Akụnaụba Naịjirịa amụbawanyela - Ụlọọrụ NBS

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/Getty Images
Ụlọọrụ National Bureau of Statistics (NBS), ekwuola na akụnaụba Naịjirịa mụbawanyere ihe ruru pasenti 3.46 na nkeji atọ nke afọ 2024.
Ha kwuru na mmụbawanye a kachasị mmụbawanye mere na nkeji mbụ na nkeji abụọ afọ 2024.
N’agbanyeghị mmụbawanye pasenti 3.19 na nkeji abụọ afọ 2024, na pasenti 2.98 na nkeji nke mbụ afọ 2024, akụnaụba Naịjirịa erubeghị ogogo Onyeisiala Bola Tinubu kwere nkwa na ọ ga-eru.
Mmụbawanye a ka NBS kwuru na ọ bụ ngalaba ọrụ mere ka ọ dị ire. Ha kwuru na nglaba ahụ hụrụ mmụbawanye ruru pasenti 5.19 nke pụtara pasenti 53.58 na mgbakọ akụnaụba Naịjirịa ebe ngalaba ọrụ ugbo hụrụ mmụbawanye ruru 1.14 pasenti.
NBS kwuru na ngalaba mmanụ nwetara mmụbanwanye 3.37 pasenti nke ji pasenti 0.62 karịa mmụbawanye a hụrụ na nkeji atọ afọ 2023.



















