana Dọkịta Okechukwu Okere bu onye ọkamara n'ịhe gbasara akunuba na ịchụ ego kọwara etu ịgbazịta ego ahụ ga-esi metuta akụnụba Naịjirịa nakwa ndị mmadụ.

    N’okwu ya “ịgbazịta ego abụghị nsogbu. Mba dị icheiche na-agbazịta ego, mba Amerika na-ebitekwa ego mana ebe okwu dị bụ ka e si jiri ego ahụ mee ihe”.

    “Ndị mba anyị na-enwe nsogbu ka anyị si eme ego anyị bitere. Anyị adịghị eji ego anyị gbazịtara eme ihe anyị ji maka ya gbazịta ego ahụ”.

    “Ọzọ bụ na-ego anyị gi akwụ ụgwọ anyị gbazịtara nakwa ego ọmụrụnwa sọ ya kaririakarị”

    “Nke ga-eme ka ego naịra na-ada mba. ọzọ bụ na anyị ejighi ego ahụ mee ihe anyị kwesiri ime, ọ ga-enye anyị nsogbu nke ukwu.

    Onyeisiala Naịjirịa, Ahmed Bola Tinubu

    Ebe foto si, President Ahmed Bola Tinubu / X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa, Ahmed Bola Tinubu

    Na nchịọkọta okwu, Okechukwu Okere kwuru na gọọmentị nwekwereike ijiri ego ahụ rụọ ihe dị ọkpụrụkpụ ga-enyereaka mee ka ha kwụọ ụgwọ ahụ n’ihe dịka afọ iri ma ọ bụ iri na ise.

    Kemgbe onyeisiala Tinubu banyere n’ọkwa, ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ etu gọọmenti ya sị ahazị akụnụba, ka ọ si emefu ego, ka ọnọdụ ndị mmadụ nakwa oke agụụ na ihe ụkọ.

    N’agbanyeghi ihe ụkọ na ngagharịiwe ụmụntorobịa mere maka oke agụụ, onyeisiala Tinubu manyere ego ruru ijeri naira iri abụọ na asatọ (N28billion) bụ ego e ji zụtara ya ụgbọala, zụtara nwunye ya, dozie ọbị gọọmentị na ihe ndị ọzọ bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ.

  3. Ụka Katọlik ajụla $40,000 si n’aka onyeisiala Kenya

    Ụka Katọli ajụla $40,000 si n’aka onyeisiala Kenya

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụka Katọlik dị na Kenya ajụla onyinye ego puku dọla iri anọ ($40,000) si n’aka onyeisiala mba ahụ bụ William Ruto.

    Ruto kwuru ka e were ego ahụ wuo ụlọ obibi ụkọchukwu dịka onyinye o nyere ndị ọbụabụ n’ụbọchị Sọnde 17 Nọvemba 2024 n’ụlọụka Soweto Catholic Church dị na Naịrobi.

    Onyinye ahụ bụ nke sochiri ozi ndị Bishọpụ Katọlik zipụrụ na nso nso a, bụ ndị katọrọ gọọmenti maka ịla azụ n’imezu nkwa ha kwere oge ha na-azọ ọchịchị.

    Ndị ntorobịa mere ngagharịiwe megide ụtụisi akwanyela ụlọụka dị iche iche ọkụ n’ahụ ma boo ha ebubo ịgaru ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nso.

  4. "A ka na-achọ nne m kamgbe abalị abụọ ulo dakwasịrị ya na Tanzania"

    Ụlọ dara na mpaghara  Dar es Salaam na  mba Tanzania, n'afọ 2024.
    Nkọwa foto, Ụlọ dara na mpaghara Dar es Salaam na Tanzania, n'afọ 2024.

    Otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Mallya bi n'otu obodo a kpọrọ Dar es Salaam mba Tanzania agwala BBC na nne ya ka nọ n’okpuru ụlọ ahụ dara na mpaghara ahụ.

    Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Kassim Majaliwa kwuru na a zọpụtara mmadụ 86 n’ụlọ ahụ dara ada ebe mmadụ 16 nwụrụ anwụ.

    Emmanuel Mallya gwara BBC na nne ya na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ mgbe ọ dara n’ụtụtụ ụbọchị Satọde.

    “Nne m kpọrọ m n’ekwentị gwa m na ya na onye na-azụ ya ahịa nọ n’ụlọ ahụ. Mana ihe na-erughị awa abụọ ka m nụrụ na ụlọ ahụ adaala”.

    “Ndị ọrụ gbatagbata gwara m na ha na nne m nakwa ndị ọzọ ụlọ ahụ dakwasịrị na-enwe mkparịta”.

    “I lee anya mbọ niile ndị ọrụ gbatagbata na-agba, naanị Chukwu ka anyị tukwasiri obi. E nwere m olilanya na nne m ga-adị ndụ pụta”.

    Mallya so n'ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị ụlọ ahụ dakwasiri ndị ha hụrụ na anya ma na-eche ka ha pụta.

    Praịm Mịnịsta Majaliwa kwuru na ọ bụrụ na ha zọpụtachaa ndị niille ụlọ ahụ dakwasiri na ha ga-ebido nyocha maka ihe kpatara ụlọ ahụ jiri daa.

    Majaliwa kọwara na mmadụ ise a zọpụtara dị ndụ ma na-enweta ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.

  5. Etu ụfọdụ si nata ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox na Naịjirịa

    Onye ọrụ ahụike a na-agbata ọgwụ mgbochi Mpox

    Agbaala ụfọdụ ndị ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox n’Abuja dịka nkesa ọgwụ malitere na Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde 18 Nọvemba 2024.

    Ndị e bidoro ịgba ọgwụ a gụnyere ndị ọrụ ahụike, ndị ahụ ha anaghi enweike igbochi ọrịa ịbata nakwa ndị ha ndị buterela ọrịa a nwere mmekọ.

    Ngalaba ahụike ‘Nationala Primary Healthcare Development Agency (NPHCDA) na-ahụ maka ịgba ọgwụ mgbochi a kwuru na a ga-amalite ịgba ndị nọ na mpaghara ndịda Naịjirịa bụ ebe a kachasị nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a n’izuụka ole na-abịa abịa.

    Steetị ndị a gụnyere Bayelsa, Rivers, Cross River, Akwa Ibom, Enugwu na Benue.

    Dọkịta Hafsat Abdullazeez, bụ onye nchịkọta n’ụlọọrụ ‘Virology’ dị n’Abuja kwuru “Ọnụ ọgwụ mgbochi anyị nwere ugbua ebughi ibu, ya mere anyị ga-elekwasị anya ịgba ndị kachasị mkpa ọgwụ a.”

    Mgbe a na-ewepụta ọgwụ ahụ na mkpọ ya

    N’ọnwa Ọgọọst, Naịjirịa nwetere ọnụọgwụ 10,000 site n’aka mba Amerịka. Site n’ogbugbu oge e gburu n’ịmalite ịgba ọgwụ a, Naịjirịa abụrụla mba Afrịka nke atọ nakwa nke mpụ na mpaghara West Afrịka malitere ịgba ọgwụ a.

    Ha na-esote mba Rwanda na DR Congo n’azụ.

    Otu onye ọrụ ahụike a gbara ọgwụ a kwupụtara ihe mere o jiri kweta ịgba ya. “Ana m enye onye ọrụ ahụike ọbụla ndụmọdụ ka ọ bịa gbaa ọgwụ a maka na i nwereike ibute ọrịa a site na mmekọ gị na ọtụtụ ndị mmadụ.”

    Kamgbe afọ a, mmadụ 118 si na steeti 28 n’ime steeti 36 gụnyere Abuja ebutela ọrịa Mpox na Naịjirịa dịka ngalaba WHO si kwuo.

    Ụlọọrụ na-ebuagha megide ọrịa na Naịjirịa kwuru na kamgbe 27 nke ọnwa Ọktoba, na mmadụ ruru 1,442 ebutela ọrịa a n’ime steeti 36 nakwa Abuja.

    Mba iri abụọ n’Afrịka ekwupụtala na ọrịa Mpox abatala n’obodo ha n’afọ a, Angola bụ mba mbụ kwupụtara ya.

    Nkesa ọgwụ mgbochi Mpox
  6. Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma nụ ooo!

    Obi ọma na ọchị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Ngwa, bịa ka ị gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  7. A tụọla onye Uganda mpkọrọ maka ịkparị Onyeisiala na TikTok

    Emmanuel Nabugodu

    Ebe foto si, Swaibu Ibrahim / BBC

    Nkọwa foto, Emmanuel Nabugodu

    Ụlọikpe Uganda atụọla nwaamadị gbara afọ 21 mkpọrọ maka ịkparị Onyeisiala Yoweri Museveni n’ihe onyonyo o kesara na TikTok.

    Akụkọ kwuru na Emmanuel Nabugodu wuchiri ụlọikpe maka ebubo anọ e boro ya nke gụnyere ikesa okwu ụgha banyere Onyeisiala Museveni nọ n’ọchịchị kemgbe 1986.

    A tụrụ mkpọrọ ruo ọnwa 32.

    Nabugodi bụ onye a ma ama nwere mmadụ 20,000 na-esonye na TikTok.

    Ọtụtụ otu na-ahụ maka nchekwa ndị obodo (Human Rights Groups) akatọọla atụmatụ gọọmenti mba Uganda igbochi ndị obodo ikwu uche ha.

    Ọkaikpe ụlọikpe Entebbe bụ Stellah Maris Amabilis kwuru na Nabugodi egosighị mmwute ọbụla banyere agwa ya ma kwuo na nga a tụrụ a ga-eme ka ndị maọbụ onye ọbụla nwere echiche ikesaa okwu ụgha banyere onyeisiala mba ahụ, sepụ aka n’agwa dị etu ahụ.

    Cheta na n’ọnwa Julaị 2024, ụlọikpe tụrụ Edward Awebwa mkpọrọ afọ isii maka ụdịrị ebubo a e boro Emmanuel Nabugodi.

  8. Kedụ uru Naịjirịa ga-erita n’ọgbakọ G20 a na-eme na Brazil?

    Oge Onyeisiala wuchiri ọgbakọ G20 na mba Brazil

    Ebe foto si, officialbusolakukoyi/Instagram

    Nkọwa foto, Oge Onyeisiala wuchiri ọgbakọ G20 na mba Brazil

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu wuchiri obodo Rio de Janeiro nke mba Brazil isonye n’ọgbakọ ndịisi mbaụwa a kpọrọ ‘Heads of State and Government Summit of the Group of 20 (G20)’ nke ugboro 19.

    Ọ bụ ambasadọ Breno Costa na-ahụ maka Mịnịstri na-ahụ maka mmekọ mba Brazil na mba ndị ọzọ nabatara Onyeisiala Tinubu oge ụgbọelu ya wuchiri n;ụtụ ụbọchị Mọnde 18 Nọvemba, 2024.

    Mana kedụ uru Naịjirịa ga-erita n’ọgbakọ a?

    Onye ọkankuzi n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọ mba na mba na mahadum Kaduna State University bụ Tukur Abdulkadir, gwara BBC na oge ọbụla ọgbakọ dị etu a na-eme nke ọtụtụ mba okwu ha na-ada ụda na-esonye na ya, a na-atụanya na Naịjirịa dịka mba kachasị n’akụnaụba n’Afrịka, ga-esonye na ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ dị mmwute na Naịjirịa abụghị onye otu G20 n’agbanyeghị na Naịjirịa bụ mba Afrịka kachasị n’ọnụọgụ.

    Ọ gbakwụnyere na ọgbakọ a ga-enye Naịjirịa ohere ịwụlite mmekọ ha na mba ndị ọzọ n’ihe gbasara azụmahịa ma kwalite etu mba ndị ọzọ si ahụta Naịjirịa.

    Oge Onyeisiala wuchiri ọgbakọ G20 na mba Brazil

    Ebe foto si, officialbusolakukoyi/Instagram

    Nkọwa foto, Oge Onyeisiala wuchiri ọgbakọ G20 na mba Brazil
  9. E gbuola mmadụ anọ n’Anambra steeti ka a na-eme ‘sit-at-home’ ụbọchị Monde

    Onicha, Anambra steeti.

    Ndị ojiegbe egbuola ndị ọrụ nchekwa anọ n’Anambra steeti ma gbafuo.

    Mkpamkpa ahụ kpara na mpaghara Ukpo, n’okpuruochichi Dunukofia nakwa Abatete dị n’Idemili North n’Anambra steeti.

    Ndị omekoome ahụ bụ ndị a na-enyo enyo na ha na-akwado ‘sit-at-home’ ụbọchị Monde.

    Sit-at-home bụ ọnọdụ onye apụla n’ụlọ nke ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB tinyere na mbụ ma mechaa kagbuo ya.

    Ndị ojiegbe ahụ gbagburu ndị ọrụ nchekwa ruru mmadụ anọ ma meruo ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị e bugara ụlọọgwụ ahụ maka na mgbọ tụrụ ha.

    Ka ọnọdụ sị dị ugbua amabeghị mmadụ ole meruru ahụ na mkpamkpa ahụ.

    Mana mgbe a kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwetere na e nwere ndị omekoome kpara mkpamkpa ma kwuo na e zigala ndị uweojii na mpaghara ahụ.

  10. Etu ndị ojiegbe si wakpoo ndị nchekwa omeiwu Ginger Onwusibe n’Abia Steeti

    Ginger Onwusibe bụ omeiwu na-anọchiteanya Isiala Ngwa North na South n’ụlọomeiwu nta

    Ebe foto si, Ginger Onwusibe/Facebook

    Otu onye uweojii na-echekwa Ginger Onwusibe bụ omeiwu na-anọchiteanya Isiala Ngwa North na South n’ụlọomeiwu nta anwụọla dịka ndị uweojii wakporo ha.

    Mkpamkpa ahụ mere na mpaghara Ubakala dị n’Umuahia nke Abia Steeti n’ụbọchị Sọnde 17 Nọvemba, 2024 n’ihe dịka elekere itoolu nke abalị.

    Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe a ji ụgbọala ha dochiere ụgbọala ndị nchekwa Onwusibe bu ma malite ịgba ha egbe.

    Dịka nke a na-eme a gbagburu otu onye uweojii ma merụọ onye ọzọ ahụ mana omeiwu Onwusibe anọghị n’ụgbọala ahụ n’onwe ya.

    Ndị ojiegbe a gbara ọsọ tupu ndị uweojii ngalaba Ubakala na-erute n’ebe ihe a mere.

    BBC Igbo kpọtụụrụ omeiwu Onwusibe ịmata okwu ọnụ maka ihe a mere mana ọ zaghị.

    Dịka akwụkwọ ozi Maureen Chinaka bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia steeti weputara si kwuo ‘ọ bụ ka ndị uweojii ahụ dupuchara onye omeiwu Ginger Onwusibe ka ndị omekome ahụ wakporo ha”.

    “N’oge ahụ ka a gbagburu onye uweojii bụ Bala Mohammed, ebe Dunna Jatau na ọkwọụgbọala ha gbara ọsọ”.

    Maureen kwuru na “ndị uweoji ezigala ndị ga-awuchi ndị kpara mkpamkpa ahụ ma rịọ ka ohanaeze gaa n'ihu n'ọrụ ha dị iche iche ma kwe nkwa na ndị uweojii steeti ahụ dị njikere inweta ezi nchekwa nye ọbụla”.

    N’aka nke ọzọ Gọvanọ Alex Otti nke Abia steeti akatọọla ọtụtụ mwakpo ndị ojiegbe na-eme n’ebe dị iche iche na steeti ahụ.

    N’ozi ụlọọrụ wepụtara n’ụbọchị Mọnde, Otti kwuru na nke ahụ bụ aka ọrụ ndị na-ama ọchịchị ya aka na-achọghị maka ọdịmma Abia.

    Ọ gara n’ihu dọo aka na ntị na aka ga-akpara ndị a e ji akwara ngwa ọrụ nakwa ndị ndọrọ ndọro ọchịchị ọbụla na-akwado ha.

  11. A kpụpụla nwoke na-agbasa ozi na redio n'ụlọikpe maka imetọ mmadụ asatọ

    Alan Jones

    Ebe foto si, Getty Images

    A kpụpụla otu nwoke bụ Alan Jones dị afọ 83 n’ụlọikpe maka imetọ mmadụ asaa na nwanwoke dị afọ ịrị na asatọ na mba Australia.

    Alan Jones bubu onye na-agbasa ozi na redio ma burukwa onye nkuzi egwuregwu 'rugby' n'obodo Wallabies n'oge gara aga.

    Ndị oweojii nke ngalaba na-ahụ maka mmetọ ụmụaka nke mpaghara New South Wales gara n’ụlọ ya, ebe ha nọ nwụchie ya.

    Alan Jones bụ otu mgbasa ozi na redio a ma ama na mba Australia.

    Jones kwuru na aka ya dị ọcha gbasara ebubo niile ahụ e boro ya.

    A na-akpụpụ Jones n'ụlọikpe maka ebubo ruru iri abụọ na anọ bụ ihe e kwuru na o mere site n’afọ 2001 ruo n’afọ 2019.

    Ndị uweojii kwuru na ndị ahụ Alan Jones metoro bụ ndị ọ ma nke ọma, ebe e enwere onye o nyere ọrụ n’ime ndị ahụ.

    Karen Webb bụ kọmịshịọna ndị uweojii kwuru na ha emeela ezigbo nyocha maka ya.

    O kwuru na “enweghi nsogbu ma ọ bụ okwu a ga-asị na o teela aka ime nyocha gbasara ya”.

    “I kwuputa nsogbu gị anyị ga-ege gị ntị”.

    Mana ụlọikpe enyela Alan Jones mgbapụta ebe ikpe ya ga-ebido n’ọnwa Disemba abalị iri na asatọ.

    Jones arụọla ọrụ dịka onye na-edere ndị ọchịchị a ma ama okwu ha. Ọ dereela onye dịka Praịm Mịnịsta Malcom Fraser okwu ya na ndị ọzọ dị iche iche.

  12. A ga-amalite ikesa ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox na Naịjirịa taa

    Ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox

    Ebe foto si, Reuters

    A ga-amalite ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox na steeti asaa dị na Naịjirịa, nke ga-ama Naịjirịa mba nke atọ n’ụwa nakwa nke mbụ na West Afrịka ga-anata ọgwụ mgbochi a.

    Nke a bụ mbụ Naịjirịa ga-amalite ike ụdịrị nkwụcha a megide ọrịa Mpox na-efesasị ugbua.

    Mịnịstrị ahụike kwuru na ndị a ga-ebuzọ nye ọgwụ mgbochi a bụ ndị ọrụ ahụike, nakwa ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ ihe izendụ ọrịa Mpox.

    N’ọnwa Ọgọstụ, ngalaba ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) kpọpụtara ọrịa Mpox dịka ọrịa zuru ụwa ọnụ.

    Njirimaara ọrịa Mpox

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka nyere Naịjirịa ọnụ ọgwụ 10,000 nke a kpọro Jynneos (MVA).

    Kamgbe afọ a, mmadụ 118 si na steeti 28 n’ime steeti 36 gụnyere Abuja ebutela ọrịa Mpox na Naịjirịa dịka ngalaba WHO si kwuo.

    Ụlọọrụ na-ebuagha megide ọrịa na Naịjirịa kwuru na kamgbe 27 nke ọnwa Ọktoba, na mmadụ ruru 1,442 ebutela ọrịa a n’ime steeti 36 nakwa Abuja.

    Mba iri abụọ n’Afrịka ekwupụtala na ọrịa Mpox abatala n’obodo ha n’afọ a, Angola bụ mba mbụ kwupụtara ya.

  13. Amerịka ekwetala ka Ukraine jiri nnukwu ogbunigwe a kpọrọ ATACMS buso Rọshịa agha

    Joe Biden na Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Kemgbe ọnwa asatọ ka ndị Ukraine na-arịọ mba Amerika ka ha nye ha ikike ijiri nnukwu ogbunigwe ha a kpọrọ “Army Tactical Missile System (ATACMS) wakpoo mba Rọssịa.

    ATACMS bụ otu n’ime ngwaagha mba Ukraine na-arịọ ka mba Amerịka na ndị nkwado ya nye ha, bụ nke ga-enyere ha aka ibuso mba Rọssịa agha.

    Ogbunigwe ahụ nwere ikike iru n'ime mba Rọssịa.

    N'aka nke ọzọ, mba Amerika na-ahụ ndịagha Nọth Korea bụ ndị so Rọshịa na-ebuso Ukraine agha na mpaghara Kursk dịka ihe ịmaaka.

    Nke a so n'ihe mere mba Amerika jiri kwere ka ndị Ukraine jiri ngwaagha ATACMS.

    Ndị ọlụ gbatagbata maka ọkụ n'Ukraine.

    Ebe foto si, State Emergency Service of Ukraine

    Cheta na n’ọnwa Juun ka Nọth Korea na Rọshịa binyereaka na nkwekọrịta maka agha bụ nke pụtara na oge ọbụla otu n’ime ha na-alụ agha, onye nke ọzọ ga-enye aka.

    N’ekwentị ka Chancellor ndị German bụ Olaf Scholz gwara Vladimir Putin nke Rọshịa na ịhapụ ndị Nọth Korea isonye na-ebuso ndị Ukraine agha bụ nnukwu ịmaaka.

    Mana Onyeisiala mba Ukraine Zelensky kwuru na “taata na e nwere ọtụtụ ihe ndị ntaakụkọ na-ede maka ngwa agha Amerịka nyere ha Mana anaghị eji ọnụ atụ ogbunigwe, a naghị agwa ọhanaeze gbasara udiri ihe ahụ. Ngwaagha ogbunigwe ga-eme ihe e jiri mara ya”.

    Putin na ndịagha

    Ebe foto si, Reuters

    Ka ihe ndị a niile na-eme, n'abalị gara aga ka mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe na mpaghara Sumy bụ nke gburu mmadụ 11 ma meruo mmadụ 63 ahụ.

    Ndị ọchịchị na Sumy kwuru na ogbunigwe Rọshịa dara n’ụlọ ndị nkịtị, ebe ndị agha Ukraine kwuru na ha gbaturu ‘drone’ ruru asatọ ndị Rọssịa tụrụ n'oge ahụ.

  14. Onyeisiala Bola Tinubu awụchiela mba Brazil maka ọgbakọ G20

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/X

    Onyeisiala Bola Tinubu awụchiela n’obodo Rio de Janeiro nke mba Brazil isonye n’ọgbakọ ndịisi mbaụwa a kpọrọ ‘Heads of State and Government Summit of the Group of 20 (G20)’ nke ugboro 19.

    Tinubu wuchiri n’ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde ebe mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba ndị ọzọ na Brazil bụ Breno Costa nabatara ya.

    N’ọgbakọ ahụ, a na-atụ anya na onyeisiala Buhari ga-enwe mkparịtaụka dị iche iche n’akụkụ maka mwulite ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.

    Ọgbakọ a bụ nke Onyeisiala mba Brazil bụ Lula da Silva kpokọbara ga-ebiril ọkụ n’ụbọchị 18 na 19 nke ọnwa Nọvemba 2024.

    Ọgbakọ a nke a kpọrọ ‘Nwulite ụwa kwụụ ọtọ na nke dị mma obibi’ ga-elekwasị anya n’ụzọ dị iche iche a ga-esi ewulite obodo – akụnaụba, mmekọrịta nakwa ebe obibi – nakwa mwogharị ọchịchị na mbaụwa.

    Ọ ga-elebakwa anya na nsogbu banyere okpomọkụ na mbaụwa nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ihe ọzọ Onyeisiala Brazil ga-akpọ mkpa bụ ọnọdụ agha dị n’etiti mba Isreal na otu Hamas, tinyere ọgbatauhie dị n’azụmaahịa mba Amerịka na China.

    Mba iri na itoolu ga-eso n’ọgbakọ ahụ nke gụnyere; Argentina, Australia, Brazil, Canada, China, Germany, France, India and Indonesia.

    Others are: Italy, Japan, South Korea, Mexico, mba Russian, Saudi Arabia, South Africa, Türkiye, Briten nakwa Amerịka.

  15. Unu abọọla chi?

    Nnọọ! n'ọgbakọ BBC Igbo ebe anyị na-ewetere gị akụkọ bụ eziokwu n'akụkụ mbaụwa niile.

    Biko buru oche gị n'ọnyere anyị n'izuụka ọhụrụ dịka anyị na-ekpe ekpere na izu a ga-amara gị mma.

  16. Izrel egbuola onyeisi mgbasaozi Hezbollah

    Mohamad Afif

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mohamad Afif

    Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na ogbunigwe Izrel tụrụ na Beirut egbuola Mohamad Afif onye bụ onyeisi mgbasaozi otu Hezbollah.

    Mwakpo ahụ mere n’isi ụlọọrụ ndị na-akwado pati Syrịa na Ras al-Naba.

    Cheta na Mọnde gara aga, a hụrụ Mohamad Afif mpkarịtaụka ndị ndị ntaakụkọ na Beirut ebe otu nwere ọnọdụ.

    N’aka nke ọzọ, ndịagha Izrel wakpokwara ndịagha Lebanọnma gbuo otu onye agha ma meruo ndịagha atọ ọzọ ahụ.

    Izrel kwuru na Lebanọn atụọla ha ọtụtụ ogbunigwe n’ime awa ole na ole gara aga mana ha bibiri ọtụtụ n’ime ha.

  17. Ndi uweojii Saụt Afrịka ekwuola na ha ga-awuchi ndị na-egwuputa ọlaedo n’ogige dị na Stilfontein

    Ogige ahụ a na-egwuputa ọlaedo dị na Stilfontein

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ogige ahụ a na-egwuputa ọlaedo dị na Stilfontein

    Ndị uweojii Saụt Afrịka ekwuola na ha ga-awuchi ndị na-egwuputa ihe n'ụzọ iwu na-akwadoghị (illegal miners) n’ogige a na-egwuputa ọlaedo n;oge gara aga ebe akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ zoro.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe dị na Pretoria nyere iwu ka a ghara imechi ogige a na-egwuputa ọlaedo dị na Stilfontein na ndịda ọdịda anyanwụ Johannesburg.

    Ndị ọrụ gbatagbata nọ ebe ahụ ihe ruru ọtụ ụbọchị ebe ndị uweojii na-egbochi ihe oriri na mmiri ibanye ebe ahụ.

    Ndị ahụ na-egwuputa ihe nọ n’okpuru ala ihe ruru otu ọnwa ajụla isi ebe ahụ pụọ maka egwu na e nwereike iwuchi ha.

    Ụfọdụ ndị mba Saụt Afrịka akatọọla aka ike gọmeti ji eso ndị ahụ.

    Maapụ na-egosi ebe ogige ahụ dị
    Nkọwa foto, Maapụ na-egosi ebe ogige ahụ dị
  18. Russia atụọla nnukwu ogbunigwe n’ụlọọrụ na-emepụta ọkụ n’Ukraine

    Nye ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Ebe foto si, STATE EMERGENCY SERVICE OF UKRAINE

    Nkọwa foto, Nye ọrụ na-agbanyụ ọkụ

    Rọshịa awakpola ogige na-emepụta ọkụ na mba Ukraine dịka ọgụ dị n’etiti mba abụọ a na-aga n’ihu.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky tụrụ ogbunigwe ruru 120 na ngwa agha dronu dị 90 na mpaghara dị iche iche n’Ukraine.

    Ụlọọrụ kachasị emepụta ọkụ n’Ukraine kwuru na mwakpo ahụ mebiri akụrụngwa ọrụ ha. Nke a mere ka e nwee ọchịchịrị na mpaghara Kyiv, Dnipropetrovsk, Donetsk na Lviv.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ nwụrụ site na mwakpo ahụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ.

    Ndị ogbunigwe ahụ metụtara

    Ebe foto si, STATE EMERGENCY SERVICE OF UKRAINE

    Nkọwa foto, Ndị ogbunigwe ahụ metụtara

    Praịm Minista Ukraine bụ Maria Mezentseva kwuru na Roshịa wakporo ụlọọrụ na-emepụta ọkụ ahụ maka na ọ bụ oge oyi eruwala.

    Maria Mezentseva bụ onyeisi otu mba Ukraine ga-aga ọgbakọ Council of Europe's Parliamentary Assembly, kọwara na nke a bụ atụmatụ ha mara nke ọma, ma kwuo na ha na-atụ anya inweta enyemaka site na mba niile ha na ha dị na mma dịka UK na Amerịka.

    Praịm Minista Ukraine Maria Mezentseva
    Nkọwa foto, Praịm Minista Ukraine Maria Mezentseva
  19. Onyeisiala Tinubu echiela Praịm Mịnịsta India bụ Narendra Modi echichi GCON

    Modi na Tinubu

    Ebe foto si, G20

    Onyeisiala Bola Tinubu echiela Praịm Mịnịsta mba India bụ Narendra Modi echichi Grand Commander of the Order of Niger (GCON)

    Tinubu kwupụtara nke a n’oge ya na Modi na-enwe mkparịtaụka pụrụiche n’obiọchịchị gọọmentị dị n’Abuja n’ụbọchị Sọnde 17 Nọvemba 2024.

    O kwuru na nke a bụ iji gosi kelee ya ma gosi mmasị Naịjirịa nwere n’inwe mmekọrịta ha na mba India.

    “Taa, Ana m enye Praịm Mịnịsta ọkwa pụrụiche nke Grand Commander of the Order of Niger (GCON). Nke a iji gosi ekele Naịjirịa nakwa mmasị ya n’inwe mmekọrịta na mba India.

    “Ị dọnyere Naịjirịa ukwu n’ọtụtụ ihe n’ime ọtụtụ afọ gara aga.”

    Praịm Mịnịsta Narendra Modi wuchiri na Naịjirịa n’abalị Satọde 16 Nọvemba maka njem nleta pụrụiche.

    Modi zutere Onyeisiala Bola Tinubu n’obiọchịchị gọọmentị bụ ebe Tinubu na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ nabatara ya.

    Mkparịtụka Modi na Tinubu gbakwasịrị ụkwụ na mwulite mmekọrịta n’etiti Naịjirịa na India.

    Bola Tinubu na Narendra Modi

    Ebe foto si, NTA/X

    Njem a Modi bịara ga-abụ nke mbụ Praịm Mịnịsta mba India ga-abịa na Naịjirịa kamgbe afọ 2007 mgbe Manmohan Singh ji ọkwa ahụ bịara.

    Modi ga-abụ Praịm Mịnịsta mba India nke ugboro anọ ga-abịa na Naịjirịa.

    Ọ bụ onyeisiala Tinubu kpọrọ Modi oku ka ọ bịa njem nleta a dịka Tinubu gachara India ma zute Modi n’ọgbkọ G20 n’afọ 2023.

    Mkparịtaụka ha nwere n’oge ahụ maka mwulite azụmaahịa n’etiti mba abụọ a nakwa ihe ndị ọzọ.

    Naịjirịa na India nwere ezi mmekọrịta n’azụmaahịa mbupu nakwa mbubata ngwaahịa. India so na mba Naịjirịa kachasị bupu ngwaahịa n’agba anọ nke afọ 2023.

    E nwere ọtụtụ ụlọọrụ mba India nọ na Naịjirịa ugbua dịka ha tinyere ego karịrị ijeri dọla iri abụọ na asaa ($27bn) na ngalaba dị iche iche na Naịjirịa.

    Mgbe a nabatara Modi n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja

    Ebe foto si, NTA/X

  20. Chidimma Adetshina gbara onye abụọ n’emume ‘Miss Universe 2024'

    Chidimma Adetshina nọchitereanya Naịjirịa n'emume 'Miss Universe 2024'

    Ebe foto si, Getty

    Na-agbanyeghi nsogbu cheere onye ji ọkwa ‘Miss Nigeria’ bụ nwada Chidimma Adetshina n’ihu, o tuuru ugo dịka onye abụọ n’emume ‘Miss Universe’ nke afọ 2024.

    Emume a nke e mere na mba Mexica n’ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba 2024, ga-abụ nke ugboro iri asaa na atọ ya (73rd).

    Chidimma ji ihu ọma, ọchị, obi ọcha na ugwu ya mee nke ọma iji tozuoke n’agba nke ikpeazụ mere o jiri gbaa onye abụọ.

    Mana ọ bụ nwada nọchitereanya mba Denmark (Miss Denmark) gbara onye nke mbụ n’emume ahụ site n’imeri mmadụ 129 ndị ọzọ.

    Chidimma bụ naanị nwafọ mba Afrịka so na mmadụ iri na abụọ kachasị mee ọfụma n’emume Miss Universe 2024.

    Victoria Kjaer na-anọchiteanya mba Denmark gbara onye mbụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Mmadụ ise kachasị mee ọfụma n’emume a gụnyere;

    Victoria Kjaer – Denmark (onye mbụ)

    Chidimma Adetshina – Nigeria (Onye abụọ)

    Maria Fernanda – Mexico (Onye atọ)

    Suchata Chuangsri – Thailand (Onye anọ)

    Ileana Marquez – Venezuela (Onye ise)

    Cheta na Chidimma wezugara onwe ya n’emume ‘Miss South Africa’ maka nsogbu cheere ya n’ihu n’emume ahụ maka a sị na o nwere agbụrụ na Naịjirịa.

    O mechara tinye akwụkwọ isonye n’emume Miss Nigeria bụ nke o mechara merie ma nọchiteanya Naịjirịa na mbaụwa.