Dịka ụbọchị
ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti na-akpụdobe nso, ndị na-azọ ọkwa na
ntuliaka ahụ gụnyere Gọvanọ Charles Soludo nke pati APGA, Nicholas Ukachukwu
nke pati APC na ndị ọzọ nọrọ n'ụbọchị Mọnde 3 Nọvemba 2025, binye aka n'akwụkwọ
nkwekọrịta udo na ntuliaka ahụ.
Mmemme ahụ
nke e mere n'ogige International Convention Center, Awka isi obodo Anambra
Steeti, bụ otu National Peace Committee nke Bishọpụ Hassan Kukah nọ n'isi, bụ
nke a chikọbara iji hụ na ndị na-azọ ọkwa ahụ na pati dị iche iche rubere isi
nye iwu nakwa usoro e ji eme ntuliaka ahụ.
Bishọpụ
Kukah kwuru na nkwekọrịta udo a bụ nke ga-kwalite ọchịchị onyekwuouche ya ma kpọkuo
ụlọọrụ INEC ka hazie ntuliaka ahụ dịka iwu si kwuo.
Gọvanọ Charles Soludo ji ohere ahụ kwuo na ọ dị mkpa ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mara na ha niile bụ ụmụnne ma ghara ime ihe ga-eweta ọgbaaghara na ntuliaka.
Gọvanọ Soludo kwuru na o nwere ntụkwasị obi na ụlọọrụ INEC ga-ahazi ntuliaka dịka iwu sịrị kwuo.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun kwuru na ndị ọrụ ya kwụrụ chịm ịhụ ma weta ezi nchekwa na udo na ntuliaka ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-arụkọ ọrụ iji hụ na ntuliaka ahụ gara nke ọma.