Agbaala ụfọdụ
ndị ọgwụ mgbochi ọrịa Mpox n’Abuja dịka nkesa ọgwụ malitere na Naịjirịa n’ụbọchị
Mọnde 18 Nọvemba 2024.
Ndị e bidoro
ịgba ọgwụ a gụnyere ndị ọrụ ahụike, ndị ahụ ha anaghi enweike igbochi ọrịa ịbata
nakwa ndị ha ndị buterela ọrịa a nwere mmekọ.
Ngalaba ahụike
‘Nationala Primary Healthcare Development Agency (NPHCDA) na-ahụ maka ịgba ọgwụ
mgbochi a kwuru na a ga-amalite ịgba ndị nọ na mpaghara ndịda Naịjirịa bụ ebe a
kachasị nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a n’izuụka ole na-abịa abịa.
Steetị ndị
a gụnyere Bayelsa, Rivers, Cross River, Akwa Ibom, Enugwu na Benue.
Dọkịta
Hafsat Abdullazeez, bụ onye nchịkọta n’ụlọọrụ ‘Virology’ dị n’Abuja kwuru “Ọnụ ọgwụ
mgbochi anyị nwere ugbua ebughi ibu, ya mere anyị ga-elekwasị anya ịgba ndị
kachasị mkpa ọgwụ a.”
N’ọnwa Ọgọọst, Naịjirịa nwetere ọnụọgwụ 10,000 site n’aka mba Amerịka. Site n’ogbugbu oge e gburu n’ịmalite ịgba ọgwụ a, Naịjirịa abụrụla mba Afrịka nke atọ nakwa nke mpụ na mpaghara West Afrịka malitere ịgba ọgwụ a.
Ha na-esote mba Rwanda na DR Congo n’azụ.
Otu onye ọrụ ahụike a gbara ọgwụ a kwupụtara ihe mere o jiri kweta ịgba ya. “Ana m enye onye ọrụ ahụike ọbụla ndụmọdụ ka ọ bịa gbaa ọgwụ a maka na i nwereike ibute ọrịa a site na mmekọ gị na ọtụtụ ndị mmadụ.”
Kamgbe afọ a, mmadụ 118 si na steeti 28 n’ime steeti 36 gụnyere Abuja ebutela ọrịa Mpox na Naịjirịa dịka ngalaba WHO si kwuo.
Ụlọọrụ na-ebuagha megide ọrịa na Naịjirịa kwuru na kamgbe 27 nke ọnwa Ọktoba, na mmadụ ruru 1,442 ebutela ọrịa a n’ime steeti 36 nakwa Abuja.
Mba iri abụọ n’Afrịka ekwupụtala na ọrịa Mpox abatala n’obodo ha n’afọ a, Angola bụ mba mbụ kwupụtara ya.