Ihe mere ụwa ji eri uju maka ọnwụ otiegwu Quincy Jones
Otiegwu mba Amerịka a ma ama bụ Quincy Jones anwụọla. Ọ gbara afọ iri itoolu na otu (91).
Ozi si n’aka onye mgbasaozi ya bụ Arnold Robinson kwuru na Quincy Jones nwụrụ n’ụra n’ụlọ ya dị na Bel Air ụbọchị Sọnde 3 Nọvemba, 2024.
Ndị ha na Quincy Jones rụrụ ọrụ ma tikọọ egwu gụnyere Michael Jackson, Frank Sinatra na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ọ bụ Quincy Jones haziri albụm egwu Michael Jackson a kpọrọ Thriller.
Jones ritere ihe nrita Grammy 28 ma bụrụ onye ụlọ mgbasaozi Times Magazine họpụtara dịka otiegwu jazz kachasị.
N’afọ 1985, Jones kpọrọ ndị otiegwu 46 na-ewu ewu n’Amerịka nke gụnyere Michael Jackson, Bruce Springsteen, Tina Turner na Cyndi Lauper maka egwu ‘We are the World’.
Jones so wee dee egwu ahụ iji nweta ego maka ndị agụụ n’afịfị ọnụ na mba Itiopịa.
Quincy Jones nụrụ nwaanyị ugboro atọ ma mụta ụmụaka asaa. Ezinaụlọ ya kọwara ya dịka onye a na-enweghị atụ.