Ukraine ịbanye NATO agwụla ihe ga-akwụsị agha dị n’etiti anyị na Russia - Zelensky

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Akụnaụba Naịjirịa amụbawanyela - Ụlọọrụ NBS

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na ego Naịjirịa

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na ego Naịjirịa

    Ụlọọrụ National Bureau of Statistics (NBS), ekwuola na akụnaụba Naịjirịa mụbawanyere ihe ruru pasenti 3.46 na nkeji atọ nke afọ 2024.

    Ha kwuru na mmụbawanye a kachasị mmụbawanye mere na nkeji mbụ na nkeji abụọ afọ 2024.

    N’agbanyeghị mmụbawanye pasenti 3.19 na nkeji abụọ afọ 2024, na pasenti 2.98 na nkeji nke mbụ afọ 2024, akụnaụba Naịjirịa erubeghị ogogo Onyeisiala Bola Tinubu kwere nkwa na ọ ga-eru.

    Mmụbawanye a ka NBS kwuru na ọ bụ ngalaba ọrụ mere ka ọ dị ire. Ha kwuru na nglaba ahụ hụrụ mmụbawanye ruru pasenti 5.19 nke pụtara pasenti 53.58 na mgbakọ akụnaụba Naịjirịa ebe ngalaba ọrụ ugbo hụrụ mmụbawanye ruru 1.14 pasenti.

    NBS kwuru na ngalaba mmanụ nwetara mmụbanwanye 3.37 pasenti nke ji pasenti 0.62 karịa mmụbawanye a hụrụ na nkeji atọ afọ 2023.

  2. Anyị na-achọ ụgbọala 500 steeti anyị achọ - Gọọmenti Edo Steeti

    Monday Okpebholo na Godwin Obaseki

    Ebe foto si, Monday Okpebholo/Godwin Obaseki/ X

    Nkọwa foto, Monday Okpebholo na Godwin Obaseki

    Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Edo steeti bụ Fred Itua ekwuola na ụgbọala 500 steeti ahụ na-efu efu.

    Fred Itua kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ nchọpụta otu kọmiti Gọvanọ Monday Okpebholo hibere maka inweghachita ụgbọala niile na ihe ndị ọzọ bụ nke steeti ahụ site n’aka aka chịbụru steeti ahụ bu Godwin Obaseki.

    Cheta kọmitii ahụ nke Kelly Okungbowa nọ n’isi kwuru na mbụ na ọ bụ ụgbọala 200 ka ha kwuru na ọ na-efu efu mana nchọpụta ha mere ka o doo anya na ụgbọala 500 nke gọọmenti steeti ka a na-achọ achọ.

    Fred Itua gara n’ihu kwuo na kọmitii ahụ chọpụtara na ụfọdụ ụgbọala ndị ahụ bụ ndị rụrụ ọrụ n’ọchịchị Godwin Obaseki bu ha.

  3. Bịshọp T. D. Jakes na-enwete onwe ya ugbua – Ụlọụka Potter’s House

    Onyeisi ụlọụka Potter's House bụ T.D. Jakes

    Ebe foto si, T.D. Jakes

    Ụlọụka ukwu dị na mba Amerịka bụ Potter’s House nke Bịshọp T.D. Jakes nwee ekwuola na onye ụkọchukwu ahụ na-enwete onwe ya ugbua o nwechara nsogbu ahụike.

    Bịshọp T.D Jakes rịara ọrịa ahụ dịka ọ na-agbasa ozi ọma n’ụlọụka ya n’ụbọchị Sọnde 24 Nọvemba 2024.

    N’okwu ya “Ka echiche nke obi m bụrụ ihe ị nabatara, Onyenwem,” O nwere nsogbu iku ume dịka ọ na-agbasa ozi ahụ.

    “Ike m na onye nzọpụta m, ka ha gaa n’udo,” Bishọp Jakes kwuru, dịka o hudatara isi ala ma wetuo igwe okwu ya.

    Dịka nke a na-eme ụfọdụ ndị ọrụ ụlọụka ahụ gbara ya okirikiri n’elu ebe nchụaja ụlọụka ahụ dịka otu onye n’ime ha kpọro oku sị ka e kpeere ya ekpere.

    Ozi sị n'ụlọụka Potter's House

    Ebe foto si, Potter's House/X

    Mana n’ozi ụlọụka ahụ wepụtara, ha kọwara ihe a mere dịka ‘obere ihe’.

    “N’oge ofufe nro nke taa, Bishọp T.D Jakes nwere obere nsogbu mgbe ọ na-agbasa ozi n’ụlọụka ma natakwa nlekọta ahụike na-egbughi oge,” ka ụlọụka Potter’s House na Facebook ha.

    “Bishọp T.D Jakes enwetela onwe ya ugbua dịka ọ na-anata ọgwụgwọ n’aka ndị ọkachamaara. Ezinaụlọ Potter’s House niile nwere obi iju afọ maka nkwado na ngosi ịhụnanya. Unu emeela maka nghọta nakwa ekpere unu.”

    Mana ụlọụka akọwaala n’uju ihe butere nsogbu ahụike ahụ maọbụ na Bishọp nọ n’ụlọọgwụ.

    Cheta na Bishọp T.D Jakes na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche n’oge gara ebe ọ kọwaara maka agbụrụ ya dịka onye Igbo nke Naịjirịa.

  4. Ihe mberede ụgbọelu egbuola otu onye na mba Lithuania

    Ebe ụgbọelu kpọkasịrị na Lithuania

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe karịrị otu onye anwụọla ebe mmadụ atọ merụrụ ahụ mgbe ụgbọelu na-ebu ngwaahịa kpọkasịrị n’akụkụ ọdọụgbọelu Vilnius na mba Lithuania n’isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde.

    Ụgbọelu a bụ Boeing 737 nke ụlọọrụ DHL nke ngalaba Spen nwee kpọkasịrị n’akụkụ ụlọ dịka ọ na-achọ ifetu n’ala, dịka ndị ọrụ si kwuo.

    A zopụtala mmadụ iri na abụọ nọ n’ụlọ dị n’akụkụ ebe ụgbọelu a kpọkasịrị ka ndị uweojii si kwuo.

    Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na a hụla mmadụ niile nọ n’ụgbọelu ahụ si Leipzig mba Germany.

    Ụgbọelu ahụ hapụrụ ụlọọrụ DHL dị n’ọdọụgbọelu Leipzig n’elekere abụọ nke ụtụtụ ma kpọkasịa dịka otu awa na ụma gachara dịka ozi si n’aka ụlọọrụ Flightradar24 n’akara X.

    A hụrụ ka ndị ọrụ mgbanyụọkụ na-emenyụ ọkụ si n’otu ụlọ ji kilomita 1.3 dị anya n’okporoụzọ ụgbọelu, ka ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters si kwuo.

    A mabeghi ihe mere ụgbọelu ahụ jiri kpọkasịa dịka ndị ọrụ mba Lithuana amalitela ime nnyocha.

    Ụlọọrụ DHL kwuru na ọ bụ ha nwee ụgbọelu ahụ kwuo na ọ dara ‘n’otu ntabi anya’.

    Ndị ọrụ kwuru na ha e jighi ihe akaebe ọbụla gosiri na e nwere mgbawa tupu mkpọkasị ụgbọelu ahụ.

    Onyeisi ndị ọrụ mgbanyụọkụ na Lithuania bụ Renatas Pozela kwuru na ụgbọelu ahụ na-akwado ifetu n’ọdọụgbọelu Vilnius tupu ọ kpọkasịa n’akụkụ ya.

    Otu onye n’ime mmadụ anọ nọ n’ụgbọelu ahụ nwụerụ anwụ.

    Akụkọ kwuru na ụgbọelu ahụ anọọla afọ iri atọ na otu.

  5. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ!

    Daalụ nụ maka ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Tọọ ntị n'ala gere akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  6. Dangote ebutuola ọnụahịa mmanụ ụgbọala ha na-emepụta

    Ụlọọrụ Dangote

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụlọọrụ Dangote

    Ụlọọrụ Dangote ekwuola na ha ga ebutu ọnụahịa mmanụ ụgbọala nye ndị na-azụ ha ahịa.

    Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Dangote bụ Anthony Chiejina wepụtara ụbọchị Sọnde 24 Nọvemba, 2024, kwuru na ha ebtuola ọnụahịa mmanụ ụgbọala ka ọ bụrụzie 970 maka otu lita.

    Chiejina kwuru na nke a bụ iji kelee ndị Naịjirịa na gọọmenti Naịjirịa maka nkwado ha na-enye ụlọọrụ ha kemgbe ha malitere ọrụ.

    O kwuru na ha ga-agba mbụ iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala ha na-ere nke o kọwara dịka ọka na-abịa na mmanụ ụgbọala ndị ọzọ.

  7. Gọvanọ Edo steeti ehibela kọmitii ga-enyocha ọchịchị Godwin Obaseki

    Gọvanọ Monday Okpebholo na-achị Edo steeti

    Ebe foto si, Monday Okpebholo/X

    Nkọwa foto, Gọvanọ Monday Okpebholo na-achị Edo steeti

    Gọvanọ Edo Steeti Monday Okpebholo ekwuola na ọ ga-ehibe otu kọmitii ga-eme eme nnyocha ọchịchị Gọvanọ pụrụ apụ bụ Godwin Obaseki.

    Odeakwụkwọ Gọvanọ Okpebholo bụ Fred Itua kwuru na a ga-ehibe kọmitii ahụ nke mmadụ 14 nọ n’ime ya nke onyeisi ya bụ Ernest Afolabi Umakhile, ụbọchị Tuzde Nọvemba 26 n’obi ọchịchị steeti ahụ dị na Benin, isi obodo Edo steeti.

    Itua kwuru na ihe mere e ji hibe kọmitii ahụ bụ maka na ọchịchị Obaseki egosighị etu na ihe ha ji Ego gọọmenti Edo steeti mee oge ọ nọ n’ọchịchị.

    O kwuru na atụmatụ ahụ Gọvanọ Okpebholo wepụtara bụ iji mezue nkwa inweta ọchịchị kwụrụ ọtọ oge ọ na-achụ nta vootu ma nweta mmepe na agamnihu Edo steeti.

    Ndị ọzọ nọ na kọmitii gụnyere Kassim Afegbua, Patrick Ikhariale, Taiwo Akerele, Patrick Idiake, and Rasaq Bello-Osagie. Additional members are Fredrick Unopah, Abdallah Eugenia, Patrick Obahiagbon, Kenny Okojie, Lyndsey Tes-Sorae na Abass Braimoh.

    Cheta na Gọvanọ Okpebholo nọrọ oge e duru ya n’iyi ọrụ kwuo na gọọmenti ga-enyocha mwepụ e wepụrụ ndị omeiwu 14 n’ụlọomeiwu steeti ahụ kemgbe afọ 2019.

  8. Onyeisiala Bola Tinubu esila mba Brazil lọghachite na Naịjirịa

    Onyeisiala Tinubu ka o si n'ọgbakọ G20 nke afọ 2024 na mba Brazi lọta

    Ebe foto si, Bola Tinubu/X

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu esila mba Brazil bụ ebe ọ gara ọgbakọ ndị ndu mbaụwa a kpọrọ G20 lọghachite na Naịjirịa.

    Ọ wụchiri n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n’Abuja n’abalị Satọde ebe ndị ọrụ gọọmentị ọkwa ha dị elu nabatara ya.

    Tinubu gara ọgbakọ ahụ bụ ebe ọ nọ kwadoo atụmatụ ibuagha megide agụụ na ụbịam n’ụwa a kpọrọ ‘global alliance against hunger and poverty’.

    N’akụkụ ọgbakọ ahụ, Onyeisiala Tinubu na Kristalina Georgieva, bụ onyeisi ụlọọrụ ‘International Monetary Fund (IMF) nwere mkparịtaụka pụrụiche ebe o toro Tinubu banyere atụmatụ nwogharị akụnaụba Naịjirịa.

    Tinubu gwara onyeisi IMF sị “Anyị nwere ọtụtụ ụmụaka na-anaghị agụ akwụkwọ ugbua, anyị maara na ọ bụ site n’agụmaakwụkwọ ka e nwereike isi pụọ n’ụbịam na agụụ. Ya mere anyị jiri hiwee ụfọdụ atụmatụ iji hụụ na ụmụaka ndị a gara akwụkwọ, anyị chọrọ enyemaka gị maka ụmụaka ndị a chọrọ ịgụ akwụkwọ.”

    Ụfọdụ ndị ọchịchị na ndị mịnịsta so Onyeisiala Tinubu mee njem ahụ na mba Brazil maka ọgbakọ G20.

    Mba ndị so n’ọgbakọ G20 dị iri na itoolu, nke gụnyere Argentina, Australia, Canada, China, France, Germany, India, Indonesia, Italy, Japan, Mexico, Korea Republic, Russia, Saudi Arabia, South Africa, Türkiye, the UK, the US, nakwa otu European Union.

  9. Igbo mma mma nụ oo!

    Anyị ji ohere a anata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị ụka.

    Dịka ị na-aga ụka, ị nọ n'ụlọ maọbụ n'amala, biko tọọ ntị n'ala gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Daalụ!

  10. Ndị uweojii anwụchiela dibia na otu onye maka ntọ n'Anambra

    Ndị uweojii anwụchiela dibia na otu onye maka ntọ n'Anambra

    Ebe foto si, Anambra state Police

    Ndị uweojii Anambra steeti anwụchiela mmadụ abụọ gụnyere otu dibia bụ ndị a na-enyocha maka ịtọ mmadụ.

    N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ha n’Anambra bụ Tochukwu Ikenga weputara, ọ sị na ọ bụ site n’akaebe nke onye a tọọrọ n’akụkụ ụlọakwụkwọ Abagana Girls n’ụbọchị Fraịde ka ha ji nwe ike ịme nke a.

    “Ndị ụweojii na ndị nche obodo jikọrọ aka nyocha ma chọpụta ogige ndị ntọ ahụ ma nwụchie mmadụ abụo ebe ha nọ” ka ozi ahụ kwuru.

    Ihe ndị ha achọtara n’ebe ahụ gụnyere otu egbe, ụgbọala onye a tọọrọ, ụdọ, ụtalị na ihe ndị ọzọ kwa.

    Ndị ahụ a nwụchiri gụnyere Maduabuchukwu, Ikechukwu Okafor dị afọ 30, Nweze Chijindu dị afọ 38 bụ ndị si obodo Abagana n’otu aka ahụ a na-achọ Supuluchukwu Nweze nakwa Sunday Nwakanze dị afọ maka aka ha ịdị na ntọ ahụ.

    “Nnyocha mbụ anyị mere gosiri na eji oku ekwentị raabata onye ahụ tọrọ n’ime ọhịa ma zuo ya ohi ma jirikwa ụdọ kechie ya debe n’akụkụ ihu alụsị” ka ozi ahụm kwuru.

    Mmadụ abụọ ndị a nwụchiri ekwuputala na ha mere ihe ahụ n’ezie ma na-enyere ndị uweojii aka na nyocha ha ka na-eme ugbua.

  11. Anyị ga-eji ngwaọrụ ọgbara ọhụrụ gboo nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi – Onyeisiala Tinubu

    Anyị ga-eji ngwa ọrụ ọgbara ọhụrụ gboo nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi – Onyeisiala Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/X

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na gọọmenti ya na-agba mbọ ịchọta ụzọ a ga-esi gboo nsogbu dị n’etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi.

    Oge ya na ndị si n’ụlọọrụ JBS dị na Rio de Janeiro nke mba Brazịl na-ebinye aka n’akwụkwọ, Tinubu kwuru na nsogbu dị n’etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ebutela mbibi ngwongwo na akụnaụba n’ụfọdụ mpaghara Afrịka.

    Dịka o siri kwuo, “nsogbu dị n’etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ebutela nkwafu ọbara na ọnwụ ụmụ mmadụ, ọ bụrụ ma a ga-eji usoro ọgbara ọhụrụ gboo ya, ọ ga-eweta mmepe nke akụnaụba anyị.”

    Oge ha bịnyechara aka n’akwụkwọ, ụlọọrụ JBS Meat Processing Company kwere nkwa itinye nde dọla abụọ na ụma ise ($2.5m) iji rụnye ụlọọrụ isii gburugburu Naịjirịa.

    Ha kwuru na ụlọọrụ atọ n’ime ha ga-ahụ maka anụ ọkụkọ, abụọ ga-ahụ maka anụ anụmanụ ndị ọzọ ebe otu ga-ahụ maka anụ ezi.

  12. Onyeisiala Tinubu agwala ụlọomeiwu Sineti ka ha kwado Ọchịagha Oluyede dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa

    Onyeisiala Bola Tinubu na Ọchịagha Olufemi Olatubosun Oluyede

    Ebe foto si, NIGERIAN ARMY/X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na Ọchịagha Olufemi Olatubosun Oluyede

    Onyeisiala Bola Tinubu agwala ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa ka ha kwado Ọchịagha Olufemi Olatubosun Oluyede dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuru na Onyeisiala Bola Tinubu degaara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ozi ma dịka iwu siri kwuo.

    Cheta na ụbọchị 30 Ọktoba, Onyeisiala Tinubu họpụtara Ọchịagha Oluyede dịka onye ga-anọ dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa oge Ọchịagha Taoreed Lagbaja gara ụlọọgwụ inweta nleta tupu ọ nwụọ ụbọchị Tuzde 5 Nọvemba, 2024.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na ya nwere ntụkwasiobi na Ọchịagha Olufemi Olatubosun Oluyede ga-arụ ọrụ iji nweta udo na nchekwa obodo.

  13. Joe Biden akatọọla ICC maka nnwuchi Netanyahu

    Joe Biden na Benjamin Netanyahu

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden akatọọla iwu ahụ ụlọikpe mba ụwa bụ International Criminal Court (ICC) nyere sị ka a nwuchie Praịm Mịnịsta mba Israel bụ Benjamin Netanyahu maka mpụ agha.

    ICC nyere iwu ahụ sị na Benjamin Netanyahu na mmadụ atọ ndị ọzọ dara iwu e ji anụ agha oge Israel na Hamas na-anụ agha.

    Iwu ahụ ICC nyere pụtara na ebe ọbụla Benjamin Netanyahu gara n’ime mba ụwa ọnụ ọgụgụ ha dị 124 na a ga-ejide ya ma kpee ya ikpe igbu ọchụ n'oge agha.

    N’okwu onyeisiala mba Amerika, Joe Biden “Ihe ọbụla ọ sọrọ ICC kwuo, Izrel na Hamas adịghị nhatanha. Anyị ga-akwado Izrel ma megide ndị ọbụla chọrọ ịmegide Izrel.

    Mana iwu ahụ na-ebute nnukwu nkewa n’etiti mba dị ichceiche ọkachasị mba dị na Yurop nakwa mba Amerika.

    Ka Amerika na-akatọ ICC, mba Britain, Italy, France, Netherland kwuru na ha na-akwado ICC n’okwu gbasara nwụchị ya bụ Netanyahu.

    Na aka nke ọzọ, Praịm Mịnịsta ndị Czech kwuru na “ICC mere alụ” site n’ijiri onyeisiala banyere n’ọkwa site na ntuliaka nwere na-ama atụ onyeisi otu na-enyi oha egwu.

  14. Ụlọ omeiwu ajụla atụmatụ iwu chọrọ ka ọchịchị onyeisiala bụrụ afọ isii

    Ụlọ omeiwu ajụla atụmatụ iwu chọrọ ka ọchịchị onyeisiala bụrụ afọ isii

    Ebe foto si, House of Representatives/Facebook

    Ụlọ omeiwu nta ajụla ịnabata atụmatụ iwu na-achọ ka oge ọchịchị onyeisiala Naịjirịa bụrụ naanị afọ isii.

    Atụmatụ iwu mmegharị ahụ Ikenga Ugochinyere kwadoro bụ nke ụlọ omeiwu jụrụ n’ụbọchị Tọzde 21 Nọvemba 2024 oge ndị omeiwu rụrịtachara ụka gbasara ya.

    Atụmatụ iwu ahụ chọkwara ka a na-ebugharị ọkwa onyeisiala n’etiti mgbago ugwu na ndịda tinyere iwepụta ohere maka osote onyeisiala nke abụọ.

    Ihe ọzọ dị n’atụmatụ iwu ahụ bụ ka a na-ahazi ntuliaka niile n’ime otu mkpụrụ ụbọchị.

  15. Jude Nnam enwerela onwe ya n’aka ndị ntọrị

    Jude Nnam enwerela onwe ya n’aka ndị ntọrị

    Ebe foto si, Jude Nnam/Facebook

    Ndị ojiegbe atọhapụla onye ọbụabụ Katọlik a ma ama bụ Jude Nnam, onye a na-etu ‘The Ancestor’.

    O ji aka ya depụta nke a n’akara ọbaozi Facebook ya n’ụbọchị Wenezde 20 Nọvemba 2024.

    “Mkpu mmeri adaala! Nna ochie anyị hụrụ n’anya bụ Dr (Sir) Jude Nnam alọghachila ịga n’ihu n’ọrụ onye nwe anyị,” ka o depụtara.

    Cheta na anyị weteere gị akụkọ gbasara etu ndị ojiegbe si tọrọ Jude Nnam n’Anambra steeti n’ụbọchị Satọde 16 Nọvemba 2024.

  16. ICC enyela iwu ka a nwuchie Netanyahu na mmadụ abụọ ndị ọzọ

    Netanyahu na ndị ọzọ

    Ebe foto si, EPA / Reuters / Supplied

    Nkọwa foto, Netanyahu na ndị ọzọ

    Ụlọikpe mbaụwa bụ ‘International Criminal Court (ICC) enyela iwu ka a nwuchie Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu nakwa onyeisi ndịagha Izrel bụ Yoav Gallant.

    Onye ọzọ ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka a nwuchie bụ onyeisi ndịagha Hamas bụ Mohammed Deif, mana ndịagha Izrel na-ekwu na ha egbuola ya mgbe ha tụrụ ogbunigwe na Gaza n’onwa Julaị.

    Ndị Ọkaikpe nyere iwu ahụ kwuru na e nwere ihe nrụtụaka na mmadụ atọ ndị ahụ “dara iwu e ji alụ agha” n'oge Izrel na Hamas na-alụ agha.

    Mana ndị Izrel na Hamas ekwuola na aka ha abụọ dị ọcha n’ebubo ahụ ụlọikpe boro ha.

    Ka ndị mba Izrel na-akatọ iwu ahụ ụlọikpe mbaụwa nyere ka a nwuchie Netanyahu, ndị Hamas na-enwe obi aṅuri ma na-akọwa iwu ahụ dịka ihe a ga-echeta n’ọdịnihu.

    Ugbua, mba niile so na ICC ruru otu narị na iri abụọ na anọ (124) nweziri ohere ịtụle mara ma ha a ga-awuchi Netanyahu dịka ụlọikpe ahụ si nye iwu.

    Cheta na mba Amerịka na Izrel esoghị na mba ndị so na ICC.

    N’ọnwa Mee afọ a ka Ọkaiwu ICC bụ Karim Khan gbara akwụkwọ ma chọọ ka emebe iwu ga-eme ka e jide Netanyahu, Gallant, Deif na ndị isi Hamas nke e mechara gbuo bụ ndị gụnyere Ismail Haniyeh na Yahya Sinwar.

  17. E tighachila Prof. Ikechebelu dịka onyeisi mahadum UNIZIK

    E tighachila Prof. Ikechebelu dịka onyeisi mahadum UNIZIK

    Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University/Facebook

    Onyeisiala Bola Tinubu enyela ntụziaka ka etighachị Ọkankụzi Joseph I. Ikechebelu dịka onyeisi mahadum Nnamdi Azikiwe University Awka dị n'Anambra steeti.

    Nke a dị n’ozi onye na-arụgodu ọrụ ka onyeisi ngalaba mgbasaozi na mahadum UNIZIK bụ Njelita Louis wepụtara n’ụbọchị Tọzde 21 Nọvemba 2024.

    Ozi ahụ kwuru na okwu ọbụla ga-achọ nkwado otu nlekọta mahadum ga-aga n’aka Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ ruo mgbe onyeisiala ga-ehiwe otu ọhụrụ.

    N’otu aka ahụ, Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ nyekwara nkwado ka e tighachi Maazị Victor Ikechukwu Modebelu dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Registrar.

    Cheta na Ọkankụzi Joseph Ikechebelu bụ onye oge ọrụ ya kụụrụ ọnụ dịka onyeisi mahadum UNIZIK tupu e tinye Ọkankụzi Bernard Ifeanyi Odoh.

    Ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 20 Nọvemba 2024 ka Onyeisiala Bola Tinubu nyere nkwado ka a chụọ otu na-elekọta mahadum Nnamdi Azikiwe University Awka, Anambra steeti.

    Ọ gakwara n’ihu nye nkwado ka e wezuga Ọkankụzi Bernard Ifeanyi Odoh dịka onyeisi mahadum ahụ nke ọhụrụ tinyere Rosemary Ifeoma Nwokike dịka Registrar.

    E tighachila Prof. Ikechebelu dịka onyeisi mahadum UNIZIK

    Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University/Facebook

  18. John Prescott bubu osote Praịm mịnịsta mba UK anwụọla

    John Prescott

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, John Prescott

    John Prescott bubu osote Praịm mịnịsta mba UK dị afọ iri asatọ na isii (86) anwụọla.

    John Prescott rụrụ ọrụ dịka osote praịm mịnịsta nke Tony Blair ruo afọ iri .

    N’akwụkwọ ịmaọkwa ọnwụ ya nke ezinaụlọ ya bipụtara ka nwunye ya na ụmụ ya abụọ kwuru na ọ arịala ọrịa tupuu ọ nwụọ.

    Ha kwuru na Prescott bi n’ụlọ ebe Alzheimer na eleta ya anya tupuu ọ nwụọ.

    Ndị nọ oge ọ nwụrụ gunyere ezịnaụlọ ya na onye na-eti egwu a maama bụ Marian Montgomery.

    Cheta na Prescott nwere ọrịa mkpọnwụ n’afọ 2019.

    Prescott dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nochitere ndị mpaghara obodo ya n’ụlọomeiwu ihe ruru afọ iri anọ.

  19. Onyeisiala Tinubu achụọla otu na-elekọta Unizik, tinyere VC na Registrar

    Onyeisiala Tinubu achụọla otu na-elekọta Unizik, tinyere VC na Registrar

    Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University Awka/Website

    Onyeisiala Bola Tinubu enyela nkwado ka a chụọ otu na-elekọta mahadum Nnamdi Azikiwe University Awka, Anambra steeti.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara n’ụbọchị Wenezde 20 Nọvemba 2024.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, onyeisiala nyekwara nkwado ka e wezuga Ọkankuzi Bernard Ifeanyi Odoh dịka onyeisi mahadum ahụ nke ọhụrụ tinyere Rosemary Ifeoma Nwokike dịka registrar.

    Otu ahụ na-elekọta ya bụ mahadum nwere Ambassador Greg Ozumba Mbadiwe dịka onyeisi ya tinyere mmadụ anọ ndị ọzọ gụnyere Hafiz Oladejo, Augustine Onyedebelu, Engr. Amioleran Osahon na Rtd. Gen. Funsho Oyeneyin.

    Ozi ahụ Bayo Onanuga wepụtara kwuru na ihe mere e ji chụọ otu ahụ bụ n’ihi mkpesa e nwetara na ha họpụtara onye etozughị oke dịka onyeisi mahadum ahụ na-agbasoghị usoro kwesịrị ekwesị.

  20. Ndị omekome awakpoola ọdọ nche ndị uweojii n'Ohafia Abia steeti

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, AFP

    Opekatampe otu onye uweojii anwụọla n'aka ndị ojiegbe n'obodo Ugwu Abba Asaga Ohafia dị n'okpuruọchịchị Ohafia dị n'Abia steeti.

    Otu onye uweojii ọzọ merụrụ ahụ na mwakpo ahụ mere n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde.

    Ndị uweojii ahụ nọ n'ebe ha na-eche nche mgbe e mere ha mwakpo ahụ.

    Anya hụrụ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ya bụ ihe mere n'ezie mana rue ugbua ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka azabeghi ozi ekwentị e zigaara ya.

    Kepu kepu sikwe ebe ahụ apụta na-ekwu na ndị bi na mpaghara ahụ agbaala ọsọ maka ezigbo ụjọ ji ha.

    Cheta na nke a ga-eme ya mwakpo nke abụọ ga-eme na steeti ahụ n'ime otu izuụka dịka ndị ojiegbe wakporo ahịrị ụgbọala Ginger Onwusibe ma gbuo otu onye uweojii na-eche ya nche.

    Ndị uweojii ọzọ na ọkwọụgbọala so ya gbara ọsọ ndụ ha na ya bụ mwakpo.

    Aka na-achị Abia steeti bụ Alex Otti eforola ntutu taa na ọ ga-ememila ndị omekome na-egbu, na-atọ, ma na-ezu ohi na steeti ya ọ kachasị n'ihu ekeresimesi a.