You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ukraine ịbanye NATO agwụla ihe ga-akwụsị agha dị n’etiti anyị na Russia - Zelensky

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị ji obiọma anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Daalụ ma nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  2. A tọrọla Jude Nnam n’Anambra steeti

    Ndị ojiegbe atọrọla ọgụegwu ụka Katọlik bụ Jude Nnam n’Anambra steeti.

    Onye nchịkọta ndị ọbụabụ Katọlik na Naịjirịa bụ Leo Ogu kwuputara nke a n’ozi ọ gbasaara ndị otu ya bụ National Catholic Music Council of Nigeria (NACAMCON).

    Dịka anyị siri ghọta, njinji ahụ jiri n’ụbọchị Satọde 16 Nọvemba 2024.

    Cheta na ọ bụ n’izuụka gara aga ka Maazị Jude Nnam mere emume ncheta afọ iri ise na itolu (59) ya.

    Oge anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga, ọ sịrị na ha enwetabeghị ụdị ozi dị etu ahụ n’ụlọọrụ ha.

  3. Agha anyị na Russia ga-akwụsị oge adịghị anya - Zelensky

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ọ bụ ihe doro ya anya na agha dị n’etiti ha na Rọshịa ga-akwụsị oge na-adịghị anya ọ bụrụ ma Donald Trump banye dịka Onyeisiala Amerịka.

    Zelensky sịrị na ya na Trump nwere ezigbo mkparịtaụka n’ekwentị oge o merichara ntuliaka Amerịka.

    Ka o sinadị, o kwughị ma Trump ọ kpọrọ oku ka ha na Rọshịa nwee mkparịtaụka kama ọ sịrị na e nweghị ihe ọbụla Trump kwuru megide ọnọdụ Yukren n’agha ahụ.

    Trump na-ekwu ya oge niile na otu ebumnobi ya gbara ọkpụrụkpụ bụ ịkwụsị agha dị n’etiti mba abụọ ahụ dịka ọ sịrị na enyemaka ndịagha na Yukren na-erikpọ akụnaụba Amerịka.

  4. Onye ji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ Ondo steeti bụ Agboola Ajayi atụọla vootu ya

    Onye ji aha pati Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa Gọvanọ n’Ondo steeti bụ Agboola Ajayi atụọla vootu ya na wọdụ 2 dị na Kiribo, dị n'okpuru ọchịchị Ede-Odo nke steeti ahụ.

    Ajyi gbara afọ 54 bụ onye na-atụ anya na ọ ga-enweta mmeri na ntụliaka ọkwa Gọvanọ Ondo a na-eme ụbọchị Satọde 16 Nọvemba, 2024.

  5. Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa atụọla vootu ya

    Gọvanọ Ondo steeti bụ Lucky Aiyedatiwa nke pati APC ebinyela aka na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ssteeti ahụ a na-eme taa Satọde 16 Nọvemba 2024.

    Gọvanọ Aiyedatiwa binyere aka n’okpuru ọchịchị Illaje.

    Cheta na Aiyedatiwa banyere n’ọkwa Gọvanọ n’ọnwa Disemba afọ 2023 ka onye bụbu Gọvanọ bụ Rotimi Akeredolu nwụrụ.

  6. Gọọmenti amachiela ngagharịiwe na Mozambique

    Gọọmenti Mozambique amachiela ngagharịiwe n’ụdị ọbụla maka mpụtara ntuliaka e mere na mba ahụ.

    Akụkọ mere ka a mata na mmadụ 18 anwụọla kemgbe mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere n’ọnwa gara aga nke pati Frelimo nọ n’ọkwa kemgbe afọ 1975 meriri.

    Ụlọọrụ Human Rights Watch kwuru na ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịwie kwatụụrụ nke butere mmebi ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ.

    Mịnista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo Pascoal Ronda kpọrọ oku ka ndị na-eme ngagharịiwe ahụ sepụ aka na ya maka na ọ bụ ihe iwu mba Mozambique kagburu

    Cheta na ngagharịiwe ahụ malitere na Maputo isi obodo Mozambique ka e kweputara Daniel Chapo nke pati Frelimo dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere n’ọnwa gara aga.

    Daniel Chapo ji vootu dị pasenti 71 merie na ntulaiak ahụ.

  7. Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Ondo Steeti

    Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-aga n’ihu taa bụ 16 Nọvemba, 2024 n’Ondo steeti.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC) kwuru na ha debanyere aha mmadụ ruru 2,053,061 maka ntuliaka ahụ.

    Na ntuliaka a, mmadụ 18 na-azọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ. Aka na-achị Ondo steeti bụ Lucky Aiyedatiwa sokwa na ndị na-azọ ọkwa ahụ.

    Lee aha ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Ondo steeti na aha pati ha.

    ·Lucky Aiyedatiwa - APC

    ·Agboola Ajayi - PDP

    ·Sola Ebiseni - LP

    ·Abbas Mimiko - ZLP

    ·Falaiye Abraham Ajibola - A

    ·Akinuli Fred Omolere - AA

    ·Ajayi Adekunle Oluwaseyi - AAC

    ·Nejo Adeyemi - ADC

    ·Akinnodi Ayodeji Emmanuel - ADP

    ·Populqa Olatunji Tunde - APGA

    ·Ogunfeyimi Isaac Kolawole - APM

    ·Fadoju Amos Babatunde - APP

    ·Olugbemiga Omogbemi Edema - NNPP

    ·Ajaunoko Funmilayo Jenyo - NRM

    ·Alli Babatunde Francis - PRP

    ·Akingboye Benson Bamidele - SDP

    ·Adegoke Kehinde Paul - YP

    ·Akinmurele John Otitoloju - YPP

  8. NJC akwụsịla Ọkaikpe Anambra steeti ọrụ, gwa nke Imo steeti laa ezumike nka

    Otu jikọtara ndị Ọkaikpe Naịjirịa bụ National Judicial Commission (NJC) akwụsitụla Ọkaikpe A.O. Nwabunike nke Ụlọikpe Ukwu Anambra steeti ọrụ tinyekwara Ọkaikpe G.C. Aguma nke Ụlọikpe ukwu Rivas steeti.

    A kwụsịtụrụ ha ọrụ ruo otu afọ dịka ha agaghị anata ụgwọ ọnwa ebe a ga-elebara ha anya nke ọma ruo afọ abụọ.

    Ozi otu NJC wepụtara n’ụbọchị Fraịde 15 Nọvemba 2024 kwuru na ndị otu ahụ nwere ya bụ mkpebi n’ọgbakọ ha nke Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Kudirat Kekere-Ekun nọ n’isi ya.

    Ndị otu ahụ kwukwara ka Ọkaikpe T.E. Chukwuemeka Chikeka nke Ụlọikpe ukwu Imo steeti laa ezumike nka, ya na Kadi Babangida Mahdi bụ Grand Khadi nke Yobe steeti.

    Ha sị na nke a bụ n’ihi na ndị Ọkaikpe abụọ ahụ tụrụ asị gbasara ụbọchị ọmụmụ ha.

  9. Otu Republican abụrụla ndị ọnụọgụgụ ha kachasị n'ụlọomeiwu mba Amerịka

    Otu Republican abụrụla otu ndị na-ekwu ihe na-eme na gọọmentị mba Amerịka dịka ha nwetara ọnụọgụgụ kachasị n'ụlọomeiwu ukwu mba Amerịka.

    Nke a pụtara na Trump ga-enwezi ikike zuru oke ịwebata iwu ndị ọ na-akwado iwebata gbadodo ụkwụ na akụnaụba obodo, mbịara mbịara nakwa ihe ndị ọzọ ma ọ banye ọchịchị.

    Nke a pụtakwara na otu ndị Democrats agaghị enwezi ikike zuruọke ịgbagha iwu ndị ha anabataghị ma mekwaa ka ọ raa otu Republican ahụ ịnweta okwukwe zuruoke na iwu nke ndị ha chọrọ n'ihi enweghi nkweta.

  10. Lee mmadụ 20 Donald Trump họpụtara nye ọlụ na gọọmenti ya

    Onyeisiala a họpụtara ga-achị mba Amerịka, Donald Trump ekwuola ahọpụtala mmadụ iri abụọ na atọ a ọ chọrọ ka enye ọrụ.

    N’ime mma iri abụọ ahụ gunyere Elon Musk, Vivek Ramaswamy, Marco Rubio, Pete Hegseth, Matt Gaetz na ndị ọzọ.

    Mana ndị ha niile Trump họpụtara ga-echere ka Sịneti mee nyocha n’isi ha ma nabata ha tupuu ha enwete ọlụ ahụ.

    Lee ndi ahụ niile ma ọkwa Trump chọrọ inye ha:

  11. Onyeisiala Joe Biden anabatala Donald Trump na White House

    Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden anabatala onyeisiala a họpụtara ọhụrụ bụ Donald Trump n’obi ọchịchị White House.

    Ihe a bụ nke mbụ Donald Trump na-aga na White House kemgbe ọ pụrụ n’ọchịchị afọ anọ gara aga.

    Joe Biden na Donald Trump sere foto, kelee onwe ha ma kwekwa nkwa ime ka nnyefe ọkwa ọchịchị gaa nke ọma.

    Nwunye Trump bụ Melania Trump esoghị di ya gaa njem ahụ mana nwunye Joe Biden bụ Jill Biden nyere Trump leta ka o nyeruo ya, bụ nke o jiri gosipụta nkwadobe ndị otu ya dị inye aka n’oge nnyefe ọchịchị.

  12. Anwụchiela onyeisi otu bọọlụ Saụt Afrịka maka ebubo mpụ

    Otu bọọlụ mba Saụt Afrịka a kpọrọ Safa bụ Danny Jordaan ma tọghapụkwa ya maka ebubo na o zupuru ego otu ahụ ma jiri mee mkpa ya.

    Ngalaba na-enyocha mpụ na mba ahụ na-enyocha ebubo maka mpụ n'ohi gara ihu n'otu bọọlụ ahụ n'etiti afọ 2014 rue afọ 2018 nke ruru rand 1.3($72,000, £57,000).

    A na-ekwu na Jordaan ji ego otu ahụ nwetaara onwe ya ndị nchekwa nke ya nakwa ndị mgbasaozi n'anataghị ikike n'aka ndị isi otu ahụ.

    Jordaan dị afọ 73 so na ndị gbara mgbọ ka eweta asọmpị iko mba ụwa nke afọ 2010 na mba Saụt Afrịka ma bụrụkwa onyeisi Safa kemgbe afọ 2013.

    A nwụchiri n'ụbọchị Wenzde ma kpụpụ ya ụlọikpe Magie nke dị na Johannesburg.

    N'ọnwa Maachị, ngalaba ahụ na-enyocha mpụ gara n'ụlọorụ Safa ma buru ngwa kọmpụta dị icheiche nakwa akwụkwọ ndị ọzọ.

    Otu onye ọrụ Safa gwara BBC na o nweghi okwu banyere ya bụ akụkọ ugbua.

  13. Ndị echeere bu ESN egbuola ndị agha Naịjirịa abụọ n'Umahia taa

    Ndị echeere bụ ndị ESN egbuola ndị agha abụọ n'Umahia mgbe ha wakporo ọdọ nyocha ha dị n'ụzọ n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde.

    N'ozi nke onye na-elekọta atụmatụ Udo ka bụ Jonah Unuakhalu binyere aka, ọ kọwara na ha wakporo ọdọ nchekwa ndị agha nke dị n'okporoụzọ Umahia gawa Owerri.

    Ọ kọwara na otu ndị ahụ na ndị agha kwara mgbọ nke mere ka ha gbahapụ ụgbọala abụọ ha ji bịa ọgụ ma rie mbọmbọ ọsọ.

    Unuakhalu jikwa ohere ahụ gwa ndị Abia steeti nakwa ndị ọwụwa anyanwụ niile ha bịa kpesara ha ma o nwee onye ma ihe ọbụla maka ndị ahụ gbara ọsọ nakwa etu a ga-esi chọta ha.

  14. A chụọla ụmụakwụkwọ 13 tiri nwata ibe ha ihe n'ụlọakwụkwọ FGC dị n'Enugwu

    Gọọmentị etiti achụọla ụmụakwụkwọ 13 ahụ nke ụlọakwụkwọ Federal Government College dị n’Enugwu maka ebubo iti nwata akwụkwọ ibe ha ihe.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru mịnịstrị agụmaakwụkwọ bụ Folashade Boriowo wepụtara n’ụbọchị Wenezde 13 Nọvemba 2024.

    Mịnịsta na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Tunji Alausa nyere iwu ka a chụọ ụmụakwụkwọ ndị a maka ihe onyonyo fesara na soshal midia nke gosiri ebe ụmụakwụkwọ ahụ gbakọtara aka ma were ụtalị na-apịa nwata ibe ha.

    Alausa gara n’ihu kwusie ike na mịnịstrị ha dị njikere ihụ na e nwere ọnọdụ dị mma maka agụmaakwụkwọ nye onye ọbụla.

    Mịnịstrị agụmaakwụkwo natara mkpesa banyere etu ụmụakwọ 13 nọ na klaasị SS3 si tie nwata akwụkwọ nọ na klassị SS1.

    Ha malitere ime nyocha ma nye ụmụakwụkwọ ndị a ntaramahụhụ ịkwụsị akwụkwọ ruo ọnwa isii ruo mgbe a ga-emecha nyocha.

    Cheta na gọomentị Enugwu steeti adịla mbụ katọọ ihe a mere ma kpọọ oku ke e mee nyocha ma chọpụta ụmụakwụkwọ kpara arụ a.

    BBCIgbo gakwara n’ụlọakwụkwọ a dị n’Enugwu ịchọpụta ihe mere kpọmkwem mana o nweghi onye nkuzi ọbụla kwere ekwu okwu.

    Ha kwuru na ọ dịghị ha n’aka ikwu okwu banyere nke a maka na ụlọakwụkwọ ahụ bụ nke gọọmentị eiti.

  15. Oke mpụ na nrụrụaka jupụtara na ngalaba ọkụ latrik – EFCC

    Ola Olukoyede, onyeisi ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC n’ịchafụ etiela mkpu maka etu mpụ si arị ibe ya elu na ngalaba ọkụ latrik.

    Olukoyede kwuru nke a mgbe kọmitii na-ahụ maka ibuagha megide mpụ nke ụlọomeiwu nta kpọtụụrụ ya n’isiụlọọrụ ha dị n’Abuja na Tuzde.

    O kwuru, “Dịka m na-agwa gị ugbua, ọkụ latrik na-enye nnukwu nsogbu. Ị hụụ ụfọdụ nyocha anyị na-eme na ngalaba ọkụ latrik, ị ga-ebe akwa.

    “E nyere ndị mmadụ ọrụ ịzụta akụrụngwa okụ latrik, kama ha ga-eji akụrụngwa dị mma ha e weere akụrụngwa adịgboroja.

    “Ya, mere mgbe ọbụla ị hụrụ na ọkụ ahụ nyụrụ, maara na ọ bụ nsogbu ahụ butere ya.

    Onyeisi ụlọorụ EFCC gara n’ihu kwuo na ha ga-agba mbọ i na-egbochi mpụ karịa ị na-achọ etu a ga-esi napụta ego ndị e zutere na mpụ.

  16. Gọọmentị etiti, steeti na nke okpuruọchịchị etinyela aka n'akwụkwọ nkwụrụ n'onwe

    Komittee na-ahụ maka usoro gọọmenti okpuruochichi ga-esi kwụrụ n'onwe ha ma rụọ ọrụ emechaala nyocha e zinyere ha ma binye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta bụ nke a ga-ezigara Onyeisiala Naịjirịa, Bola Ahmed Tinubu.

    Onyeisi kọmitti ahụ bụ Hakeem Ambali mere ka a mata nke a n'oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    N’okwu ya “anyị enweela nzụkọ ma binyeaka n’akwụkwọ nkwekọrịta bụ nke anyị ga-ezigara onyeisiala na ngwucha ọnwa Nọvemba afọ a”.

    “Anyị na-eleanya na gọọmenti okpuruochichi ga na-enweta ego ha site n'aka 'Federal Account Allocation Committee (FAAC). Ana m agwa gị na onyeisiala dị njikere ịnabata akwụkwọ nkwekọrịta anyị binyere aka na ya”.

    Cheta na Gọọmenti etiti kpụpụrụ ndị gọvanọ ụlọikpe bụ nke machiri steeti ịnara ego ndị gọọmenti okpuruochichi ma kwụsị ha ịchụpụ ndị ọchịchị na gọọmenti okpuruochichi maọbụ itinye ndị ha chọrọ n’ụzọ na-abụghị ntuliaka.

    N’ikpe ndị ọkaikpe mmadụ asaa kpere n’ụlọikpe ukwu nke Garba Lawal bụ onye isi ha, kpebiri na ndị gọvanọ enweghị ikike ịnara ego ndị gọọmenti okpuruochichi.

  17. Gọọmenti Enugwu enyela iwu ka anwụchie ụmụakwụkwọ tiri ibe ha ihe na Federal Government College Enugwu

    Ihe onyonyo na-agba anyammiri fesara na soshal midịa egosila ka ụmụakwụkwọ Federal Government College Enugu si gbakọọ aka ọnụ tie nwataakwụkwọ ibe ha ihe tinka tiri pan ma merụọ ya nnukwu ahụ.

    Na ngwụcha izuụka gara aga ka ya bụ ihe onyonyo pụtara. O gosiri ebe ụmụakwụkwọ nke sekọndiri ndị nwoke karịrị iri n’ọnụọgụ siri gbaa otu nwa nwoke okiri kiri, tụọ ya n’ala ma were koboko na beltụ ha apịa ya ihe.

    Nkea mere ka Gọọmenti Enugwu bata n’okwu ahụ.

    Kọmishọna agụmakwụkwọ bụ Ọkammụta Ndubueze Mbah kwuru na ihe ahụ mere wutere gọọmenti nke ukwuu ma nye iwu ka anwụchie ụmụakwụkwọ ahụ ma chọpụta ọnọdụ onye nke e tiri ihe.

    Mbah kwuru na ọ bụ nnukwu ihe nwute na nwata nne na nna ya zigara ụlọakwụkwọ zutere ụdịrị mmegbu ahụ n’aka ụmụakwụkwọ ibe ya.

    BBC Igbo gara njem nchọpụta na ya bụ ulọakwụkwọ Federal Government College dị na Independence Layout Enugwu wee hụ na ụmụakwụkwọ na-agụrụ onwe ha akwụkwọ.

    Anyị chọpụtara na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ gara njem n'Abụja, nke pụtara na ọ nọghị n’oche ya.

    Osote ya na-ahụ maka ụmụakwụkwọ kwuru na ya agaghị ekwu ihe ọbụla gbasara ihe ahụ mere n’ụlọakwụkwụ ha.

    Ọ kọwara na dịka iwu guzobere “Unity Schools” si dị, na ọ bụ odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị agụmaakwụkwọ dị n'Abụja ga-ekwu okwu banyere ya.

    Ọtụtụ ndị nkụzi anyị gbara ajụjọ ọnụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha kọwara na ọ bụ eziokwu ma kwuo na aka akparala ndi niile tinyere aka n’iti nwata ahụ ihe.

  18. Akpọchiela mmadụ abụọ a ma ama na Tiktok maka ịkpagharị ezinaụlọ onyeisiala

    Akpọchiela ụmụafọ Yuganda abụọ maka ịkpagharị onyeisiala mba ahụ bụ Yoweri Museveni, nwunye onyeisiala bụ Janet Museveni na ọkpara ha bụ Gen Muhoozi Kainerugaba n’ọbaozi Tiktok.

    Ọkaikpe majie bụ Stella Maris Amabilis kpọchiri David Ssengozi gbara afọ iri abụọ na otu (21) a maara dịka Lucky Choice na Isaiah Ssekagiri gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) n’ụlọmkpọrọ Kigo ruo n’ụbọchị Wenezde oge ha ga-apụ n’ụlọikpe.

    A na-ebo ha ebubo ikwu okwu mkpọrọmaasị na ifesa akụkọ ụgha megide ezinaụlọ onyeisiala Yuganda nakwa ndị otiegwu ha na otu National Resistance Movement (NRM) nwere njikọ.

    Oge ha pụtara n’ụlọikpe n’ụbọchị Mọnde, mmadụ abụọ ahụ gọrọ aka na ụkwụ ha n’ebubo ahụ.

  19. Edo steeti enweela gọvanọ ọhụrụ

    E duola Monday Okpebholo n’iyi ọrụ dịka aka na-achị Edo steeti ọhụrụ.

    Ọ bụ Daniel Okongbowa hụrụ maka idu n’iyi ọrụ ahụ.

    E dukwara Hon. Daniel Idahosa dịka osote aka na-achị Edo steeti.

    Cheta na Monday Okpebholo nke pati APC meriri Asue Ighodalo nke pati PDP na Olumide Akpata nke Labour Party na ntụliaka aka na-achị steeti a haziri n’ụbọchị Satọde 21 Septemba 2024.

    Akụkọ kwuru na aka na-achị Edo steeti na-apụ apụ bụ Godwin Obaseki nke pati PDP agaghị emume idu n’iyi ọrụ ahụ.

  20. Onyeisiala Tinubu akpọọla oku ka a kwụsị mwakpo Isreal na-eme na Gaza

    Onyeisiala Bola Tinbubu akpọọla oku ka a kwụsị mwakpo Isreal na-eme n’obodo Gaza ma kwuo na ọgụ dị n’etiti Isreal na Palestina nke butere oke ahụhụ anọteela aka.

    O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n’ọgbakọ Arab-Islamic Summit, e mere na mba Saudi Arabia iji leba anya na nsogbu dị na mpaghara Middle East, Tinubu gosiri mwute maka ọnọdụ ọjọọ ndị mmadụ na Gaza.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche ya na mgbasaozi bụ Bayo Ononuga kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde.

    O kwuru na ọgbakọ otu ụbọchị ahụ bụ nke na-esote ọgbakọ ‘Riyadh’ Summit’ e mere n’afọ gara aga bụ nke ndịisi ọchịchị mba so n’otu Organization of Islamic Cooperation (OIC) na mba ndị Arab haziri.

    Tinubu kpọrọ oku ka mba abụọ na-alụ ọgụ mịnye mma ha n’ọbọ ma kpọọ oku ka e nwee ọchịchị mba abụọ ebe ndị Isreal na Palestine ga-ebikọ ọnụ na nchekwa nakwa nkwanye ugwu.

    O kelere Eze Salman nke Saudi Arabia nakwa Ọkparaeze Mohammed bin Salman maka ikpokọta ọgbakọ ahụ ma kwuo na ọ bụ ohere dị mma iji wulite mmekọrịta mba na ibe ha maka udo. Okwere nkwa na Naịjirịa ga-agba mbọ ịkwado udo na ọdịmma mpaghara Middle East.